Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/00 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 10/00 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! A pụrụ inyefe ụtụ n’ebe a chọtara mmasị ná nletaghachi. Malite n’October 16, a ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 36. November: Nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị jezuru ókèala ha site n’iji otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze nke 36 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ụlọ ọ bụla pụrụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetala ha, a pụrụ iji akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi mee ihe. December: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. January: Akwụkwọ ọ bụla nwere peeji 192 bụ́ nke e bipụtara tupu 1986 nke ọgbakọ pụrụ inwe.

◼ Society chọrọ ndị nsụgharị n’asụsụ Igbo. Onye ahụ kwesịrị ịgụwo akwụkwọ, ọ dịkarịa ala ruo afọ 12, na-enwe credit n’asụsụ Bekee na GCE ordinary level ma ọ bụ na WASC/SSCE nakwa credit n’asụsụ Igbo. Onye ọ bụla chere na ya pụrụ iru eru, nweekwa mmasị ije ozi na Betel kwesịrị ideta akwụkwọ iji gwa Society. Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị ịgụnye ihe ọmụma banyere otú ọ gụruru akwụkwọ na photocopy nke diplọma agụmakwụkwọ ya. Ndị na-etinye akwụkwọ kwesịrị ịbụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ha enweghị ụmụ, ha kwesịkwara ịbụ ndị nweere onwe ha ịnakwere ọkpụkpọ òkù ịbịa Betel.

◼ Ihe ntinye dị ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị bụ “Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2001,” e kwesịkwara idebe ya maka izo aka na ya n’ime afọ 2001 nile.

◼ Ọ bụrụ na oge nzukọ nke ọgbakọ unu ga-agbanwe na January 1, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịgwa Society banyere mgbanwe ndị ahụ site n’izite fọm Congregation Meeting Information nakwa fọm Handbill Request (S-5). Ọ bụrụ na a chọrọ ya, a pụrụ ịtụ ọda maka mpempe akwụkwọ ndị ọhụrụ n’otu fọm ahụ. E kwesịrị ịtụ ọda maka mpempe akwụkwọ ndị ahụ ọ dịkarịa ala izu asatọ tupu mgbe unu chọrọ inweta ha.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere Ugbu A:

Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?—Igbo

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?—Igbo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya