Ibu Ụzọ Mee Atụmatụ—Maka Gịnị?
1 Anyị nile na-echebatụrụ atụmatụ anyị maka ọdịnihu echiche. Ndị nwere olileanya ibi n’elu ala na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. Ma e nwere mmetụta ndị pụrụ ịnapụ mmadụ olileanya ahụ dị ya n’obi. A chọrọ mgbalị siri ike ka anyị wee nọgide na-eme ka ndụ anyị na-ehiwe isi n’ọdịmma Alaeze ahụ ma ghara ịbụ ndị agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ ndị na-adọrọ adọrọ dọpụrụ uche ha.—1 Jọn 2:15-17.
2 Ụwa apụghị nnọọ ịghọta ọchịchọ nke ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. (1 Kọr. 2:14) Ka ndị ọzọ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-adọlị ịbụ ndị a ma ama, inweta ịchịisi ma ọ bụ akụ̀ na ụba, anyị na-achụsosi akụ̀ ime mmụọ ike. (Mat. 6:19-21) Ọ bụrụ na anyị anwaa ime ka echiche anyị kwekọọ n’ụzọ ụwa si na-ele ọdịnihu anya, ọ̀ dị mgbe anyị ga-eru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anyị? N’oge na-adịghị anya, ihe nke ụwa ga-erikpu obi anyị. Olee otú anyị pụrụ isi gbochie nke a?
3 “Yikwasịnụ Onyenwe Anyị Jisọs Kraịst”: Otu ụzọ isi chọpụta ma ànyị na-eme ka ọdịnihu anyị na-ehiwe isi n’ọdịmma Alaeze bụ inyocha mkparịta ụka anyị. Ànyị na-ekwu mgbe nile banyere ihe onwunwe na ọdịmma nke ụwa? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị aghaghị ịtụle ma obi anyị ọ̀ malitewo ileghara ihe ime mmụọ anya. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa itinyekwu uche ‘n’iyikwasị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst karịa n’ibu ụzọ na-eche maka agụụ anụ ahụ.’—Rom 13:14.
4 Ndị ntorobịa pụrụ ‘iyikwasị Kraịst’ site n’ibu ụzọ mee atụmatụ maka mgbe ha ga-abanye n’ozi oge nile. Otu nwa okorobịa nke chọrọ ịsụ ụzọ oge nile bụ onye a zụlitere n’ebe ọ bụ omenala ka ụmụ okorobịa bụrụ aka ji akụ̀. N’ihi ya, o mikpuru onwe ya nke ukwuu n’ịchụ ego nke na ọ na-agazi nzukọ ma na-ekere òkè n’ozi nanị iji mezuo iwu. Ozugbo ọ malitere ịtụkwasị obi n’okwu Jisọs dị na Matiu 6:33 ma si n’agbụ ahụ ọ nọ n’ime ya pụta, ọ malitere ọrụ nke ozi oge nile. Ugbu a, o ji ezi akọ na uche na-ejere Jehova ozi, dị ka o kwuru, ‘ruo otú ike ya haruru.’
5 Bible na-ekwu na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime atụmatụ maka ọdịnihu. (Ilu 21:5) Ka anyị nile mee otú ahụ na-eburu ihe Chineke na-achọ n’uche dị ka ihe mbụ.—Efe. 5:15-17.