Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite January 8
Abụ nke 29
7 min: Ịma ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
13 min: “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu.”a Gụnye ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke June 1, 1997, peeji nke 14-15, paragraf nke 12-13. Gbaa mmadụ nile ume iji ohere ọ bụla na-agba àmà.
25 min: Ndokwa Ịhụnanya E Mere Maka Nlekọta Ahụ Ike Anyị. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu. Mesie ya ike na a na-enweta ihe nchebe kasị mma a pụrụ inweta nke iwu kwadoro iji gbochie mmịnye ọbara a na-achọghị site n’idejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release. Zoo aka n’akwụkwọ ozi anyị nke February 1, 1995, nye ọgbakọ nile. Mesie ike mkpa ọ dị anyị ịdị na-eji kaadị Advance Medical Directive/Release mgbe nile. Gụpụta ma kọwaa paragraf nke 1 na nke 2. A ga-eme ka ndị nkwusa e mere baptism nweta kaadị a ma a gbasasịa nzukọ n’uhuruchi a, ma e KWESỊGHỊ idejupụta ya n’uhuruchi a. Ọgbakọ kwesịrị inwe ọnụ ọgụgụ kaadị ga-ezunụ maka nkesa. A ga-abịanye aka, gbaa akaebe, ma denye akara ụbọchị n’ime kaadị ahụ mgbe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ gasịrị, site n’enyemaka nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ, n’ebe ọ dị mkpa. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị ịhụ n’ezie mgbe onye ahụ na-abịanye aka na ya. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ijide n’aka na ndị nile e kenyere n’ìgwè ha nwetara enyemaka dị ha mkpa iji dejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release ahụ. Ndị mụrụ ụmụ ga-enweta Identity Card maka ụmụaka mgbe a gbasara nzukọ a. Ndị nkwusa a na-emebeghị baptism pụrụ idejupụta ntụziaka nke ha na nke ụmụ ha site n’ime ka okwu sitere na kaadị ndị a kwekọọ n’ọnọdụ ha na n’ihe ha kwenyere.
Abụ nke 1 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 15
Abụ nke 51
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: Ùnu Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị? Okwu na ajụjụ ọnụ. Tụlee Ụlọ Nche nke December 15, 1996, peeji nke 17-18, paragraf nke 12-14, na-eme ka amamihe dị n’ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị dị ka ezinụlọ pụta ìhè. Gbaa ndị òtù ezinụlọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị onye nke ọ bụla n’ime ha ga-echeta ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke e nwere n’oge na-adịbeghị anya bụ́ nke mesịrị baa uru karịsịa, kwuokwa ihe mere o ji baa uru. Mesie ya ike na nke a kwesịrị ịbụ akụkụ nke usoro ọmụmụ ihe ezinụlọ a na-enwe mgbe nile nke a haziri iji wusie ezinụlọ anyị dị iche iche ike ma mee ka ezinụlọ na-arụsi ọrụ ike n’ozi.
Abụ nke 67 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 22
Abụ nke 90
7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
18 min: Ụzọ Isi Kwadebe Okwu Mmeghe. Okwu na ihe ngosi. Tụleghachi isi ihe ndị dị n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 2. Gosi otú anyị pụrụ isi họrọ okwu mmeghe ndị kasị kwekọọ n’ụzọ anyị si ekwu okwu, ụdị onye anyị bụ, na ókèala anyị. Tụlee ihe atụ ụfọdụ nke okwu mmeghe ndị a pụrụ iji ha na broshuọ Na-achọ mee ihe, meekwa ihe ngosi nke otu ma ọ bụ abụọ n’ime ha. (Lee Ozi Alaeze Anyị nke April 1997, peeji nke 8.) Gbaa onye ọ bụla ume iji aro ndị a tụrụ n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible nakwa n’Ozi Alaeze Anyị na-eme ihe nke ọma n’ọrụ ozi ubi ha.
20 min: “Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma.” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Tụlee isi ihe ndị sitere n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peeji nke 32, paragraf nke 15-17. Ụzọ kasị mma isi chọpụta otú anyị si ege ntị bụ ókè ihe anyị na-echeta ha. Gwa ndị na-ege ntị ka ha chetaghachi isi ihe ụfọdụ pụtara ìhè ndị mere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’uhuruchi a kọwara.
Abụ nke 96 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 29
Abụ nke 139
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka January. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na February, na-eme ka a mara akwụkwọ ndị ọgbakọ nwere.
15 min: Mara Onye Okike nke Ọma Karị. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke June 15, 1999, peeji nke 24-26.
20 min: “Ndị Nne na Nna—Kụnyenụ Ezi Àgwà n’Ime Ụmụ Unu.” Okwu na ajụjụ ọnụ a ga-agba ndị nne na nna bụ́ ndị ụmụ ha na-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Ndị nne na nna ahụ echetaghachi ihe ndị dị mma ha meworo iji mee ka ụmụ ha na-ekere òkè n’ozi ubi. Dị ka oge nyere ohere ya, gụnye aro ndị sitere n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 55-59.
Abụ nke 149 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 5
Abụ nke 168
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Bụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Eme Ihe.”b Gosi ihe na-eme ka anyị nwekwuo ọṅụ n’ozi Chineke, dị ka e depụtara ya n’akwụkwọ Insight, Mpịakọta nke 2, peeji nke 120, paragraf nke 6-8.
20 min: Ị Pụrụ Inweta Ntụrụndụ Dị Mma. Otu ìgwè ezinụlọ ekwurịta ndụmọdụ e nyere na Teta! nke June 8, 1997. Nna na-enwe nchegbu banyere ntụrụndụ nke ezinụlọ ya na-ekere òkè na ya. Mgbe ha tụlesịworo ná mkpirikpi “Gịnị Meworo Ntụrụndụ?” (peeji nke 12-15), ha elekwasị anya n’ụdị ntụrụndụ ndị pụrụ ịdị mma ma baa uru. Tụlee ihe dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 131-132, n’isiokwu nta bụ́ “Ntụrụndụ,” nakwa peeji nke 135-136, n’isiokwu nta bụ́ “Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto.” Kwusie okwu ike n’ọrụ ndị mụrụ ụmụ nwere isetịpụ ihe nlereanya nakwa mkpa ọ dị ka ndị òtù ezinụlọ na-emekọ ihe ọnụ maka abamuru nke ezinụlọ dum.
Abụ nke 190 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.