Ònye Pụrụ Ịnakwere Ọmụmụ Bible?
1 Emọs onye amụma kwuru na a ga-enwe oké ụnwụ n’ala Israel, “ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) Maka abamuru nke ndị agụụ na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ n’ụzọ ime mmụọ, nzukọ Jehova na-ekesa ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụwa dum.
2 Ka ọ dị ugbu a, anyị ebiwo nde akwụkwọ Ihe Ọmụma 70 na nde broshuọ Na-achọ 91. Anyị na-enwe ekele maka ịdị mfe na ịdị irè nke akwụkwọ ndị a n’ịkụzi eziokwu ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ìgwè mmadụ nataworo akwụkwọ anyị esorobeghị anyị na-amụ Bible. Gịnị ka anyị pụrụ ime banyere nke a?
3 Akwụkwọ Ọ Bụla E Tinyere Pụrụ Iduje n’Ọmụmụ Ihe! Tụlee ahụmahụ nke otu onye nkwusa tụụrụ otu nwanyị aro ka ya na ya mụọ ihe n’ụbọchị mbụ ọ gwara ya okwu n’ụlọ nwanyị ahụ. Ọ nakweere ya ozugbo. Ka e mesịrị ọ gwara ya, sị, “Ị bụ onye mbụ tụtụụrụla m aro ka mụ na ya mụọ Bible.” N’ókèala unu, mmadụ ole ndị nwere akwụkwọ anyị pụrụ ikwu otu ihe ahụ? Akwụkwọ ọ bụla e tinyere na-emepe ohere ime nletaghachi na inwe ọmụmụ Bible ebe obibi.
4 Ebe anyị na-ezutekarị ndị nwerela akwụkwọ anyị, olee otú anyị pụrụ isi kpalie mmasị ha ịchọ ịmata ihe ndị dị n’akwụkwọ anyị? Otu Onyeàmà jụrụ otu onye nwe ụlọ kpọmkwem ma ò nwere ajụjụ ọ bụla dabeere na Bible, nanị ịnụ ka ọ zara, sị, “Ee e.” Nwanna nwanyị ahụ kwukwasịrị, sị, “Ị ghaghị inwe ajụjụ ụfọdụ.” Nwanyị ahụ jụrụ ajụjụ, ha malitekwara ọmụmụ ihe. Gịnị ma ị jụọ onye nwe ụlọ ma ọ̀ ga-amasị ya ịmata ihe Bible na-ekwu banyere otu ajụjụ ma ọ bụ otu ihe na-echegbu ya? Dị njikere iwelite ajụjụ na-adọrọ mmasị ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe o nwere ike icheta. Nkwurịta okwu ndị dị otú ahụ pụrụ idozi ụzọ maka ọmụmụ ihe chiri anya nke eziokwu Bible ndị bụ́ isi.
5 Ọmụmụ Bible bụ isi sekpụ ntị n’ozi anyị. Ebe anyị na-amaghị onye pụrụ ịnakwere ọmụmụ ihe, alala azụ ịtụrụ onye ọ bụla i zutere aro ka gị na ya mụọ ihe. Gwa ya Jehova n’ekpere, meekwa ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere gị. Ị pụrụ ịchọpụta n’oge na-adịghị anya na onye ị tụụrụ aro ka gị na ya mụọ ihe ga-anakwere ya!—1 Jọn 5:14, 15.