Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite April 9
Abụ nke 93
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Maa ọkwa ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta n’ọgbakọ unu. Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu ekele nke ndị bịara na nke mbụ ha kwuru. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ The Bible—Its Power in Your Life iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu April 23.
30 min: “Ndokwa Ikesa Akwụkwọ Anyị nke E Mere Ka Ọ Dị Mfe.” Okenye ruru eru esoro ndị na-ege ntị tụlee isiokwu ahụ. Zoo aka n’akwụkwọ ozi anyị nke September 21, 1999, nye ọgbakọ nile. Mezie ka onye nkwusa nwere ahụmahụ, nke kwadebere nke ọma mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi jiri ihe ọmụma sitere n’okwu ahụ mee ihe n’ozi ubi. N’iji magazin kasị ọhụrụ a ga-enyefe n’ozi ubi ná ngwụsị izu a mee ihe, onye nkwusa esoro onye nwe ụlọ nwee mkparịta ụka n’ihe e kwuru n’otu isiokwu. Ka onye nkwusa na-adọrọ uche ya gaa n’otu isi ihe kpọmkwem nke dị na magazin ahụ, onye nwe ụlọ ekwuo, sị: “Nke ahụ dị ka ọ̀ na-akpali mmasị.” Onye nkwusa ekwuo, sị: “Obi ga-adị m ụtọ ịhapụrụ gị magazin a ka i wee nwee ike ịgụ isiokwu a tinyere ndị ọzọ nile dị na magazin a.” Onye nwe ụlọ ajụọ, sị: “Ọ̀ bụ ego ole?” Onye nkwusa azaghachi, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-agụ ya, e nweghị ego ole a kpọrọ aha a ga-akwụ. Ị pụrụ ịhụ n’ebe a n’ime peeji e dere banyere ndị bipụtara ya, na magazin a bụ akụkụ nke ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ nke e jikwa onyinye afọ ofufo na-akwado. [Zoo aka n’okwu dị na peeji nke 5 nke Teta! ma ọ bụ n’ala ala kọlụm aka ekpe nke peeji nke 2 nke Ụlọ Nche.] Abụ m nanị otu n’ime ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii bụ́ ndị wepụtaworo oge na ihe onwunwe ha n’afọ ofufo iji rụzuo ọrụ a dị oké mkpa n’ihe karịrị ala 230. Ọ bụrụ na ị chọrọ inye obere onyinye maka ọrụ a, ohere dịịrị gị ime otú ahụ.” Onye nwe ụlọ enye onyinye ma tinye ego ahụ n’ime envelopu maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Onye nkwusa ekwupụta ekele maka onyinye e nyere ma kwuo na ya ga-eweta mbipụta magazin ndị a ga-enweta n’ọdịnihu. N’ihe ngosi nke abụọ dị nkenke, gosi otú onye nkwusa si ghara ịhapụrụ onye nwe ụlọ akwụkwọ n’ihi na, ọ bụ ezie na ọ dị njikere inwe mkparịta ụka, o nweghị mmasị n’ezie n’ozi Alaeze ahụ. N’ihe ngosi nke atọ dị nkenke, gosi otú a pụrụ isi hapụrụ mmadụ traktị bụ́ onye gosiri ezi mmasị ma o ji nnọọ ọrụ n’aka mgbe ahụ, o yighịkwa ka ò kwesịrị ekwesị n’oge ahụ ịkọwa ụzọ e si na-akwado ọrụ anyị. Onye nkwusa ekwe nkwa ịlaghachi n’oge ka kwesị ekwesị. Mgbe ọ gaghachiri, ọ ga-agbalịsi ike ịchọpụta ma onye nwe ụlọ ò nwere mmasị n’ezie n’ọrụ anyị, ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-akọwakwa ọdịdị nke ozi anyị na ụzọ e si na-akwado ọrụ ahụ.
Abụ nke 72 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 16
Abụ nke 145
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Nanị ngwụsị izu abụọ fọdụrụ n’April, n’ihi ya gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi tupu ọnwa agwụ.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Ọ Kasị Mma Ime Ka Ọ Dị Mfe.”a Gụnye echiche ndị sitere n’isiokwu bụ́ “Ka Anyị Kpọọ Okwu Aha!” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke July 1999, peeji nke 4. Ná mkpirikpi, mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ iche ihe n’ihu nke dị mfe.
Abụ nke 146 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 23
Abụ nke 163
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Ibu Ụzọ Mee Atụmatụ—Maka Gịnị?” Okwu. Gụnye isi ihe ndị kwesịrị ekwesị sitere n’Ụlọ Nche nke November 1, 2000, peeji nke 18-21.
25 min: “Mmetụta nke Vidio Bụ́ The Bible—Its Power in Your Life.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Gịnị ma ị gbasoo aro a tụrụ n’ahụmahụ ahụ a kọrọ na 1997 Yearbook, peeji nke 54, paragraf nke 1, banyere iji vidio Society na-eme ihe nke ọma? Na June, anyị ga-atụle vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault. N’ọnọdụ ya, tụlee “Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?” Okwu onye okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke September 1, 1996, peeji nke 4-7.
Abụ nke 202 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 30
Abụ nke 215
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka April. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ịjụta onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha ka e nwee ike ịchịkọta akụkọ ozi nile mgbe ọ na-erule May 6.
15 min: “Gbaa Àmà Dị Ka Ezi Onye Agbata Obi.”b Kwuo ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi gbaa àmà site n’omume anyị.—Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1997, peeji nke 18, paragraf nke 16.
20 min: Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka. Okwu na ajụjụ ọnụ nke onye nlekọta ije ozi ga-eduzi. Tụleghachi ihe omume Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka, dị ka e depụtara ya n’Ozi Alaeze Anyị nke September 1998, peeji nke 8. Kọọ ihe ndị dị mma a rụzuworo n’ọgbakọ unu. Gbaa onye ọsụ ụzọ nyewooro onye ọzọ aka, na onye nkwusa e nyewooro aka, ajụjụ ọnụ. Gosi otú ha abụọ si rite uru site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ozi. Gbaa ndị ọzọ ume iji ndokwa a na-eme ihe nke ọma n’ọnwa ndị dị n’ihu.
Abụ nke 216 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 7
Abụ nke 84
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “A Pụrụ Ime Ihe Nile n’Ebe Chineke Nọ.”c Kwuo okwu n’ụzọ dị mkpirikpi n’ihe e kwuru n’akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 443, na-egosi ókè e meruru nkwusa na 1935 ma e jiri ya tụnyere ihe a kọrọ na Yearbook kasị ọhụrụ. Kọwapụta otú oké mmụba a si yie n’otu oge ihe na-apụghị ime eme.
20 min: “Na-ejesi Ozi Gị Ike.”d Kpọọ ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere n’inyere ndị ọzọ aka dị ka a tụrụ aro ya na paragraf nke 3-5.
Abụ nke 80 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.