Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/00 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 11/00 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na November: Nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị jezuru ókèala ha site n’iji otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze nke 36 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ụlọ ọ bụla pụrụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetala ha, a pụrụ iji akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi mee ihe. December: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. January: Akwụkwọ ọ bụla nwere peeji dị 192 bụ́ nke e bipụtara tupu 1986 nke ọgbakọ pụrụ inwe. February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla nwere peeji dị 192 nke meworo ochie karị nke ọgbakọ pụrụ inwe.

◼ Mgbe nkesa nke Akụkọ Alaeze gasịrị, ọgbakọ ndị ka nwere Akụkọ Alaeze nke 36 pụrụ ịgba ndị nkwusa ume inyefe ha dị ka ha si enyefe traktị—ma site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ma n’ebe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, ndị nkwusa pụrụ idebere onye ọ bụla na-anọghị n’ụlọ otu, na-ejide n’aka na onye na-agafe agafe agaghị ahụ ya. E kwesịrị ime mgbalị ikesa ndị nile fọdụrụnụ n’ozi a dị mkpa.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ Obi dị anyị ụtọ inwe ndị ọbịa na-abịa nleta ngagharị na Betel malite na Monday ruo Saturday. Malite ugbu a gaa n’ihu, anyị na-arịọ ka ihe ruru ìgwè mmadụ 20 ma ọ bụ karịa bụ́ ndị na-eme atụmatụ ịbịa leta ihe owuwu Society dị n’Igieduma deere anyị akwụkwọ tupu ha abịa. Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị ikwu ụbọchị ìgwè ahụ ga-abịa nleta, ọnụ ọgụgụ na-abịanụ nakwa ma e nwere ndị agadi na ndị na-adịghị ike ndị na-apụghị ịga ije. Nleta ngagharị ahụ na-ewe ihe dị ka awa abụọ ya mere anyị na-agba unu ume ime atụmatụ ịbịarute n’oge ka unu wee mee nleta dị mma ma nweekwa ike ịla ụbọchị ahụ. Biko jidenụ n’aka na ụgbọala unu na-eme atụmatụ iji bịa dị mma ka unu wee nwee ike ịbịa ma laakwa n’enweghị nsogbu ọ bụla n’otu ụbọchị ahụ. E kwesịrị idekwasị ATTENTION: BETHEL OFFICE n’elu akwụkwọ ozi nile banyere ime nleta ngagharị. Ọ bụrụ na unu pụrụ inweta telifon, unu pụkwara iji telifon kọwaara anyị ihe ndị ahụ e kwuru n’elu ọ dịkarịa ala ụbọchị abụọ tupu unu abịa.

◼ Malite n’izu February 5, 2001, a ga-amụ akwụkwọ bụ́ Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya