Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
“Mee ka onye ezi omume mara ihe, ọ ga-atụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.”—ILU 9:9.
1. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka ndị na-ejere ya ozi banyere ihe ọmụma?
JEHOVA bụ “Chineke nke ọmụma ihe.” (1 Samuel 2:3) Ọ na-akụziri ndị na-ejere ya ozi akwụkwọ. Mosis buru amụma na ndị dị iche iche n’oge ahụ ga-ekwu banyere Israel, sị: “Ndị maara ihe na ndị nwere nghọta ka mba ukwu a bụ.” (Deuterọnọmi 4:6) Ezi ndị Kraịst kwesịrị n’otu aka ahụ ịma ihe. Ọ dị ha mkpa ịbụ ezi ndị mmụta nke Okwu Chineke. Iji gosi nzube nke ihe ọmụmụ dị otú ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu, ka e wee mee ka unu jupụta ná mmazu nke ihe ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke mmụọ nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ ya ụtọ n’ụzọ nile nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazụ nke Chineke.”—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.
2. (a) Gịnị dị mkpa iji nweta ezi ihe ọmụma nke Chineke? (b) Olee otú Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova siworo lee okwu a anya?
2 Ịmụ ihe na-eburu inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke na nzube ya nile n’uche chọrọ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ̀tụ̀tụ̀ dịkarịsịrị ala nke agụmakwụkwọ. Ma ọtụtụ ndị mụtaworo eziokwu nke Okwu Chineke bi ná mba dị iche iche ebe a na-enweghị ma ọ bụ ebe e nwere ohere dị nta iji nweta agụmakwụkwọ ụwa kwesịrị ekwesị. Ihe adabacharaghị ha. Iji merie nsogbu nke a, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ruo ọtụtụ afọ ugbu a enyewo ntụziaka ka a hazie ụlọ akwụkwọ ịmụ ka e si agụ na ka e si ede n’ime ọgbakọ dị iche iche, n’ebe ọ dị mkpa. N’ihe karịrị 30 afọ gara aga, akwụkwọ akụkọ ndị Brazil bụ́ Diário de Mogi bipụtara otu ihe odide isiokwu ya bụ “Ndịàmà Jehova Ebuso Amaghị Agụ na Amaghị Ede Agha.” O kwuru, sị: “Onye ozizi ruru eru na-amalite . . . iji ndidi kụziere ndị ọzọ ịgụ na ide ihe. . . . Ụmụ akwụkwọ, n’ihi ọnọdụ ndị na-arụgide ha dị ka ndị ozi Chineke, aghaghị ịzụlite ihe ọmụma ha n’asụsụ ha iji na-ekwu okwu n’ihu ọha.” E siwo otú a nyere ọtụtụ puku mmadụ gburugburu ụwa aka ịghọ ezi ndị mmụta nke Okwu Chineke. Ha bu nzube dị elu n’uche nara agụmakwụkwọ nke a bụ isi.
Nkà Ndị A Chọrọ Iji Bụrụ Ndị Ozi Dị Irè
3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji nwee mmasị n’agụmakwụkwọ? (b) Gịnị bụ ọnọdụ dị n’Israel, agụmakwụkwọ bụ isi dị aṅaa ka a na-apụghị ilefuru anya n’ime ọgbakọ anyị nile taa?
3 Ezi ndị Kraịst nwere mmasị n’agụmakwụkwọ, ọ bụghị nanị iji mara akwụkwọ, kama iji bụrụ ndị na-ejere Jehova ozi n’ụzọ dị irè karị. Kraịst nyere ndị Kraịst nile ọrụ nke ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ nke m nyere n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20) Iji zie ndị ọzọ ihe, ha onwe ha aghaghị ibu ụzọ mụọ ihe, nke a chọkwara ụzọ ndị dị mma isi na-enwe ọmụmụ ihe. Ha aghaghị inwe ikike nke iji nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:11) Iji rụzuo ọrụ ha, ọ dịkwa ha mkpa inwe ike ịgụ ihe werewere.—Lee Habakuk 2:2; 1 Timoti 4:13.
4 Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na, n’ozuzu ha, ọbụna ụmụaka n’Israel oge ochie maara ka e si agụ na ka e si ede. (Ndị Ikpe 8:14; Aịsaịa 10:19) Ọ dị ndị ozi bụ́ ndị Kraịst taa mkpa ịdị na-edetu ihe n’ụzọ dị mma n’anya mgbe ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ha na-ede akwụkwọ ozi, na-edetu ihe ná nzukọ dị iche iche, deekwa mkpirikpi ihe n’ihe ha na-amụ. Ihe a dum chọrọ aka akwụkwọ a pụrụ ịgụta agụta. Ime ndekọ n’ọgbakọ ndị Kraịst chọrọ ma ọ dịkarịa ala, ihe ọmụma bụ isi nke nkà mgbakọ na mwepụ.
Uru Ndị Dị n’Ọmụmụ Akwụkwọ Kwesịrị Ekwesị
5. (a) Gịnị bụ mmalite nke okwu ahụ bụ́ “ụlọ akwụkwọ”? (b) Ohere dị aṅaa ka ndị na-eto eto kwesịrị iji mee ihe?
5 Ọ dị mma ịmara na okwu ahụ bụ “ụlọ akwụkwọ” sitere n’okwu Grik bụ skho·leʹ, nke pụtara na mbụ “ntụrụndụ” ma ọ bụ iji oge ntụrụndụ mee ihe ọzọ dị mkpa, dị ka ịmụ ihe. E mesịrị jiri ya na-akọwa ebe a nọ na-enwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ. Nke a na-egosi na, n’otu oge, nanị ndị ihe dabaara—na Gris na n’ihe ka ọtụtụ n’ala ndị ọzọ—nwere oge iji mụọ ihe. Ìgwè ndị na-arụ ọrụ na-anọgidekarị n’ìsì. Taa, n’ihe ka n’ọtụtụ mba karị a na-enye ụmụntakịrị na ndị na-eto eto oge iji mụọ ihe. Ndịàmà na-eto eto kwesịrị nnọọ ịzụchapụta oge dị mma iji nweta ihe ọmụma ma bụrụ ndị dị irè na-ejere Jehova ozi.—Ndị Efesọs 5:15, 16.
6, 7. (a) Olee uru ụfọdụ nke ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ekwesị? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ịmụ asụsụ ndị ọzọ pụrụ isi baa uru? (ch) Gịnị bụ ọnọdụ e nwere taa n’etiti ọtụtụ ndị na-eto eto mgbe ha gụsịrị akwụkwọ?
6 Ihe ọmụma bụ isi nke akụkọ ihe mere eme, ọdịdị ụwa, nkà sayensị, na ihe ndị ọzọ ga-enyere Ndịàmà na-eto eto aka ịbụ ndị ozi nwere ihe ọmụma n’akụkụ nile. Ọmụmụ akwụkwọ ha ga-akụziri ha ọ bụghị nanị ọtụtụ ihe ọmụmụ kamakwa usoro ịmụ ihe. Ezi ndị Kraịst adịghị akwụsị ịmụ ihe na ọmụmụ ihe mgbe ha hapụrụ ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ihe ha nwetara n’ọmụmụ ihe ha ga-adabere n’ebe ọ dị ukwuu na ha ịma otú e si enwe ọmụmụ ihe. Ma ọmụmụ akwụkwọ ụwa ma nke ọgbakọ pụrụ inyere ha aka iwulite izuzu ha nile. (Ilu 5:1, 2) Mgbe ha gụrụ ihe, ha ga-enwe ike karị ịghọta ihe dị mkpa, ihe kwesịrị ka a rịba ama ma buru ya n’isi.
7 Dị ka ihe atụ, ịmụ asụsụ mba ọzọ abụghị nanị na ọ ga-ewulite ikike ụbụrụ nke ndị na-eto eto kamakwa ọ ga-eme ka ha baara nzukọ Jehova uru karị. N’alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ nke Watch Tower Society, ọtụtụ ụmụnna ndị na-eto eto ahụwo ya dị ka ihe bara uru inwe ike ịsụ ma ọ bụ ịgụ Bekee nke ọma. Ọzọkwa, ndị ozi nile bụ ndị Kraịst kwesịrị ịgbalịsi ike inwe nkà n’ịsụ asụsụ obodo ha. Ozi ọma nke Alaeze kwesịrị ka e kwupụta ya n’ụtọ asụsụ doro anya nke ziri ezi. Ihe ndị mere eme na-egosi na n’ụwa taa mgbe ọtụtụ ndị na-eto eto gụsịrị akwụkwọ, ha ka na-enwe ihe isi ike n’ide na ịgụ ihe nke ọma na ịrụ mgbakọ na mwepụ kasị dị mfe; ha nwekwara ihe ọmụma na-edoghị anya ma ọlị nke akụkọ ihe mere eme na ọdịdị ụwa.
Agụmakwụkwọ zuru Ezu
8. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-emetụta isiokwu nke agụmakwụkwọ ụwa na ikike mmadụ nwere ịkwado onwe ya?
8 Ya mere, nke a yiri ka ọ bụ oge kwesịrị ekwesị ịtụle àgwà onye Kraịst n’ebe agụmakwụkwọ ụwa dị. Olee ụkpụrụ Bible ndị metụtara isiokwu a? Nke mbụ, n’ihe ka n’ọtụtụ na mba nile, ido onwe n’okpuru “Siza” n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-achọ ka ndị nne na nna bụ ndị Kraịst zigaa ụmụ ha ụlọ akwụkwọ. (Mak 12:17; Taịtọs 3:1) Nye Ndịàmà na-eto eto, n’ọrụ ụlọ akwụkwọ ha ha kwesịrị icheta Ndị Kọlọsi 3:23, nke na-asị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.” Ụkpụrụ nke abụọ o metụtara bụ ndị Kraịst kwesịrị inwe ike ịkwado onwe ha, ọbụna ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12) Ọ bụrụ na ọ lụrụ nwunye, nwoke kwesịrị inwe ike inyezu nwunye ya na ụmụ ọ bụla a pụrụ ịmụta ihe na-akpa ha n’ụzọ ziri ezi, nweekwa ụfọ ihe dị nta inye ndị nọ ná mkpa na iji kwadoo ọrụ nkwusa a na-eme n’ógbè ya na gburugburu ụwa.—Ndị Efesọs 4:28; 1 Timoti 5:8.
9, 10. (a) Gịnị yiri ka ọ bụ ihe na-eme n’ọtụtụ mba? (b) Gịnị ka onye ozi ọsụ ụzọ pụrụ ile anya dị ka ụgwọ zuru ezu?
9 Agụmakwụkwọ hà aṅaa dị onye Kraịst na-eto eto mkpa iji kwanyere ụkpụrụ ndị a nke Bible ùgwù ma na-emezu ibu ọrụ ndị Kraịst dịịrị ya? Nke a na-adị iche site ná mba ruo ná mba. Otú ọ dị, n’ozuzu ya, o yiri ka otú ihe dum si aga n’ọtụtụ mba bụ na ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ a chọrọ iji na-enweta ụgwọ ọrụ dị mma dị elu ugbu a karịa ka ọ dị n’afọ ole na ole gara aga. Akụkọ ndị a natara site n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society n’akụkụ dị iche iche nke ụwa na-egosi na n’ọtụtụ ebe o siri ike inweta ọrụ na-akwụ ụgwọ dị mma mgbe e nwesịrị nanị ọmụmụ akwụkwọ iwu chọrọ ma ọ bụ ná mba ụfọdụ ọbụna mgbe a gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ma ọ bụ kọleji.
10 Gịnị ka “ụgwọ dị mma” pụtara? Ọ dịghị apụta ọrụ ndị na-akwụ ụgwọ dị elu. Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Dictionary na-akọwa “dị mma” n’ọnọdụ a dị ka “zuru ezu, afọ ojuju.” Gịnị ka a pụrụ ịkpọ nke “zuru ezu,” dị ka ihe atụ, maka ndị chọrọ ịbụ ndị ozi ọsụ ụzọ nke ozi ọma? Ndị dị otú ahụ n’ozuzu ha na-enwe mkpa maka ọrụ nwa oge iji zere itinye “ibogbu” ụmụnna ha ma ọ bụ ezinụlọ ha n’ibu arọ. (1 Tesalọnaịka 2:9) A pụrụ ịkpọ ụgwọ ha na-enweta nke “zuru ezu,” ma ọ bụ na-enye “afọ ojuju,” ma ọ bụrụ na ụgwọ ha na-enweta na-enye ha ohere ibi ndụ dị mma ma na-enyekwa ha oge zuru ezu na ume ijezu ozi ndị Kraịst ha.
11. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-eto eto jiworo hapụ ozi ọsụ ụzọ, ajụjụ dị aṅaa ka a na-ajụkwa?
11 Gịnị na-abụkarị ọnọdụ e nwere taa? A kọwo na ná mba ụfọdụ ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ezi nzube ahapụwo ụlọ akwụkwọ mgbe ha nwetasịrị ọmụmụ akwụkwọ dịkarịsịrị ala a chọrọ iji bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Ha amụghị ọrụ ọ bụla ma ọ bụ nwee iru eru ọ bụla nke ụwa. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ha enyereghị ha aka, ọ ga-adị ha mkpa ịchọta ọrụ nwa oge. Ọ dịwo ụfọdụ mkpa ịnakwere ọrụ ndị na-achọ ka a rụọ ọrụ ogologo oge nke ukwuu iji nweta ego ga-ezu iji bie ndụ. Site n’ike ọgwụgwụ n’anụ ahụ, ha kwụsịrị ozi ọsụ ụzọ. Gịnị ka ndị dị otú ahụ pụrụ ime iji kwadoo onwe ha wee banyeghachi n’ozi ọsụ ụzọ?
Echiche Ziri Ezi Banyere Agụmakwụkwọ
12. (a) Banyere agụmakwụkwọ, echiche abụọ dị aṅaa gabigara ókè ka onye Kraịst ga-ezere? (b) Maka ndị raara onwe ha nye na-ejere Jehova ozi na ụmụ ha, nzube dị aṅaa ka agụmakwụkwọ gaemezu?
12 Echiche ziri ezi banyere agụmakwụkwọ pụrụ inye aka. Nye ọtụtụ ndị ụwa na-eto eto, agụmakwụkwọ bụ akara ọkwá mmadụ, ihe ga-enyere ha aka ịgbago n’ọkwá n’etiti ọha mmadụ, ụzọ isi bie ndụ ihe ịga nke ọma, nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Nye ndị ọzọ, ọmụmụ akwụkwọ bụ ọrụ a ga-ahapụ ngwa ngwa o kwere omume. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime echiche ndị a ziri ezi nye ezi onye Kraịst. Mgbe ahụ, gịnị ka a pụrụ ile anya dị ka “echiche ziri ezi”? Ndị Kraịst kwesịrị ile agụmakwụkwọ anya dị ka ihe e ji enweta ihe. N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, nzube ha bụ ijere Jehova ozi ruo otù o kwere omume na n’ụzọ dị irè. Ọ bụrụ na ná mba ha bi, agụmakwụkwọ dịkarịsịrị ala ma ọ bụ ọbụna nke kọleji ga-enye ha ohere ịchọta nanị ọrụ ga-enye ụgwọ na-ezughị ezu iji kwadoo onwe ha dị ka ndị ọsụ ụzọ, mgbe ahụ a pụrụ ịtụle inwekwu agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ ọzọ. Nke a ga-abụ n’ihi otu ihe mgbaru ọsọ kpọmkwem nke ozi oge nile.
13. (a) Olee otú otu nwanna nwanyị na Philippines siworo nwee ike ịga n’ihu n’ozi ọsụ ụzọ ya ka ọ na-arụzu ọrụ ezinụlọ ndị dịịrị ya? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa kwesịrị n’oge a?
13 Ụfọdụ anarawo ọzụzụ ndị meghepụrụ ohere ọrụ ndị na-enyere ha aka ikere òkè ma ọ bụ ịmaliteghachi ozi oge nile. Otu nwanna nwanyị na Philippines bụ ya na-enye ezinụlọ ya nri, ma ọ chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Alaka ụlọ ọrụ dị ebe ahụ na-akọ, sị: “O nwewo ike ime nke a n’ihi na ọ natakwuru agụmakwụkwọ iji ruo eru dị ka onye gọọmenti nyere nkwado ime ndekọ ego.” Otu akụkọ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-asị: “Anyị nwere ọtụtụ ndị na-aga akwụkwọ ma n’otu oge ahụ nweekwa ike ịhazi ihe omume ha iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ. N’ozuzu ha, ha aghọwo ndị nkwusa ka mma ebe ha na-adị uchu karị n’ịmụ ihe, ọ bụrụhaala na ha enwebigaghị echiche okomoko ókè ná nchụso ihe ụwa.” Ahịrị ikpeazụ kwesịrị inye anyị ihe anyị ga-atụgharị uche banyere ya. A gaghị echefu mgbe ọ bụla nzube nke ịnarakwu ọmụmụ akwụkwọ ahụ, n’ebe nke a dị mkpa, ma ọ bụ gbanwee ya ịghọ ihe mgbaru ọsọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya.
14, 15. (a) N’ihi gịnị ka a na-ekwesịghị iti iwu ọ bụla banyere agụmakwụkwọ? (b) Agụmakwụkwọ ụwa dị aṅaa ka ụfọdụ ụmụnna nwere ezi uche natara, ma gịnị kwụworo ụgwọ maka nke a?
14 Ná mba ole na ole, ụlọ akwụkwọ kọleji na-enye ọzụzụ nkà ọrụ ndị pụrụ ịkwadebe onye Kraịst na-eto eto maka nkà ma ọ bụ ọrụ ụfọdụ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ. Ọbụna mgbe ọ na-adịghị otú a, n’ala ụfọdụ, ndị na-eto eto na-agba mbọ bụ́ ndị nwetara nanị ọmụmụ akwụkwọ bụ isi na-enweta ọrụ nwa oge nke na-enyere ha aka inweta ụgwọ ọrụ zuru ezu iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ. Ya mere, e kwesịghị iti iwu ọ bụla ná nkwado ma ọ bụ imegide inwetakwu agụmakwụkwọ.
15 Ọtụtụ ndị na-eje ozi ugbu a n’ọnọdụ nlekọta dị iche iche dị ka ndị nlekọta na-agagharị agagharị, n’isi ụlọ ọrụ Society, ma ọ bụ n’otu alaka ụlọ ọrụ ya nwere nanị agụmakwụkwọ bụ isi. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi, na-adịghị mgbe ha kwụsịrị ịmụ ihe, nata ọzụzụ, e nyewokwa ha ibu ọrụ ndị ka ukwuu. Ha adịghị akwa ụta ọ bụla. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị ibe ha họọrọ agụmakwụkwọ mahadum ma dapụ, bụrụ ndị nkà ihe ọmụma ụwa nke na-ebibi okwukwe na “amamihe nke ụwa” kpuru ihu.—1 Ndị Kọrint 1:19-21; 3:19, 20; Ndị Kọlọsi 2:8.
Ịgụkọ Ihe Ọ Ga-efu
16. (a) Ònye na-ekpebi ma e nwere mkpa inwetakwu agụmakwụkwọ, gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche karịsịa? (b) Gịnị ka e kwesịrị ịtụle?
16 Ònye na-ekpebi ma onye Kraịst na-eto eto ọ̀ ga-anarakwu agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ? Ụkpụrụ Bible nke ịbụ isi na-abata n’ebe a. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 6:1) N’ihi nke a, ndị nne na nna ga-achọ inye ụmụ ha nduzi ná nhọrọ nke ọrụ ma ọ bụ nkà, si otú a nye nduzi n’okere agụmakwụkwọ ga-adị mkpa. N’ọtụtụ mba, a na-eme nhọrọ agụmakwụkwọ na ọrụ n’oge mgbe a nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndarị. Nke ahụ bụ oge mgbe ọ dị ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na ndị ntorobịa mkpa ịchọ nduzi Jehova n’ime nhọrọ amamihe dị na ya, na-eburu ọdịmma Alaeze n’uche karịsịa. Ndị na-eto eto na-enwe mmasị na ikike nghọta ihe dị iche iche. Ndị nne na nna nwere amamihe ga-echebara ndị a echiche. Ọrụ ọ bụla e ji ime ihe n’eziokwu na-arụ dị nsọpụrụ, ọ sọ ya bụrụ ọrụ ọfịs ma ọ bụ nke ájá ájá. Ọ bụ ezie na ụwa pụrụ ịdị na-ebuli ọrụ ọfịs elu ma na-elelị mmadụ iji aka ya na-arụsi ọrụ ike anya, Bible adịghị eme otú ahụ. (Ọrụ 18:3) Ya mere mgbe ndị nne na nna na ndị Kraịst na-eto eto taa, ma ha jirisịa nlezianya na ekpere tụlee uru na ọghọm nile, kwadoo ma ọ bụ megide ịgụkwu akwụkwọ mgbe a gasịrị sekọndrị, ndị ọzọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịkatọ ha.
17. Nhọrọ dị aṅaa ka nne na nna ụfọdụ bụ Ndịàmà mewooro ụmụ ha?
17 Ọ bụrụ na nne na nna bụ́ ndị Kraịst ejiri ezi uche kpebie ime ka ụmụ ha gụkwuo akwụkwọ ma ha gasịa kọleji, nke ahụ bụ okwu aka ha. Oge ọmụmụ ihe ndị a ga-enwe ga-adị ịche iche na-adabere n’ụdị ọrụ ma ọ bụ nkà a họọrọ. N’ihi okwu ego na iji nyere ụmụ ha aka ịbanye n’ozi oge nile ngwa ngwa dị ka o kwere mee, ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ahọrọwo usoro ọmụmụ ihe ndị na-adịghị ewe ogologo oge ná nkà ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ndị na-akụzi ịkwa nkà. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ dịwo mkpa ndị ntorobịa ịmụ ọrụ n’aka onye ọzọ n’otu nkà ma ọ na-abụ mgbe nile n’inwe itinye ndụ zuru ezu n’ozi Jehova dị ka ihe mgbaru ọsọ.
18. Ọ bụrụ na a narakwuo ọmụmụ akwụkwọ, gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche?
18 Ọ bụrụ na a narakwuo ọmụmụ akwụkwọ, n’ezie ebumnuche ya ekwesịghị ịbụ ịka ndị ọzọ mara akwụkwọ ma ọ bụ ịdọlị inweta ọrụ ụwa e ji eme okomoko. E kwesịrị iji nlezianya họrọ ihe a na-amụ. Magazin nke a emesiwo ihe ize ndụ nke ọmụmụ ihe dị elu ike, ọ bụkwa ezi ihe kpatara ya, n’ihi na ihe ka n’agụmakwụkwọ dị elu e nwere na-emegide “ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ” nke Bible. (Taịtọs 2:1; 1 Timoti 6:20, 21) Ọzọkwa, kemgbe afọ ndị 1960, ọtụtụ ụlọ akwụkwọ nke ịgụkwu akwụkwọ aghọwo ebe mmebi iwu na omume rụrụ arụ na-ewu ewu. “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ekwugidewo n’ụzọ siri ike ịbanye n’ógbè dị otú ahụ. (Matiu 24:12, 45) Otú ọ dị, anyị aghaghị ịnakwere na n’oge ndị a, ndị na-eto eto na-ezute otu ihe ize ndụ ndị a n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị na kọleji ndị na-akụzi ọrụ aka na ọbụna n’ụlọ ọrụ.—1 Jọn 5:19.a
19. (a) Nlezianya dị aṅaa ka ndị kpebiri ịnwetakwu agụmakwụkwọ kwesịrị ilezi? (b) Olee otú ụfọdụ siworo jiri agụmakwụkwọ ha mee ihe bara uru?
19 Ọ bụrụ na e kpebie inwetakwu agụmakwụkwọ, Onyeàmà na-eto eto ga-eme nke ọma ịnara nke a n’ebe obibi ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume ma ọlị, si otú a naenwe ike ijigide àgwà ọmụmụ ihe ndị Kraịst na-ejikarị eme ihe, ịga nzukọ, na ọrụ nkwusa. Ná mmalite e kwesịrị iwere nguzo kwesịrị ekwesị n’ụkpụrụ nile nke Bible. E kwesịrị icheta na Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru bụ ndị a dọọrọ n’agha laa mba ọzọ mgbe e nyere ha iwu ịgụkwu akwụkwọ na Babilọn, ma ha nọgidere na-ejigide iguzosi ike n’ezi ihe ha. (Daniel, isi nke 1) Ka ha na-edebe ọdịmma ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ, Ndịàmà na-eto eto n’ọtụtụ mba anarawo ọmụmụ ihe dị iche iche iji kwadebe onwe ha maka ọrụ nwa oge dị ka ndị ndekọ ego, ndị nkà ọrụ, ndị nkụzi, ndị nsụgharị, ndị ntụgharị okwu ma ọ bụ n’ọrụ ọzọ nke ga-akwado ha nke n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ ha bụ isi nke bụ ọrụ ọsụ ụzọ. (Matiu 6:33) Ọtụtụ ndị ntorobịa ndị a emesịwo bụrụ ndị nlekọta na-agagharị agagharị ma ọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo na Betel.
Ndị Maara Akwụkwọ, Dị n’Otu
20. Nkewa dị aṅaa n’ụwa bụ nke na-enweghị ọnọdụ n’etiti ndị Jehova?
20 N’etiti ndị Jehova, ma ọrụ mmadụ ọ̀ bụ nke ọfịs, nke ájá ájá, ọrụ ugbo, ma ọ bụ ijere ndị ọzọ ozi, ọ dị mmadụ nile mkpa ịbụ ezi ndị mmụta nke Bible na ndị nkụzi dị irè. Nkà mmadụ nile nwetara n’ịgụ ihe, ịmụ ihe, na ịkụzi ihe na-ewepụ nkewa nke ụwa na-eme n’etiti ndị ọrụ ọkpụkpụ aka na ndị ọfịs. Nke a na-akpata ịdị n’otu na nkwanyerịta ùgwù nke a na-ahụ karịsịa n’etiti ndị ọrụ afọ ofufo n’ezinụlọ Betel nile na n’ebe Watch Tower Society na-ewu ihe owuwu, ebe àgwà ime mmụọ dị iche iche bụ ihe kasị mkpa na nke a chọrọ n’aka onye ọ bụla. N’ebe a, ndị ọrụ ọfịs nweworo ahụmahụ ji ọṅụ soro ndị ọrụ ọkpụkpụ aka nwere nkà na-arụkọ ọrụ, ha nile na-egosipụta mmasị ịhụnanya otu onye n’ebe ibe ya nọ.—Jọn 13:34, 35; Ndị Filipaị 2:1-4.
21. Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnuche ndị Kraịst na-eto eto?
21 Ndị nne na nna, duzienụ ụmụ unu gaa n’ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị bara uru so n’òtù ụwa ọhụrụ ahụ! Ndị Kraịst na-eto eto, jirinụ ohere agụmakwụkwọ ndị unu nwere mee ihe dị ka ihe iji kwadebe onwe unu maka ijidekwu ihe ùgwù unu nke ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị! Dị ka ndị e ziri ihe, ka unu nile nwapụta ịbụ ndị òtù a kwadebere nke ọma nke òtù ụmụ mmadụ nke ọchịchị Chineke ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi ‘n’ime “ụwa ọhụrụ” Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13; Aịsaịa 50:4; 54:13; 1 Ndị Kọrint 2:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Leekwa Ụlọ Nche nke March 1, 1976, peji nke 158-160.
Nwalee Ike Ncheta Gị
◻ N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji nwee mmasị n’agụmakwụkwọ?
◻ Echiche ndị gabigara ókè dị aṅaa banyere agụmakwụkwọ ka ezi ndị Kraịst ga-ezere?
◻ Ihe ize ndụ dị aṅaa nke inwetakwu agụmakwụkwọ ka e kwesịrị ichebara echiche, nlezianya dị aṅaa ka e kwesịkwara inwe?
◻ Nkewa dị aṅaa n’ụwa bụ nke na-enweghị ọnọdụ n’etiti ndị Jehova?
[Foto dị na peeji nke 16]
Site n’ịdị uchu n’ịmụ ihe, ndị Kraịst na-eto eto pụrụ ịbụ ndị bara uru karị so n’òtù ụwa ọhụrụ ahụ
[Foto dị na peeji nke 19]
Ịnarakwu agụmakwụkwọ, ma a họrọ ya, kwesịrị ịbụ nke ọchịchọ ijere Jehova ozi n’ụzọ ka mma kpaliri