Ihe Ùgwù Ụmụaka Nwere
1 Ọtụtụ ndị bụ́ nne na nna ugbu a ji obi ụtọ na-echeta ihe ùgwù ha nwere mgbe ha bụ ụmụaka na-etolite n’eziokwu—ọrụ Ụbọchị Magazin. A malitere ọrụ ahụ n’ọgbakọ nile na 1949. Mmadụ nile ga-etinye uche n’ikesa Ụlọ Nche na Teta! otu ụbọchị n’ime otu izu n’okporo ámá, site n’ụlọ ruo n’ụlọ, site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. Ụmụaka bụ́ ndị nkwusa kasị atụ anya ikere òkè n’ọrụ a n’ihi na ọ na-enye ha ohere isoro ndị meworo okenye n’ọgbakọ na-ekere òkè n’otu ọrụ ahụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị mgbe ị bụ nwata?
2 Mee Ka Ụmụ Gị Sonye: Ụmụaka dị nnọọ ntakịrị bụ́ ndị na-enweghị ike ịmalite nkwurịta okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ọnụ ụzọ, ka pụrụ inyefe magazin. Ọ chọrọ nanị ịmụ ụzọ iche ihe n’ihu dị mfe nke nwere ahịrịokwu ole na ole dị nkenke. Okwu dị nkenke, nke e kwuru ma eleghị anya banyere ihe osise dị n’ihu akwụkwọ, pụrụ izu. Ọtụtụ ndị nwe ụlọ na-adị njikere ịnata ụmụaka anyị akwụkwọ, ọtụtụ mgbe ha na-ekwu okwu dị mma banyere ime ihe n’eziokwu na àgwà ọma nke ndị ntorobịa a. Site n’obere enyemaka, ụmụaka pụrụ ije nnọọ ozi a nke ọma, na-atụnye ụtụ bara uru n’izisa ozi Alaeze ahụ. Otú ọ dị, ka ụmụaka na-eme okenye karị, ndị mụrụ ha kwesịrị inyere ha aka ịnọgide na-enwe ọganihu n’ime ka nkà ha nwere n’ịgba àmà na-adịwanye mma.
3 Manuel malitere ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ mgbe ọ dị afọ atọ. Ndị mụrụ ya kụziiri ya iburu ụzọ iche ihe n’ihu dị nkenke n’isi. O ji ịnụ ọkụ n’obi soro ha na-eme nkwusa, na-enyefe ọtụtụ magazin, broshuọ, na traktị. Ọ na-agbakwa àmà mberede. N’otu oge mgbe ndị mụrụ ya kpọ ya gaa n’ogige ntụrụndụ maka ịtụrụ ndụ, ọ malitere inyefe ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ ụfọdụ traktị. Ọ bụ ezie na ọ ka bụ nnọọ nwata, ịnụ ọkụ n’obi Manuel nwere maka ozi ahụ bụ ihe na-enye ndị mụrụ ya na ọgbakọ dum ezi agbamume.—Ilu 22:6.
4 E wepụtara Saturday nile dị ka “Ụbọchị Magazin” na 2000 Calendar of Jehovah’s Witnesses. Ndị mụrụ ụmụ, anyị na-atụ aro ka unu zụliteghachi mmasị unu nwere n’ọrụ a, na-enyere ụmụ unu aka ikerechi òkè anya ruo n’ókè o kwere mee n’ihe ùgwù ije ozi a.