Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/99 p. 1
  • Ime Nkwusa Na-edo Anyị Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Nkwusa Na-edo Anyị Iche
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Mụta Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 11/99 p. 1

Ime Nkwusa Na-edo Anyị Iche

1 Ọtụtụ ndị na-ajụ, sị, “Gịnị mere ka Ndịàmà Jehova dị iche n’okpukpe ndị ọzọ?” Olee otú ị ga-esi zaa ya? Ị pụrụ ịkọwa ụfọdụ n’ime nkwenkwe anyị ndị dabeere na Bible. Ma ì chewokwa echiche banyere ịkọwapụta ókè ozi ihu ọha anyị na-edoru anyị iche n’okpukpe ndị ọzọ?—Mat. 24:14; 28:19, 20.

2 Taa, ọ bụ mmadụ ole na ole ji okpukpe kpọrọ ihe na-enwe mkpali isoro ndị ọzọ kerịta ihe ndị ha kweere. Ha pụrụ iche na irube isi n’iwu Siza, ibi ndụ dị ọcha, ma ọ bụ imere ndị ọzọ ihe ọma ezuwo. Otú ọ dị, ha adịghị eche na ọ bụ ibu ọrụ ha inyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe Bible na-ekwu banyere inweta nzọpụta. Olee otú anyị si dị iche?

3 Ozi anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje dị nnọọ iche n’ihe okpukpe ndị ọzọ na-eme. Ruo ihe karịrị 100 afọ, Ndịàmà nke oge a ejiriwo ịdị uchu kwusaa ozi ọma ahụ ruo nsọtụ nile nke ụwa, n’iṅomi ndị Kraịst oge mbụ. Nzube anyị ji na-eme otú ahụ bụ iji nyere ọtụtụ mmadụ aka dị ka o kwere mee ime ka ndụ ha kwekọọ n’uche Chineke.—1 Tim. 2:4; 2 Pita 3:9.

4 Olee Ụdị Aha I Nwere? À maara gị dị ka onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa Okwu Chineke? (Ọrụ 17:2, 3; 18:25) N’ihi ọrụ nkwusa gị, ndị agbata obi gị hà na-ahụ n’ụzọ pụtara ìhè ihe dị iche n’okpukpe ha na nke gị? À maara gị dị ka onye ọ na-anụ ọkụ n’obi isoro ndị ọzọ kerịta olileanya ya? Ì nwere ndokwa ikere òkè n’ozi mgbe dum? Cheta na anyị na-edo onwe anyị iche ọ bụghị nanị site n’aha anyị kamakwa site n’ime ihe aha ahụ na-akọwa—ịgba àmà banyere Jehova.—Aịsa. 43:10.

5 Ịhụnanya anyị maka Chineke na ndị agbata obi anyị na-akpali anyị ikere òkè n’ọrụ nkwusa. (Mat. 22:37-39) Ọ bụ ya mere anyị, dị ka Jisọs na ndị ozi ya, ji achọ iji ohere ọ bụla dapụtaranụ soro ndị ọzọ kerịta ozi Alaeze ahụ. Ka anyị nọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ndị chọrọ ịṅa ntị ozi ọma ahụ. Ime otú ahụ ga-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ‘ịhụ ihe dị iche n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.’—Mal. 3:18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya