Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January: Akwụkwọ ọ bụla nwere peeji dị 192 bụ́ nke e bipụtara tupu 1986 nke ọgbakọ pụrụ inwe. February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla mere ochie karị bụ́ nke nwere peeji dị 192 nke ọgbakọ nwere. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị mgbe a gara nletaghachi, a pụrụ inyefe ụtụ. Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ, na-eburu n’obi ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
◼ Society na-achọ ndị injinịa ruru eru, ndị quantity surveyor, na ndị na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ bụ́ ndị nwere ahụmahụ n’iwu ihe. Onye ọ bụla nke chere na ya ruru eru, nke nwekwara mmasị ije ozi na Betel, kwesịrị ideta akwụkwọ iji gwa Society. Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị ịgụnye ihe ọmụma banyere otú ọ gụruru akwụkwọ nakwa asambodo ndị o nwere. Ndị na-etinye akwụkwọ kwesịrị ịbụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ha enweghị ụmụ ha na-azụ, ha kwesịkwara ịbụ ndị nweere onwe ha ịnakwere ọkpụkpọ òkù ịbịa Betel. Ndị na-enwereghị onwe ha ịnakwere ọkpụkpọ òkù ije ozi na Betel ma dịrị njikere iwepụta onwe ha dị ka ndị ọrụ afọ ofufo ruo mkpirikpi oge ma ọ bụ ịdị na-enye aka mgbe ụfọdụ kwesịkwara ideta akwụkwọ iji gwa Society otú ahụ.
◼ Biko rịbanụ ama na Ememe Ncheta nke 2002 ga-abụ na Thursday, March 28, mgbe anyanwụ dasịrị, ọ bụghịkwa na Friday, March 22, dị ka e gosiri ná ngwụcha kalenda 2001. A na-ama ọkwa a tupu oge eruo ka ụmụnna nwee ike ime ndokwa ma ọ bụ nkwekọrịta ndị dị mkpa maka iji ụlọ nzukọ ndị e nwere mee ihe mgbe e nwere ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ya abụrụkwa na a ghaghị ịchọta ihe owuwu ọzọ. Ndị okenye kwesịrị iso ndị na-elekọta ebe ndị ahụ nwee nkwekọrịta, na-ejide n’aka na a gaghị enwe ime mkpọtụ site n’ihe omume ndị ọzọ n’ihe owuwu ahụ ka e wee mee Ememe Ncheta ahụ n’udo na n’usoro. N’ihi ịdị mkpa nke ememe ahụ, n’ịhọpụta onye ga-ekwu okwu Ememe Ncheta, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eruo kama nanị ịdị na-eme onye mee ibe ya emee ma ọ bụ ịdị na-eji otu nwanna eme ihe kwa afọ. Nke a agaghị adị otú a ma ọ bụrụ na e nwere okenye ruru eru, onye bụ́ otu n’ime ndị e tere mmanụ, nke pụrụ ikwu okwu ahụ.
◼ Ndị nkwusa nile e mere baptism nọ ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke January 8 pụrụ inweta kaadị Advance Medical Directive/Release nakwa Identity Card maka ụmụ ha.
◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 4, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Ụbọchị Ikpe—Oge Ịtụ Egwu Ka Ọ̀ Bụ Oge Inwe Olileanya?”
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị maka ime Ememe Ncheta nke afọ a na Sunday, April 8, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya ndị ahụ ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Meenụ nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ebe ọ na-adịghị nzukọ ọzọ a ga-enwe n’ụbọchị ahụ ma e wezụga nzukọ maka ozi ubi, e kwesịrị ime nhazigharị ndị kwesịrị ekwesị ka e duzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’oge ọzọ. Ọ ga-adị mkpa ka ndị nlekọta sekit megharịa usoro ihe omume ha maka nzukọ n’izu ahụ dị ka ọnọdụ ọgbakọ si dị. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị ga-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala mgbe e mesịrị ihe omume tupu a malite ihe omume ọzọ ka mmadụ nile wee nwee ike irite uru zuru ezu n’ememe ahụ, na-enye ohere maka ikele ndị ọbịa na ịgba ndị ọhụrụ nwere mmasị ume. E kwesịkwara ichebara ọnọdụ ngagharị na ndọwa nke ụgbọala echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 2001 na Sunday, April 1. Isiokwu ya ga-abụ “Ònye Ka A Pụrụ Ịzọpụta?” A ga-enye ihe ndepụta okwu. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit, mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke April 9. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu April 1, 2001.
◼ Mbipụta nke a nke Ozi Alaeze Anyị bu usoro dum maka ọmụmụ nke akwụkwọ bụ́ Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya. Ị pụrụ ịchọ ime ya photocopy ma tinye ya n’ime akwụkwọ gị maka izo aka na ya ngwa ngwa.