Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/99 p. 8
  • “Gịnị Ka M Kwesịrị Ime?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Gịnị Ka M Kwesịrị Ime?”
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nne na Nna—Olee Ihe Unu Chọrọ Ka Ụmụ Unu Bụrụ n’Ọdịnihu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?
    Teta!—1998
  • Nweta Ihe Kasị Mma n’Ụlọ Akwụkwọ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 4/99 p. 8

“Gịnị Ka M Kwesịrị Ime?”

1 Dị ka onye ntorobịa nke na-etoru ogo mmadụ, i nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị ka m kwesịrị iji ndụ m mee?’ Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ịgbasawanye ozi ha na-ejere Jehova. Ma olee otú ị pụrụ isi mee nke a mgbe ị na-ewere ibu ọrụ nke onye toruworo ogo mmadụ, nke gụnyere ilekọta mkpa anụ ahụ gị? Ịchọta azịza ya nwere ike ọ gaghị adị mfe.

2 Ụfọdụ ndị ntorobịa na-enwe nchegbu mgbe ha lere anya n’ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ụwa na ihe ndị e kwuru ga-emenụ n’ọdịnihu. Ha na-eche, sị: ‘Èkwesịrị m ịgakwu akwụkwọ? Èkwesịrị m ịbanye ozi oge nile ozugbo?’ Iji mee mkpebi dị mma, mmadụ kwesịrị iji obi eziokwu zaa ajụjụ a, ‘Gịnị bụ isi ihe na-amasị m ná ndụ?’ Ọ ghaghị inyocha ebumnobi ya.

3 Gịnị ka ị zụliteworo dị ka nchegbu gị bụ́ isi n’oge ntorobịa gị? Ì nwere mmasị n’ụzọ bụ́ isi n’ịchọ uru ego, ka ị̀ chọrọ iji ndụ gị mee ihe n’ezie iji mee ka ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu? Akara ugo mmụta mahadum adịghị eme ka e jide n’aka na a ga-enwerịrị ihe ịga nke ọma n’ịchọ ọrụ. Dị ka nhọrọ ọzọ, ọtụtụ ndị enwetawo nkà ndị a na-achọ achọ site n’ịmụ ọrụ, site n’ụfọdụ ụlọ akwụkwọ a na-amụ nkà ma ọ bụ ịkwa nkà, ma ọ bụ usoro ọmụmụ ihe kọleji ndị na-ewe ntakịrị oge na ndị na-efu ntakịrị ihe.

4 Nwee Obi Ike ná Nkwa Jehova: Otu isi ihe dị oké mkpa ịtụle bụ mmesi obi ike sitere n’aka Jehova Chineke na ọ ga-enye ndị na-ebute ọdịmma Alaeze ụzọ ná ndụ ihe na-akpa ha. (Mat. 6:33) Nke a abụghị nkwa na-enweghị isi. Ọtụtụ ụmụnna ndị na-eje Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi nwetara akara ugo mmụta mahadum tupu ha amata eziokwu ahụ. Ma gịnị ka ha ji na-akpata ego? Nanị ole na ole nọ na-arụ ọrụ ha mụrụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọtụtụ nọ na-arụ ọrụ ndozi ihe, na-egbo mkpa ego ha nke ọma ka ha na-asụ ụzọ. Site n’ịgbasawanye ọrụ ha n’ozi ahụ, ha na-enweta ngọzi karịrị nnọọ ihe ọ bụla ego pụrụ ịzụta.

5 N’ikpebi ihe i kwesịrị ime mgbe ị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị, tụlee akụkụ ya nile ma nyochaa ebumnobi gị nke ọma. Iji nwee echiche ziri ezi banyere nhọrọ ndị ị na-eme, tụlee ihe ọmụma ndị pụtara na Teta! nke March 8, 1998, peji nke 26-28. Soro ndị mụrụ gị, ndị okenye, onye nlekọta sekit gị, na ndị ọsụ ụzọ na-enwe ihe ịga nke ọma n’ógbè gị kwurịta okwu. Nke ahụ ga-enyere gị aka ime mkpebi amamihe dị na ya banyere ihe i kwesịrị iji ndụ gị mee.—Ekli. 12:1, 13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya