Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite November 13
Abụ nke 4
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kọwapụta ndokwa ije ozi ubi pụrụ iche ndị e mere maka November 23.
13 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ga-ekwu.
22 min: “Ịzụlite Mmasị nke Akụkọ Alaeze nke 36 Kpaliri.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 1-5. Kọwapụta ndokwa ndị ọgbakọ mere maka ịrụzu ókèala ọ bụla a na-arụbeghị ọrụ na ya. Tụlee ụzọ iche n’ihu ndị dị na paragraf nke 7 na nke 8 maka ịga nletaghachi, meekwa ka e jiri nke ọ bụla n’ime ha mee ihe ngosi. Mesie ike mkpa ọ dị isochi mmasị nile na ịgbalị ịmalite ọmụmụ Bible. Mechie site n’ịtụle paragraf nke 9 na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.
Abụ nke 63 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 20
Abụ nke 111
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Ahụmahụ Ndị E Nwere n’Ikesa Akụkọ Alaeze nke 36. Kọọ ihe ịga nke ọma e nwere n’ịrụzu ókèala unu. Ọ̀ dị onye nọ n’ọgbakọ keere òkè nke mbụ ya n’ozi? Kwuo ihe ndị dị mma ndị nwe ụlọ kwuru. Ụfọdụ ndị nkwusa, hà nwere ike ịmalite ọmụmụ Bible? Ọ bụrụ otú ahụ, gwa ha ka ha kọwaa ma ọ bụ mee ihe ngosi nke otú ha si mee ya. Chetara mmadụ nile ịzụlite mmasị a chọtara.
20 min: “Nọgide Na-eme Nkwusa!” Okwu na ajụjụ ọnụ. Ụfọdụ anọwo ná nzukọ Jehova ma nọgide n’ọrụ nkwusa ná ndụ ha nile. Site n’inwe àgwà ziri ezi, ha enwetawo ọṅụ n’ime otú ahụ. (Lee akwụkwọ Ihe Ọmụma, peeji nke 179, paragraf nke 20, na Ụlọ Nche nke May 1, 1992, peeji nke 21-22, paragraf nke 14-15.) Kpọọ otu onye nkwusa, bụ́ onye nọworo na-ejechi ozi anya ruo ọtụtụ afọ ka ọ kọọ ihe ndị mere o jiworo nọgide n’ọrụ nkwusa.
Abụ nke 141 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 27
Abụ nke 153
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa inye akụkọ ozi ubi ha maka November. Akwụkwọ a ga-enyefe na December bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma.
15 min: Jiri Akwụkwọ Reasoning Mee Ihe nke Ọma. Ntụle ajụjụ na azịza nke peeji nke 7-8. Gosi otú e si kwadebe akwụkwọ a iji nyere anyị aka ịkwadebe maka ikere òkè n’ozi n’ụzọ dị irè karị. Kọwaa otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ ahụ mee ihe mgbe e ji telifon na-agba àmà. Mee ihe ngosi nke otú e si achọta ihe ọmụma pụrụ inye aka iji zaa ajụjụ. Gbaa mmadụ nile ume ịmara akwụkwọ a nke ọma, itinye ya n’akpa ozi ọma ha, na iji ya na-eme ihe mgbe nile n’ozi.
20 min: “Zere Agbụ nke Omenala Ndị Na-ekwesịghị Ndị Kraịst.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 1-9 nke ihe ntinye. Ọ bụ okenye ga-eme ya.
Abụ nke 175 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 4
Abụ nke 54
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Zere Agbụ nke Omenala Ndị Na-ekwesịghị Ndị Kraịst.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 10-21. Ọ bụ okenye ga-eme ya.
20 min: “Okwu E Kwuru na Mgbe Kwesịrị Ya.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ihe ngosi. Ọtụtụ ndị na-eche na ha erughị eru mgbe ha na-agbalị ịmalite mkparịta ụka, na-eche n’ụzọ na-ezighị ezi na ụdị nkà pụrụ iche dị ha mkpa iji rụpụta ihe. Kọwaa otú anyị nile, gụnyere ndị ọhụrụ na ndị nkwusa ka na-eto eto, pụrụ isi malite nkwurịta okwu site n’itinye mgbalị kwesịrị ekwesị. Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha, na-eme ka ịdị mfe ha pụta ìhè, meekwa ka ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ jiri ha mee ihe ngosi. Zoo aka n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1998, peeji nke 8, maka inwetakwu ụzọ iche ihe n’ihu ndị a pụrụ iji mee ihe. Gbaa mmadụ nile ume inwe àgwà ziri ezi ka ha wee nwetakwuo ọṅụ n’ozi ha.
Abụ nke 218 na ekpere mmechi.