Nzukọ Ije Ozi Maka March
Izu Na-amalite March 1
Abụ nke 33
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
17 min: “Ncheta Ọnwụ Kraịst n’Ụwa Nile.” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche nke February 1, 1997, peji nke 11-12, paragraf nke 10-14. Kwusie okwu ike n’ụzọ ịhụnanya dị ukwuu nke Jehova si kpalie ya inye anyị ihe mgbapụta.
20 min: Ihe Ndị Dị Mkpa Mere A Ga-eji Sụọ Ụzọ Inyeaka n’April na May. Okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinyekwa ọnụ na ya nke onye nlekọta ije ozi ga-eduzi, na-agba mmadụ nile ume ichebasiri ịsụ ụzọ inyeaka echiche ike. Tụleghachi mgbanwe e mere n’awa a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile na nke ndị inyeaka, dị ka e depụtara ya n’Ozi Alaeze Anyị nke January 1999, peji nke 3. Mgbanwe a kwesịrị ime ka ọtụtụ ndị ọzọ nwee ihe ùgwù nke ozi oge nile. Kọwaa otú ekele anyị nwere maka àjà Kraịst si arụgide anyị ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ime nkwusa nye ndị ọzọ. (2 Kọr. 5:14, 15) N’afọ a Ememe Ncheta dabara n’ụbọchị mbụ nke April. Lee ihe mkpali dị mma ọ bụ nye ndị nkwusa Alaeze nile itinye ọnwa ahụ dum n’ije ozi ka ukwuu! Tụleghachi isi ihe ndị a họtara site n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February 1997 na March 1998 bụ́ ndị na-ekwu banyere ije ozi ọsụ ụzọ inyeaka. Tụlee ụzọ isi jiri usoro ihe omume ihe atụ ndị ahụ e depụtara mee ihe ikwekọ n’ọnọdụ anyị. Tụlee ndokwa ndị e mere maka ozi n’ọgbakọ unu, bụ́ ndị na-enye ohere zuru ezu iji soro ndị ọzọ kere òkè n’ozi. Gbaa ndị nkwusa ume inweta akwụkwọ ndejupụta maka ọsụ ụzọ inyeaka mgbe nzukọ mechiri.
Abụ nke 44 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 8
Abụ nke 52
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Kpọọ Ha Òkù Ka Ha Bịa.” Ajụjụ na azịza. Kwusie okwu ike ná mkpa ọ dị mgbe nile iduzi ndị ọhụrụ nwere mmasị gaa ná nzukọ ọgbakọ. Mee ihe ngosi nke nkwurịta okwu e so onye nwere mmasị nwee, na-eji ihe ọmụma dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, peji nke 159, paragraf nke 20, na peji nke 161-163, paragraf nke 5-8 eme ihe. Gbaa mmadụ nile ume itinye mgbalị pụrụ iche iji nyere ndị a na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị aka ịbịa Ememe Ncheta n’April 1. Gosi otu mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi ma kọwaa otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ dị irè. Mmadụ nile kwesịrị ịmalite ikesa mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ememe Ncheta n’izu a.
15 min: “Ụzọ Ndị Òtù Ezinụlọ Si Emekọ Ihe Ọnụ Iji Kere Òkè Zuru Ezu—Ná Nzukọ Ọgbakọ.” Nkwurịta okwu otu ezinụlọ ga-enwe. Ka ha na-ekwu okwu n’isi ihe ndị dị n’isiokwu ahụ, ha ekwurịta ụzọ ha pụrụ isi kwadebe maka nzukọ dị ka ezinụlọ. Ha ekwurịta ụzọ ndị ha pụrụ isi nyerịtara ibe ha aka ikere òkè na ihe a na-aghaghị ime ka ezinụlọ ha wee na-aga nzukọ n’oge.
Abụ nke 62 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 15
Abụ nke 56
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-eje Ozi Bara Uru.” Okwu ohu na-eje ozi ruru eru ga-ekwu. Tụleghachi isi ihe ndị dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 57-59. Kọwaa ụzọ e si eji ndị ohu na-eje ozi eme ihe n’ọgbakọ unu iji nyere ọgbakọ aka.
20 min: Ịnụ Ụtọ nke 1999 Yearbook. Nkwurịta okwu n’etiti di na nwunye. Di akọwaa na e bipụtara Yearbook n’ụdị akwụkwọ nke mbụ ya na 1927 nakwa na eri afọ 70, ọ gụnyewo akụkọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Ha atụleghachi isi ihe ndị dị na “1998 Grand Totals,” (“Ngụkọta Ihe Nile na 1998”) nke dị na peji nke 31. Mgbe ahụ ha ekwurịta “A Letter From the Governing Body,” (“Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi”) nke dị na peji nke 3-5, kwuokwa okwu n’otú ha ga-esi gbasoo agbamume e nyere.
Abụ nke 68 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 22
Abụ nke 162
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Maa ọkwa aha ndị ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April. Kọwaa na oge agafebeghị itinye akwụkwọ. Kọwapụta ndokwa dum maka nzukọ maka ije ozi ndị e mere atụmatụ ha maka April. Gbaa mmadụ nile ume ịgbaso usoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta e dokwara maka March 27–April 1, dị ka e depụtara n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—1999 nakwa na 1999 Calendar.
15 min: Kwadebe Maka Ememe Ncheta. Okwu. Mmadụ nile kwesịrị ime atụmatụ inyere ndị a na-amụrụ Bible na ndị ọzọ nwere mmasị aka ịbịa Ememe Ncheta. Ndị ọhụrụ ga-abịanụ nwere ike ha agaghị aghọta onye pụrụ iri ihe nnọchianya ndị ahụ ma ọ bụ ịdị mkpa nke ememe a. Tụleghachi ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke April 1, 1996, peji nke 6-8 ma gosi otú anyị pụrụ isi nyere onye ọhụrụ nwere mmasị aka ịghọta ihe ememe ahụ pụtara na nzube e ji eme ya. Mechie site n’ịtụleghachi “Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta” na ịkọwapụta ndokwa e mere n’ọgbakọ unu maka Ememe Ncheta.
20 min: Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? Onye okenye esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru kwurịta abamuru nke broshuọ ahụ. Anyị matara ihe dị n’ime broshuọ a nke ọma karị mgbe anyị mụrụ ya n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ànyị ji ya na-eme ihe n’ozi ubi n’ụzọ dị irè? Ìgwè ahụ ekwurịta ihe ndị na-esonụ: N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji enwe mmasị n’isiokwu a? N’ụzọ dị iche n’ozizi okpukpe ụgha, olileanya dị aṅaa ka broshuọ a na-eme ka ọ pụta ìhè? Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ ndị dị na peji azụ ya kpalie mmasị? Ohere ndị dị aṅaa ka e nwere iji nyefee broshuọ a? Mee otu ihe ngosi nke inyefe ya na-eji akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị na paragraf nke 14 na peji nke 27 eme ihe. Gbaa mmadụ nile ume ịmụrụ anya iji broshuọ a eme ihe nke ọma.
Abụ nke 92 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 29
Abụ nke 111
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka March. Anyị ga-enyefe ụtụ Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa April. Gosi mbipụta magazin ndị ọhụrụ, tụọ aro isiokwu ndị a pụrụ ime ka ha pụta ìhè, kwuokwa isi ihe ụfọdụ kpọmkwem a pụru iji kwuo okwu. Mmadụ nile kwesịrị ịdị na-eji broshuọ Na-achọ ma jiri ya na-amalitere ndị nwere mmasị ọmumụ Bible.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
18 min: Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Meghachi Omume na Ndụmọdụ? Okwu onye okenye ga-ekwu. A pụrụ inye anyị nile ndụmọdụ metụtara omume, àgwà, mkpakọrịta, ma ọ bụ òkè anyị na-ekere n’ihe omume ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe ọchịchọ ịjụ ndụmọdụ ma ọ bụ wee iwe. Ịdị njikere ịnara na itinye ndụmọdụ n’ọrụ pụrụ ịdị oké mkpa nye ahụ ike ime mmụọ anyị. Tụleghachi ihe ndị dị mkpa ndị na-emesi ike ihe ndị mere anyị kwesịrị iji nara ma nwee ekele maka ndumọdụ.—Lee Ụlọ Nche (Bekee) nke April 1, 1987, peji nke 27-30.
Abụ nke 118 na ekpere mmechi.