Nzukọ Ije Ozi Maka December
Izu Na-amalite December 7
Abụ nke 186
10 min: Ima ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Anyị Aghaghị Ịga Ugboro Ugboro.” Ajụjụ na aziza. Kwuo okwu dị nkenke banyere Ezikiel 3:17-19, na-eme ka ibu ọrụ anyị nke ịnọgide na-ezi ozi ịdọ aka ná ntị pụta ìhè.
20 min: “‘Egbochila’ Ha Ịma.” Nwanna nwoke esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru kwurịta isiokwu. Mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi chee akwụkwọ a ga-enyefe na December n’ihu mmadụ.
Abụ nke 192 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 14
Abụ nke 206
10 min: Ima ọkwa ọgbakọ. Tụọ aro ụzọ a pụrụ isi jiri akọ zaghachi ekele oge ememe ezumike ndị ụwa. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu ma ọ bụ Onye-Ozizi Uku, gosi ụzọ a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ụzọ dị irè n’ozi n’oge ememe ezumike Krismas. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche ndị e mere maka ozi ubi na December 25 na January 1.
15 min: “Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onye Nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.” Okwu nke onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-ekwu. Ọ kọwaa ọrụ ya na ụzọ ndị nile na-ege ntị pụrụ isi nye aka mee ka ọmụmụ ihe ahụ kpoo ọkụ, nwee ihe mmụta ma na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ.—Lee Ozi Anyị, peji nke 67.
20 min: “Ha Pụrụ Ịhụ na Anyị Dị Iche.” Ajụjụ na azịza. Tụlee ná mkpirikpi njimara nke ọ bụla mere anyị ndị dị iche. Kọwapụta ụzọ a pụrụ isi jiri ihe ọmụma a duzie ndị nwere mmasị bịa ná nzukọ nakwa n’igosi ha otú eziokwu ahụ si eme ka ndị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya nwee àgwà ndị Kraịst.
Abụ nke 146 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 21
Abụ nke 163
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-agbanwe oge nzukọ n’afọ ọhụrụ, nye agbamume obiọma na-agwa mmadụ nile ka ha nọgide na-abịachi nzukọ anya n’oge ọhụrụ nke ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha gwa ndị ha na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị maka mgbanwe ọ bụla e mere. Gbaa ndị nkwusa nile ume idebe Ozi Alaeze Anyị nke ha, karịsịa ihe ntinye ha. Ma eleghị anya anyị ga na-ezo aka na ha n’ọdịnihu.
10 min: Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit.”
25 min: “A Chọkwuru—Ọmụmụ Bible.” Okwu na ntụle a ga-eso ndị na-ege ntị nwee nke onye nlekọta ije ozi ga-eduzi. Tụlee ọrụ iduzi ọmụmụ Bible n’ọgbakọ unu. Jaa ọgbakọ mma n’ebe ha mere nke ọma. Kọwapụta ihe ọzọ a pụrụ ime n’ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible, gụnyere ọmụmụ ihe ezinụlọ. Mee ka paragraf nke 5 doo anya site n’ịgba nne ma ọ bụ nna na-eme nke ọma n’iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ ajụjụ ọnụ. Gụpụta paragraf nke 8, kwusiekwa okwu ike n’isi ihe asatọ ahụ e depụtara. Kọwaa paragraf nke 13 site n’ịkpọ onye nkwusa dị irè n’iduzi ọmụmụ ihe òkù ka ọ kọọ otú o si ekwe ya omume ịtụlezu ihe ọmụmụ n’egbughị oge otú na-adịghị mkpa. Gụnye ahụmahụ a họọrọ nke ọma nke na-egosi otú e siworo rụpụta ihe ndị dị mma n’ọgbakọ unu.
Abụ nke 109 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 28
Abụ nke 178
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka December. Gosi ùkwù akwụkwọ ndị unu nwere a ga-enyefe na January. Gbaa ndị nkwusa ume ka ha nweta ụfọdụ maka ikesa ya ná ngwụsị izu a.
20 min: Mkpa ọgbakọ.
15 min: “Rite Uru Site n’Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke 1999.” Okwu nke onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-ekwu. Mee ka ndị nkwusa ụfọdụ kwuo uru ndị ha riteworo site n’ịgbaso “Usoro Ọgụgụ Bible Ntụkwasị” kwa izu. Gbaa mmadụ nile ume ịdị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị.
Abụ nke 91 na ekpere mmechi.