Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke September 4 ruo December 18, 2000. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Devid gbochiri Abishaị igbu Shimaị n’ihi na ebubo Shimaị boro Devid bụ eziokwu. (2 Sam. 16:5-13) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99-E 5/1 p. 32 para. 3.]
2. Akọ na uche dị ọcha, nke a zụrụ nke ọma adịghị eduje nanị ná mmekọrịta onwe onye na-ekpo ọkụ nke anyị na Chineke, kamakwa ọ dị mkpa maka nzọpụta anyị. (Hib. 10:22; 1 Pita 1:15, 16) [w98 9/1 p. 4 para. 4]
3. Ọ gaghị ekwe omume ịghọtazu Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ọ gwụla ma anyị maara Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. [w85 6/1 p. 27 para. 4]
4. A pụrụ iji Ọchịchị Puku Afọ Jisọs tụnyere afọ 40 nke ọchịchị udo na ọganihu Solomọn. (1 Eze 4:24, 25, 29) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 6/1 p. 6 para. 5.]
5. Olili dị mma e liri Abaịja bụ ihe àmà doro anya na ọ bụ onye na-efe Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi, nanị ya n’ụlọ Jeroboam. (1 Eze 14:10, 13) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 4/1 p. 12 para. 11.]
6. Ịbụ onye e mere baptism ndị Kraịst na-egosi na mmadụ aghọwo ohu tozuru okè nke Chineke. [w98 10/1 p. 28 para. 2]
7. Jehova mere ka Elaịja nwee obi ike karịrị nke mmadụ, meekwa ya ka ọ ghara ịtụ egwu. (1 Eze 18:17, 18, 21, 40, 46) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 1/1 p. 31 para. 2.]
8. Eze nwanyị Sheba mere ogologo njem gaa Jerusalem nanị iji hụ akụ̀ na ụba Solomọn. [w85 6/1 p. 29 para. 2-4]
9. N’ụzọ doro anya, ikpu ìsì dakwasịrị usuu ndị agha Siria n’okwu ọnụ Elaịsha bụ ikpu ìsì nke uche ebe ọ bụ na ha pụrụ ịhụ Elaịsha ma ha apụghị ịmata onye ọ bụ. (2 Eze 6:18, 19) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 70-71 para. 10.]
10. Ịtụkwasị ‘Ihe Àmà ahụ,’ bụ́ nke a kpọtụrụ uche na ya ná 2 Ndị Eze 11:12, bụ ihe atụ na-egosi na nkọwa eze ahụ nyere Iwu Chineke enweghị mgbagha, e kwesịkwara irube isi na ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 2/1 p. 31 para. 6.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. N’ikwekọ na 1 Jọn 2:15-17, gịnị ka ndị nne na nna na-asọpụrụ Chineke kwesịrị ịgba ụmụ ha ume izere mgbe ha na-eduzi ha ịhọrọ ọrụ ego kwesịrị ekwesị? [w98 7/15 p. 5 para. 3]
12. Gịnị ka ihe e kwuru na 2 Samuel 18:8 pụtara, bụ́ nke na-asị: “Oké ọhịa ahụ wee ripịa ọtụtụ mmadụ n’etiti ndị Israel n’ụbọchị ahụ karịa ndị mma agha ripịara”? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 3/15 p. 31 para. 2.]
13. Ole ndị taa ka a pụrụ iji tụnyere ndị ikwu Golaịat, bụ́ ndị Refaim, oleekwa ihe ha na-agbalị ime? (2 Sam. 21:15-22) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 1/1 p. 20 para. 8.]
14. Olee ndị kwesịrị irite uru karị site n’ụkpụrụ nrubeisi nke Bible bụ́ nke dị na 1 Samuel 15:22, 23? [w85 1/15 p. 22 para. 5]
15. Ụkpụrụ dị aṅaa dị mkpa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere nwoke ahụ e gburu n’ihi imebi iwu Ụbọchị Izu Ike? (Ọgụ. 15:35) [w98 9/1 p. 20 para. 2]
16. Site n’ime gịnị ka anyị pụrụ iṅomi eze nwanyị Sheba, bụ́ onye mere ogologo njem iji nụrụ “amamihe nile nke Solomọn”? (1 Eze 10:1-9) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 7/1 p. 31 para. 1-2.]
17. Dị ka 1 Ndị Eze 17:3, 4, 7-9, 17-24 si kwuo, n’ụzọ atọ dị aṅaa ka Elaịja si gosipụta okwukwe na Jehova? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 4/1 p. 19 para. 5.]
18. N’ihi gịnị ka ọjụjụ Nebọt jụrụ inyefe Ehab ubi vine ya na-ejighị nnọọ bụrụ ya ime isi ike? (1 Eze 21:2, 3) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 8/1 p. 13 para. 18.]
19. Olee otú okwu ndị dị ná 2 Ndị Eze 6:16 si bụrụ ihe agbamume nye ndị ohu Jehova taa? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 6/15 p. 18 para. 5.]
20. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst taa kwesịrị isi nọrọ na nche megide iji ego azụrụ ọkwá? [w98 11/15 p. 28 para. 5]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Ezi onye Kraịst agaghị ekwe ka __________________________ merie ya wee kere òkè n’omenala ndị na-adịghị amasị __________________________. (Ilu 29:25; Mat. 10:28) [w98 7/15 p. 20 para. 5]
22. N’ịgba àmà n’ihu Eze Agrịpa, Pọl jiri __________________________ mee ihe, na-emesi isi ihe ndị ya na Agrịpa __________________________ ike. (Ọrụ 26:2, 3, 26, 27) [w98 9/1 p. 31 para. 3]
23. N’ihi na Chineke bụ onye __________________________, ụfọdụ pụrụ iche na ọ bụghị onye, ma inwechi __________________________ anya nakwa n’ụzọ sara mbara ga-enyere mmadụ aka ‘ịhụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya.’ (Hib. 11:27) [w98 9/15 p. 21 para. 3-4]
24. Dị ka a hụrụ n’ihe banyere ọchịagha Siria bụ́ __________________________, mgbe ụfọdụ a na-enweta abamuru dị ukwuu site nanị ná ntakịrị __________________________. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 2/1 p. 3 para. 6–p. 4 para. 1.]
25. Dị ka obi Jehonadab dịnyeere Eze Jihu, __________________________ ahụ taa ji obi ha nile nakwere ma na-akwado Jihu ahụ Ka Ukwuu, bụ́ __________________________, bụ́ onye __________________________ nọchitere anya ya n’elu ala. (2 Eze 10:15, 16) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 1/1 p. 13 para. 5-6.]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Ọ bụ (Setan; Jehova; Joab) kpaliri Devid ime mmehie site ‘n’ịgụ ndị Israel ọnụ.’ (2 Sam. 24:1) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 7/15 p. 5 para. 2.]
27. N’ikwekọ n’ihe dị ná 1 Ndị Eze 8:1 na Eklisiastis 1:1, Solomọn kpọkọtara ndị mmadụ (iwu ụlọ nsọ ahụ; ịchụso ndị iro ndị Israel; ife Jehova). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 112 para. 3.]
28. E ji afọ 20 Solomọn jiri wuo ụlọ nsọ ahụ na ụlọ ya dị na Jerusalem tụnyere oge e nwere nhazigharị n’ihe banyere ozizi na otú nzukọ a si arụ ọrụ bụ́ nke malitere na (1919; 1923; 1931) ma gwụsịa na (1938; 1942; 1950). (1 Eze 9:10) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 3/1 p. 20 igbe.]
29. Okwu ahụ bụ́ “eluigwe” dị ka e si jiri ya mee ihe ná 2 Ndị Eze 2:11 na-ezo aka (n’ebe obibi ime mmụọ nke Chineke; n’eluigwe na ala nkịtị; na mbara ikuku ụwa bụ́ ebe nnụnụ na ifufe na-efe). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 9/15 p. 15 igbe.]
30. Ọ bụ (Herọd Onye Ukwu; Siza Ọgọstọs; Taịbiriọs Siza) nyere iwu ịgụ ọnụ nke dujere n’ịmụ Jisọs na Betlehem kama ịbụ na Nazaret. [w98 12/15 p. 7 igbe]
Jikọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Abụ Ọma 15:4; 2 Sam. 12:28; 2 Sam. 15:18-22; 2 Eze 3:11; Kọl. 3:13
31. E kwesịrị ịkwanyere ịbụisi ná ndokwa ọchịchị Chineke nke Jehova mere ùgwù. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 63 para. 30]
32. A ghaghị ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova na ndị nnọchianya ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee si-E p. 63 para. 30]
33. Inwe ekele maka ebere Jehova pụrụ ịkpali mmadụ igosipụta njide onwe onye ma kpuchie adịghị ike. [w98 11/1 p. 6 para. 3]
34. Ọ bụ ihe ùgwù ile ọbịa na iji obi umeala na-ejere ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nọ n’ozi pụrụ iche ozi. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 11/1 p. 31 para. 1.]
35. Onye na-atụ egwu Chineke na-eme ike ya nile imezu okwu ya ịkwụ ụgwọ o ji, ọbụna ma ọ bụrụ na ọnọdụ ndị dapụtaranụ esie ike karịa ka ọ tụrụ anya ya. [w98 11/15 p. 27 para. 1]