Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị mgbe a gara nletaghachi, a pụrụ inyefe ụtụ. Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ, na-eburu n’obi ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. June: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ— Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! n’ebe o kwesịrị.
◼ Ọ dị mkpa ka Society na-enwe ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na nke ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe mgbe ọ bụla, odeakwụkwọ kwesịrị idejupụta ma zitere Society fọm bụ́ Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29) ozugbo.
◼ Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị inwe fọm bụ́ Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b), bụ́ ndị ga-ezuru ha. A pụrụ iji Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Nwee ma ọ dịkarịa ala ndị ga-ezu n’otu afọ. Nyochaa akwụkwọ dum e dejupụtara maka ịsụ ụzọ oge nile iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị na-etinye akwụkwọ ndejupụta apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptism, ha kwesịrị ikwu otu ụbọchị ma detuo ya n’akwụkwọ.
◼ Malite n’izu July 2, 2001, anyị ga-atụleghachi akwụkwọ bụ́ Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, na-atụlezu isiakwụkwọ ise kwa izu. Malite n’izu July 30, 2001, anyị ga-amụ akwụkwọ bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.
◼ Ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị isite n’aka ọgbakọ zite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi ụtụ Ụlọ Nche na Teta! nile a natara site n’aka ndị nwere mmasị.
◼ Society adịghị ahụ maka ọda ndị nkwusa n’otu n’otu maka akwụkwọ. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara Society ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.
◼ Na May 26, 2001, a ga-emechi ihe owuwu Betel. N’ihi ya, biko unu abịala maka ime ngagharị ma ọ bụ inweta akwụkwọ n’ụbọchị a.
◼ Mgbe ọ bụla atụmatụ i mere ịga njem na-agụnye ije nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, ma ọ bụ mgbakọ distrikti ná mba ọzọ, ị ghaghị ịjụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ anyị ná mba ahụ maka ihe ọmụma banyere ụbọchị, oge, na ebe ndị a ga-enwe ha. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.