Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/00 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite May 8
  • Izu Na-amalite May 15
  • Izu Na-amalite May 22
  • Izu Na-amalite May 29
  • Izu Na-amalite June 5
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 5/00 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite May 8

Abụ nke 36

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ.

20 min: “Mụrụnụ Anya.” Ntụle ajụjụ na azịza. Kọwaa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, ọ bụ ezie na anyị amaghị ụbọchị na awa ahụ.—Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1995, peji nke 20.

13 min: Gịnị Bụ Atụmatụ Ị Na-eme Banyere Oge Ezumike? Otu ezinụlọ ekwurịtaa ihe ha ga-eme n’oge ezumike ha. Ha ekwuo banyere ije nzukọ na mgbakọ nile na ịsụ ụzọ inyeaka n’otu ọnwa ma ọ bụ karịa. A pụkwara iwepụta ohere maka ileta ogige ebe a na-ekiri ihe ndị e kere eke ma ọ bụ nwee ntụrụndụ ụfọdụ ziri ezi. Ha nile ekwere na ha agaghị eleghara usoro ihe omume ha nke ọrụ ọchịchị Chineke anya.

Abụ nke 83 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 15

Abụ nke 134

13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

17 min: “Ị̀ Bụ Onye Nwere Ekele?” Okwu okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke April 15, 1999, peji nke 15-17.

15 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Na-eme Okwu Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 2000.” Odeakwụkwọ atụlee ajụjụ na azịza nke isiokwu dị n’ihe ntinye, paragraf nke 1-10. Jiri akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha gosi ihe mere o ji dị mkpa ka anyị nile gbasoo ntụziaka Society nke ọma.

Abụ nke 91 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 22

Abụ nke 125

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

20 min: Ruo ókè hà aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị iji nkwa ọlụlụ akpọrọ ihe? Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke August 15, 1999, peji nke 30-31.

15 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Na-eme Okwu Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 2000.” Okenye atụlee ajụjụ na azịza nke isiokwu dị n’ihe ntinye, paragraf nke 11-17. Mesie ike mkpa ọ dị ka onye ọ bụla mee ndokwa doro anya maka ụbọchị ezumike tupu oge eruo ka o wee nwee ike ijezu ụbọchị nile nke mgbakọ ahụ, gụnyere Friday. Jaa ụmụnna mma maka ịkwado ndokwa Society.

Abụ nke 56 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 29

Abụ nke 135

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka May. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu dị mkpirikpi nke akwụkwọ a ga-enyefe na June. Gosi otú e si atụ aro maka ọmụmụ Bible, na-eji ihe ọmụmụ nke 13 na broshuọ Na-achọ eme ihe.

15 min: “Inweta Ọṅụ n’Ozi Dị Nsọ Ị Na-eje.” Okwu. Tụlee ihe ndị kpatara anyị ji nwee ihe mere anyị ga-eji na-enwe ọṅụ n’ozi anyị.—Lee Insight, Mpịakọta nke 2, peji nke 120.

18 min: Ọgụgụ Bible nke Na-eweta Ụgwọ Ọrụ. Okwu na ihe ngosi dabeere n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 40-41, paragraf nke 6-7. Usoro nlereanya maka ịgụ Bible, bụ́ ebe isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible dabeere, bụ akụkụ nke usoro ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. (Ozi Alaeze Anyị nke December 1999 peji nke 7) Mee ka otu ezinụlọ mee ihe ngosi nke otú ezinụlọ pụrụ isiwo tụlee otu akụkụ nke ọgụgụ ihe dịịrị izu a maka ụlọ akwụkwọ ahụ. Ha ahọrọ otu isi ihe ma ọ bụ abụọ na-adọrọ mmasị ma mekwuo nnyocha ụfọdụ na Watch Tower Publications Index ma ọ bụ Insight on the Scriptures. Gosi otú a pụrụ isi mee ka ọgụgụ Bible bụrụ ihe bakwuru uru, na-akwadebe anyị nke ọma karị ‘ikwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’—2 Tim. 2:15.

Abụ nke 95 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 5

Abụ nke 37

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

15 min: “Ihe Ùgwù Ụmụaka Nwere.” Okwu na ntụle ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kọọ ahụmahụ ndị dị n’Ụlọ Nche nke December 1, 1996, peji nke 13, paragraf nke 15. Kpọọ ndị na-eto eto òkù ka ha kọọ otú ha siworo nwee ọṅụ n’ikesa magazin. Mee ka otu onye ntorobịa ma ọ bụ ndị ntorobịa abụọ mee ihe ngosi dị mfe nke ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Gbaa ndị nne na nna ume ịkpọrọ ụmụ ha mgbe ha na-aga ọrụ magazin kwa izu.

15 min: “‘Ndị A Nwaleworo’—N’ụzọ Dị Aṅaa?” Okwu okenye ga-ekwu. Tụleghachi ndokwa dị n’Akwụkwọ Nsọ maka inwe ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. (Lee Insight, Mpịakọta nke 2, peji nke 409.) Gosi iru eru ndị ha na-aghaghị inwe maka nhọpụta. (Lee akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 55-57.) Kọwapụta ụzọ dị iche iche ndị ohu na-eje ozi pụrụ isi jee ozi, ma gbaa ọtụtụ ụmụnna nwoke ume iru eru maka ihe ùgwù a.

Abụ nke 82 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya