Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/99 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka August

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka August
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite August 2
  • Izu Na-amalite August 9
  • Izu Na-amalite August 16
  • Izu Na-amalite August 23
  • Izu Na-amalite August 30
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 8/99 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka August

Izu Na-amalite August 2

Abụ nke 39

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi April maka mba a na maka ọgbakọ unu. Gbaa ndị nkwusa nile ume ikere òkè n’ozi ubi n’August.

17 min: “Kwanyere Aha Ọma Jehova Ùgwù nke Ukwuu.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Mee ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha pụta ìhè.—Lee akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi, peji nke 184-185.

18 min: “Agụmakwụkwọ Ụwa na Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Gị.” Otu nna esoro nwa ya nwoke ma ọ bụ nwanyị tụlee isiokwu ahụ. Ha atụleekwa isiokwu ndị yiri ya site na Teta!, January 8, 1996, peji nke 19-23.

Abụ nke 148 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 9

Abụ nke 138

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

12 min: Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka—Olee Ọganihu E Nweworo? Okwu na ịgba ajụjụ ọnụ nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Tụleghachi nduzi e nyere n’Ozi Alaeze Anyị nke September 1998, peji nke 8. Kọọ otú e si hazie nke a n’ọgbakọ unu, ma kwuo ihe ndị kasị ọhụrụ banyere ọganihu nke ndị e nyeere aka nweworo. Gbaa otu onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ abụọ na ndị nkwusa ụfọdụ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị riteworo uru site n’enyemaka ha. Gbaa ndị ọhụrụ a ga-enyere aka ume iji ndokwa a mee ihe n’ụzọ zuru ezu.

25 min: “Ohere Ịsụ Ụzọ Ò Megheworo Gị Ugbu A?” Ntụle ajụjụ na azịza nke onye okenye ga-eduzi. N’ụzọ na-ewuli elu, gosi ohere ndị e nwere maka ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ka ukwuu inwe ike ịsụ ụzọ. Gbaa ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị nwere ike ịkọ site n’ahụmahụ nke onwe ha otú ha si nwee ike imeri ihe mgbochi ndị a na-enwekarị ma nwee ihe ịga nke ọma, ajụjụ ọnụ. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ihe Atụ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Oge Nile.” na-emesi ike otú ime ezi atụmatụ pụrụ isi mee ka e nwee ike inweta awa ole a chọrọ. Maa ọkwa na onye ọ bụla chọrọ inweta akwụkwọ ndejupụta maka ịsụ ụzọ pụrụ inweta otu mgbe a gbasara nzukọ.

Abụ nke 202 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 16

Abụ nke 131

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Nanị ngwụsị izu abụọ fọrọ n’August, n’ihi ya gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi tupu ọnwa agwụsịa.

15 min: “Ì Nwezuru Ihe Dị Mkpa Iji Mụta Ka E Si Agụ na Ka E Si Ede?” Nkwurịta okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, nke onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-eme.

20 min: Ị̀ Na-ekere Òkè n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ? Nkwurịta okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. N’ihi ọnụ ọgụgụ akwụkwọ dị ukwuu a na-etinye, nzube anyị kwesịrị ịbụ ịmalite ọmụmụ Bible ka anyị wee nwee ike inyere ndị mmadụ aka irite uru site n’akwụkwọ ndị ha na-enweta. Kpọọ ndị nkwusa òkù ka ha kwuo nsogbu ndị na-egbochi ha iduzikwu ọmụmụ ihe: (1) O siri ike ịchọta ndị dị njikere ịmụ ihe. (2) Ụfọdụ ndị nwere mmasị na-ekwu na ha enweghị ohere ịmụ ihe. (3) Mgbe a malitesịrị ọmụmụ ihe, ọ na-esi ike ịhụ onye ahụ n’ụlọ iji nọgide na-enwechi ọmụmụ ihe ahụ anya. Kwuokwa okwu banyere ihe ndị nkwusa ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche banyere ọrụ ọmụmụ Bible: (1) ‘Echeghị m na m ruru eru ịbụ onye ozizi.’ (2) ‘Enweghị m ohere ịdị na-eduzi ọmụmụ ihe kwa izu.’ (3) ‘Ọ na-esitụrụ m ike ikwe onye ọzọ nkwa.’ (4) ‘Ikere òkè n’akụkụ ozi ndị ọzọ ezuworo m.’ Tụọ aro ndị dị mma banyere ụzọ isi merie ihe mgbochi ndị a iji kere òkè n’onwe onye n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Mee ka ndị nkwusa na-enwe ihe ịga nke ọma kọọ ọṅụ ha nwetaworo n’ọrụ ọmụmụ Bible.—Lee ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke December 1998, paragraf nke 3-8, 15.

Abụ nke 100 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 23

Abụ nke 94

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Nyere Ndị Ọhụrụ Nwere Mmasị Aka Ịghọta Ịdị Nsọ nke Alụmdi na Nwunye. Onye okenye eduzie nkwurịta okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na-adabere n’akwụkwọ Reasoning, peji nke 248-250. Anyị na-ezute ndị di na nwunye na-ege ntị n’ozi Alaeze ahụ ma bụrụ ndị na-egbu oge n’inwe ọganihu n’ihi na ha na-ebikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Tụlee ụzọ isi nyere ha aka ịghọta ihe mere ndị Kraịst na-aghaghị iji jigide alụmdi na nwunye dị nsọpụrụ. (Lee Teta! nke April 8, 1993, peji nke 24-25.) Tụọ aro banyere ihe ndị anyị pụrụ iji akọ kwuo iji nyere ndị di na nwunye dị otú ahụ aka ịhụ ihe mere na ha apụghị ịbụ akụkụ nke ọgbakọ ruo mgbe ha mere ka alụmdi na nwunye ha bụrụ nke iwu kwadoro.

20 min: “Kpọọ Onye Ọ Bụla Akpịrị Na-akpọ Nkụ Òkù.” Tụlee isiokwu, na-akọwapụta otú e si mee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha iji kpasuo mmasị ma kpalie ndị na-ege ntị. Mee ka onye toruworo ogo mmadụ mee ihe ngosi na paragraf nke 2-3 ma ọ bụ 4-5, onye ntorobịa emeekwa ihe ngosi na paragraf nke 6.

Abụ nke 208 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 30

Abụ nke 99

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka August. Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ịjụta onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha ka e wee nwee ike ịchịkọta akụkọ ozi nile mgbe ọ na-erule September 6.

17 min: Anyị Hụrụ Ụmụnna Anyị n’Anya. Okwu onye okenye ga-ekwu, gụnyere nkwurịta okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke December 1, 1995, peji nke 15-17, paragraf nke 7-11. Mesie ike uru ndị anyị nile na-enweta mgbe anyị maara ụmụnna anyị nke ọma, na-agbarịta ibe anyị ume, ma na-enyere ibe anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa. Tụọ aro otú a pụrụ isi mee nke a ruo n’ókè ka ukwuu. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịkọ ahụmahụ ndị na-egosi otú ha si nweta ume ọhụrụ ma bụrụ ndị e wusiri ike site n’agbamume ịhụnanya ndị ọzọ nyere ha.

18 min: Kwuo Ihe Mere I Ji Nwee Olileanya I Nwere. Onye okenye agbaa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ nọ n’afọ iri na ụma na-aga akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ gọọmentị ajụjụ ọnụ bụ́ ndị bụ ezi ihe nlereanya. Mgbe nile ha na-ezute ọnọdụ ebe ndị ọgbọ ha na-achọ ịma ihe mere ndị nọ n’afọ iri na ụma so n’etiti anyị na-adịghị eji achọ isonyere ha n’ihe omume ha. Ka ha ji ohere ndị ahụ na-akọwa ihe ndị ha kwenyere na ha bụ́ ndị dabeere na Bible, ọ dị ndị ntorobịa anyị mkpa ịkwụsi ike n’ọjụjụ ha na-ajụ. Ìgwè ahụ atụlee ihe ha pụrụ ikwu ma ọ bụrụ na e nye ha ụtaba ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ. Tụleghachi arụmụka dị n’akwụkwọ Young People Ask, peji nke 277-281. Kọwaa otú ịzara ọnụ ha ná mkpebi ha ime ihe ziri ezi si bụrụ ihe nchebe ma na-agba ezi àmà.

Abụ nke 129 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya