Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/00 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite October 9
  • Izu Na-amalite October 16
  • Izu Na-amalite October 23
  • Izu Na-amalite October 30
  • Izu Na-amalite November 6
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 10/00 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

IHE ỊRỊBA AMA: N’oge nile a ga-atụle ihe nkiri vidio Society ná Nzukọ Ije Ozi, anyị ga-enye isiokwu ndị ọzọ a pụrụ iji dochie ya. A pụrụ iji ndị a mee ihe n’ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa na-ekiribeghị, ebe ndị ọ pụkwara ịbụ na ha agaghị enwe ike ikiri vidio ndị ahụ tupu ụbọchị ndị ahụ e dokwara.

Izu Na-amalite October 9

Abụ nke 11

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

12 min: “Gaa Mgbakọ n’Ebe Ndị Nzukọ Jehova Họpụtara.” Ntụle ajụjụ na azịza nke okenye ga-eduzi. Gụpụta paragraf nke 5.

25 min: “Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?” Ntụle na-ekpo ọkụ nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Mgbe a gụpụtasịrị ịma ọkwa dị n’akwụkwọ ozi July 3, 2000, nke Society degaara ndị okenye, nye onye ọ bụla bịaranụ otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze nke 36. Mgbe ahụ gaa n’ihu ná ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu ahụ. Gụpụta ndokwa ọgbakọ mere iji rụzuo ókèala unu. Tụlee ụzọ isi nyere ndị ọhụrụ na ụmụntakịrị aka iru eru dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu dị nkenke. Mesie ike mkpa ọ dị ka mmadụ nile kere òkè zuru ezu ná nkesa a.

Abụ nke 53 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 16

Abụ nke 104

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa na n’ọrụ ngwụsị izu, a ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! tinyere Akụkọ Alaeze nke 36.

15 min: “Ngwá Ọrụ Ndị Na-akụzi Ihe, Na-enye Nkwali, Ma Na-ewusi Ike.” (Nanị paragraf nke 1 na nke 2) Okwu. Tụleghachi ná mkpirikpi akụkọ nke otú Society si malite imepụta vidio. (Lee akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 600-601.) Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name iji kwadebe maka ntụle ya ná Nzukọ Ije Ozi nke izu October 30. Ndị nwere vidio ahụ pụrụ ịgbazinye ndị ọzọ na-enweghị ya ma ọ bụ ikekwe ha pụrụ ikirikọta ya ọnụ. MA Ọ BỤ “Na-ekwuzi Okwu nke Eziokwu Ahụ.” Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke January 1, 1996, peeji nke 29-31.

20 min: Anyị Nile Pụrụ Igosi Mmụọ Ọsụ Ụzọ. Nkwurịta okwu dị n’etiti onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ na onye na-enyere ya aka, bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke October 15, 1997, peeji nke 22-23. Tụlee ihe mere ọ ga-eji dị mma inwekwu ndị ọsụ ụzọ n’ọgbakọ na otú mmadụ nile pụrụ isi tụnye ụtụ n’iru ihe mgbaru ọsọ a. Tụleekwa ụzọ ndị a pụrụ isi gbaa ndị na-asụ ụzọ ugbu a ume ịga n’ihu na otú mmadụ nile nọ n’ọgbakọ pụrụ isi wulite ịnụ ọkụ n’obi maka ozi.

Abụ nke 131 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 23

Abụ nke 150

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Rite Uru n’Usoro Izi Ihe Jehova.” Okwu. Gụnye agbamume ka mmadụ nile na-agachi nzukọ ise ọgbakọ na-enwe kwa izu anya.

20 min: Kwadebe nke Ọma Maka Nzukọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Uru anyị na-erite ná nzukọ na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ókè mgbalị anyị tinyere n’ịkwadebe hà. Tụlee aro ndị bara uru a tụrụ n’Ụlọ Nche nke March 1, 1998, peeji nke 15-16, paragraf nke 8-11. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kwuo okwu ndị na-egosi otú ha si azụlite mkpali dị mkpa ma na-ewepụta oge a chọrọ iji kwadebe nke ọma.

Abụ nke 211 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 30

Abụ nke 167

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa nile inye akụkọ ozi ubi maka October.

12 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’Inyefe Akụkọ Alaeze nke 36. Kpọọ ndị nkwusa dị iche iche ka ha kọọ ihe ndị dị mma ha rụpụtaworo n’ikesa Akụkọ Alaeze nke 36. Kpọọ ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke inyeaka ka ha kwupụta ekele ha nwere maka ọrụ mụbara amụba e nwere n’oge nkesa ahụ na ohere ha nwere isoro ndị nkwusa dị iche iche rụkọọ ọrụ.

25 min: Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Tụlee ajụjụ ndị dị na paragraf nke 3 nke “Ngwá Ọrụ Ndị Na-akụzi Ihe, Na-enye Nkwali, Ma Na-ewusi Ike.” Tụọ aro dị iche iche otú a pụrụ isi jiri vidio ahụ nyere ndị nwere mmasị aka ịmara nzukọ anyị nke ọma. Kọọ otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ.—Lee Ụlọ Nche nke October 1, 1992, peeji nke 30-31. MA Ọ BỤ “Nkasi Obi na Agbamume—Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Nke Nwere Ọtụtụ Akụkụ.” Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996, peeji nke 21-23.

Abụ nke 15 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 6

Abụ nke 198

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ihe ịga nke ọma e nweworo n’ikesa Akụkọ Alaeze nke 36. Kọọ ókèala ole unu rụworo na ihe ga-adị mkpa ka e mee iji rụzuo ha mgbe ọ na-erule November 17.

20 min: Gịnị Ka Anyị Kweere? Otu nwanna nwoke agaa nletaghachi na nke onye jụrụ sị, “Gịnị ka Ndịàmà Jehova na-akụzi nke mere ka ha dị iche n’okpukpe ndị ọzọ?” Tụlee isi ihe ndị a kọwara n’igbe dị na peeji nke 6 n’Ụlọ Nche October 1, 1998. Kọwaa otú okpukpe ndị ọzọ si eleghara eziokwu ndị bụ́ isi nke Bible anya ma ọ bụ na-ajụ ha ma na-ahọrọ ozizi mmadụ.

10 min: Ịbụ Abụ—Akụkụ Dị Mkpa nke Ofufe Anyị. Onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ esoro ndị nkwusa abụọ kparịta ụka banyere otú ha si abụ abụ ná nzukọ. Ọ chọpụtawo na o yiri ka ha adịghịzi etinye ume n’ịbụ abụ. O soro ha kwurịta isi ihe ụfọdụ sitere n’Ụlọ Nche nke February 1, 1997, peeji nke 27-28. Ha atụlee okwu ndị dị n’otu n’ime abụ ndị a ga-abụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche n’izu a, dị ka a tụrụ aro ya n’Ụlọ Nche nke July 1, 1999, peeji nke 20, paragraf nke 12. Site n’iji ịbụ abụ kpọrọ ihe, anyị na-etinye ume n’igosipụta otuto sitere n’obi nye Jehova.

Abụ nke 223 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya