Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na December na January: Nnyefe pụrụ iche nke ùkwù akwụkwọ nwere akwụkwọ abụọ maka ₦40 na nke nwere akwụkwọ anọ maka ₦80 bụ́ ndị a ga-eme ọda ha site n’alaka dị ka a kọwapụtara n’akwụkwọ ozi anyị nke March 23, 1998. February: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla meworo ochie karị e nwere nke nwere peji dị 192. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla ọzọ nwere peji dị 192 n’ụtụ a na-enyefe ya. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Anyị na-anata ọda ugbu a maka kaseti vidio ọhụrụ (PAL) e ji Asụsụ Ogbi nke America mee nke a kpọrọ Sing Praises to Jehovah, Mpịakọta nke 1. Ọgbakọ ndị chọrọ nke a pụrụ iji Literature Order Form (S-14) tụọ ọda ya. Otú ọ dị, biko rịba ama na nke a bụ ihe a na-etinyere ọda pụrụ iche. Ọnụ ego ya bụ ₦800 maka ndị nkwusa na ₦640 maka ndị ọsụ ụzọ.
-