Nzukọ Ije Ozi Maka July
Izu Na-amalite July 5
Abụ nke 6
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu banyere akụkọ ozi ubi April maka mba a na ọgbakọ unu. Akụkọ Ọchịchị Chineke.
20 min: “Kpee Ekpere Maka Enyemaka Jehova.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Kọwaa otú ụdị ekpere dị iche iche sitere n’ezi obi si arụ ọrụ dị mkpa n’ozi nwere ihe ịga nke ọma. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ ahụmahụ ndị na-egosi otú ekpere ndị e kpere n’ezi oge si nyere ha aka n’ozi ha.—Lee Ụlọ Nche, October 15, 1996, peji nke 32.
15 min: Jiri Nnyefe Pụrụ Iche Mee Ihe nke Ọma. Okwu na ihe ngosi. Kọwaa ihe mere akwụkwọ ndị ahụ ji bụrụ ngwá ọrụ ndị bara uru n’ozi anyị. Ha na-ekwu okwu n’ụzọ dị irè banyere isiokwu ndị na-amasị ụdị mmadụ dị iche iche ma na-akọwa ozi Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị mfe nghọta. Gosi ndị e nwere. Mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ dị mkpirikpi nke ụzọ iche ihe n’ihu dabeere n’aro ndị a tụrụ n’isiokwu bụ́ “Presentations” (Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ) nke dị na Watch Tower Publications Index.
Abụ nke 181 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 12
Abụ nke 103
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Ibu Ụzọ Mee Nkwadebe Na-eweta Ọṅụ.” Okwu na ịgba ajụjụ ọnụ. Kọwaa ihe mere ime nkwadebe ji dị mkpa maka ozi ubi na otú o si eme ka anyị nwee ike inweta ọṅụ ka ukwuu n’ihe anyị na-eme. (Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 45, paragraf nke 1-3.) Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru ajụjụ ọnụ bụ́ ndị ga-akọ otú ha si eme nkwadebe tupu ha agawa ozi na otú nke ahụ si enyere ha aka. Kọọ ahụmahụ sitere n’Ụlọ Nche nke April 15, 1993, peji nke 30, na-egosi ụzọ a pụrụ isi jiri akwụkwọ Reasoning mee nkwadebe n’ụzọ dị irè maka ozi.
20 min: “Ka Anyị Kpọọ Okwu Aha!” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ihe ngosi. Tụlee aro nke ọ bụla banyere ihe a ga-ekwu iji mee ka onye nwe ụlọ gee ntị. Mee ka ndị nkwusa nwere ahụmahụ mee ihe ngosi dị iche iche nke okwu mmalite ndị dị irè. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha tụkwuo aro ma kọọ ahụmahụ na-agba ume ndị na-egosi ihe dị irè n’ezie n’ógbè unu.
Abụ nke 183 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 19
Abụ nke 31
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Ịzụ Ụmụaka n’Ozi Ubi. Okwu onye okenye ga-ekwu. Malite na nwata, ụmụ anyị kwesịrị iso anyị na-arụsi ọrụ ike n’ozi. Ọzụzụ na ahụmahụ ha na-enweta ga-eme ka okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi ha nwee ebe siri ike ha dabeere ka oge na-aga. Ọ dị mkpa na ha ghọtara mkpa ọ dị iji ozi ahụ kpọrọ ihe ma na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị. Ụmụaka aghaghị izere àgwà ịkpa aghara; oge ije ozi abụghị oge igwuri egwu. Ọ kasị mma ha na ndị toworo eto ịrụ. E kwesịrị inyere ha aka ikere òkè n’iche ihe n’ihu mmadụ otú ha nwere ike. Ọ bụ ọrụ ndị nne na nna ilekọta ha; ha kwesịrị ịgbalị ime ndokwa maka onye ha na ha ga-arụ tupu oge eruo. Jaa ụmụaka mma mgbe ha mere nke ọma. Otu nna emee ihe ngosi nke otú o si akwadebe nwa ya maka ozi ubi.
20 min: M̀ Ga-esonyerịrị Otu Nzukọ? Nkwurịta okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na-adabere n’akwụkwọ Reasoning, peji nke 280-284. Anyị na-ezutekarị ndị na-ege ntị n’ozi Alaeze ahụ ma ha kpọrọ “isonyere” òtù okpukpe asị. Tụleghachi nkọwa nke “organization” (nzukọ) na ihe asaa e ji amata nzukọ Jehova a na-ahụ anya. Kọwaa ihe mere o ji dị iche ná ndị ọzọ na otú iso ya na-emekọ ihe si eweta ezigbo ngọzi.
Abụ nke 189 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 26
Abụ nke 184
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka July. Tụlee “Ị̀ Ga-aga?”
10 min: Igbe Ajụjụ.
20 min: Ànyị Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ? Onye nlekọta ije ozi na otu ohu na-eje ozi ma ọ bụ abụọ atụlee isi ihe ndị sitere n’Ụlọ Nche nke February 15, 1996, peji nke 19-22. Kọwapụta ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere o ji dị mkpa ka anyị chọpụta ndị kwesịrị ekwesị nọ n’ókèala anyị ma mee ha ndị na-eso ụzọ. (Mat. 10:11) Ndị a bụ ndị na-eze ume n’ihi ọnọdụ ọjọọ na nke asọpụrụghị Chineke nile ha na-ahụ gburugburu ha, ndị na-achọkwa Jehova tupu ụbọchị iwe ya eruo. (Ezik. 9:4; Zef. 2:2, 3) “Ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi” so n’etiti ha. (Ọrụ 13:48) Ọrụ e nyere anyị bụ ịbụ ndị na-eme ndị na-eso ụzọ, na-ezi ndị mmadụ ihe nile Jisọs nyere n’iwu. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịkpali mmasị mbụ nke ndị anyị na-ezute n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, mgbe anyị na-agba àmà mberede, na n’ọrụ okporo ámá, anyị na-eme ndị na-eso ụzọ n’ozi na-esochi ya—ná nletaghachi na ọmụmụ Bible. Kọwapụta aro ndị bara uru banyere otú a pụrụ isi mee nke a.
Abụ nke 14 na ekpere mmechi.