Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke January 1 ruo April 23, 2001. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ọ bụ ezie na anyị ekwesịtụghị ikwe ka mmetụta mee ka anyị ghara ịhụ mmehie jọgburu onwe ya, anyị pụrụ iṅomi ihe nlereanya Josef site n’iji obi ebere gbaghara onye nwere nchegharị bụ́ onye mehieworo anyị. (Jen. 42:21; 45:4, 5) [w99 1/1 p. 31 para. 2-3]
2. E wezụga ndepụta osuso ọmụmụ dị na ya, 1 Ihe E Mere nwere nanị ndepụtaghachi nke ihe ọmụma dị n’akwụkwọ 2 Samuel na Ndị Eze. [w85 11/1 p. 27 para. 1, 2]
3. Eze Solomọn ‘wuru Tadmoa’ n’ihi na ọ bụ ebe dị mkpa nye ọdịmma alaeze ya dị ka ogige ndị agha maka nchebe nke ókèala ebe ugwu nakwa dị ka ebe dị mkpa e si eru ọtụtụ obodo ndị ụlọ a na-ebugharị ebugharị jupụtara na ha. (2 Ihe 8:4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 1/15 p. 28 para. 3.]
4. Jisọs gosipụtara ịdị umeala n’obi ya site n’ịnakwere ọrụ ahụ pụrụ iche nke isi n’ógbè eluigwe bịa n’ụwa ma ghọọ mmadụ dị ala, nke dị ala karịa ndị mmụọ ozi. (Fil. 2:5-8; Hib. 2:7) [w99 2/1 p. 6 para. 3]
5. Nkà mmụta ihe ochie gosiri na mwakpo Shaịshak wakporo Juda nakwa nkwakọrọ ọ kwakọọrọ “akụ̀ nile nke ụlọ Jehova na akụ̀ nile nke ụlọ eze” mere eme n’ezie. (2 Ihe 12:9) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 6/1 p. 25 para. 4.]
6. Nzube e ji enye ndụmọdụ bụ iji ‘mee ka onye na-adahie adahie guzozie,’ ọ bụghị iji manye ya ka o mee mgbanwe ọ na-achọghị ime. [w99 1/15 p. 22 para. 2]
7. Mmadụ kwesịrị ijere Chineke ozi n’echeghị echiche ịnata ụgwọ ọrụ. [w99 4/15 p. 16 para. 1]
8. N’izo aka ná “mmeso ọma” Jehova, dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 103:2, Devid bu n’uche ihe Jehova kere eke a na-ahụ anya. [w99 5/15 p. 21 para. 5-6]
9. Ndị mmegide akwụsịghị owuwu nke ụlọ nsọ ahụ n’oge Ezra n’ihi na nchebe Jehova dịkwasịrị ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Ezra 5:5) [w86 2/15 p. 30 para. 2-3]
10. Osuso ọmụmụ ndị dị na 1 Ihe E Mere adịghị onye na-agụ Bible taa mkpa. [w85 11/1 p. 28 para. 1-3]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Dị ka akwụkwọ mbụ nke Ndị Eze na-agwa anyị, ònye ka Eze Ehab lụrụ, gịnịkwa bụ mmetụta alụmdi na nwunye ahụ nwere n’ebe Ehab nọ nakwa n’ebe mba ahụ dị? (1 Eze 16:30-33; 18:13) [w85 6/1 p. 30 para. 4]
12. Ànyị si aṅaa atụkwasị Jehova ibu anyị? [w99 3/15 p. 23 para. 1-2]
13. Ihe mmụta dị aṅaa siri ike banyere ikike ka anyị pụrụ inweta site n’ihe mere Eze Juda bụ́ Ụzaịa? (2 Ihe 26:15-21) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 12/1 p. 26 para. 1-2.]
14. Kama ịbụ iguzobe omenala, gịnị bụ ezi ihe mmụta Jisọs kụziiri anyị site n’ịsa ụkwụ ndị ozi ya? (Jọn 13:4, 5) [w99 3/1 p. 31 para. 1]
15. N’ihi gịnị ka ihe ndekọ dị na 1 Ihe E Mere 14:8-17 ji bụrụ ihe na-akpali mmasị n’oge Aịsaịa, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ịbụ ihe na-akpali mmasị nye Krisendọm taa? (Aịsa. 28:21) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 6/1 p. 21 para. 2-3.]
16. Akụkụ ndị dị aṅaa nke ofufe Beal mere ka ọ dọrọ mmasị nke ọtụtụ ndị Israel? [w99 4/1 p. 29 para. 3-6]
17. Ihe dị aṅaa bara uru ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọrụ Hezekaịa rụrụ iji chebe ma mụbaa mmiri Jerusalem na-enweta? (2 Ihe 32:3, 4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 8/15 p. 6 para. 1-2.]
18. Olee otú ihe nlereanya Josaịa pụrụ isi bụrụ ihe agbamume nye ndị na-eto eto taa ijere Chineke ozi ma guzogidesie ofufe ụgha ike? (2 Ihe 34:3, 8, 33) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 8/1 p. 5 para. 2.]
19. Ọ̀ bụ na ndị Juu nile fọdụrụ na Babilọn ekwesịghị ntụkwasị obi, ihe dịkwa aṅaa bara uru ka a pụrụ ịmụta site na nke a? (Ezra 1:3-6) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 2/15 p. 29 para. 4, 7.]
20. Gịnị ka e gosiri site n’egwú na abụ ahụ a bụrụ ná nraranye nke ụlọ nsọ ahụ mgbe Jehova mere ka igwe ojii ahụ pụrụ iche jupụta n’ụlọ ya? (2 Ihe 5:13, 14) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 5/1 p. 10 para. 7.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Onye na-enye onye Kraịst ibe ya ndụmọdụ aghaghị ijide n’aka na ihe ọ na-ekwu dabeere __________________________ Chineke, ọ bụghị ná __________________________ na __________________________ mmadụ. (Kọl. 2:8) [w99 1/15 p. 22 para. 1]
22. __________________________, bụ́ __________________________ kasị ukwuu na __________________________, ga-emere ndị na-achụrụ ya àjà ihe karịrị ihe Solomọn pụrụ ime mgbe ọ bụla. (2 Ihe 9:12, 22) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 11/1 p. 23 para. 4.]
23. Dị ka ogwu ndị pụrụ igbochi mkpụrụ ọkụkụ iru ntozu okè, __________________________ a na-achịkwaghị achịkwa na aghụghọ nke __________________________ pụrụ igbochi mmadụ inwe ọganihu ruo ntozu okè ime mmụọ. (Mat. 13:19, 22) [w99 3/15 p. 22 para. 5]
24. N’agbanyeghị ihe anyị na-arụ n’etiti ndị Jehova a haziri ahazi, ọ bụrụ na anyị na-agbalị inwe __________________________ —ọbụna n’agbanyeghị ahụhụ—anyị ga-abụ ndị na-enye ndị kwere ekwe ibe anyị __________________________. [w99 2/15 p. 29 para. 1]
25. Ka ezi onye Kraịst wee nwee ihe ịga nke ọma n’ebe Solomọn na-enweghị, ọ ghaghị iwepụsị __________________________ ma ọ bụ __________________________ n’ofufe ya ma mee ihe kwekọrọ n’okwu __________________________ bụ́ ‘iwere obi ya dum hụ Jehova bụ́ Chineke ya n’anya.’ (Mat. 22:37; 1 Ihe 28:9) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w86 12/1 p. 19 para. 17-18.]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Ihe ndekọ dị ná 2 Ndị Eze 17:5, 6 na-akọ otú (Tiglat-pileser; Shalmaneser V; Esar-haddon) si wakpoo alaeze ebo iri nke ebe ugwu Israel ma malite nnọchibido ọ nọchibidoro Sameria ruo afọ atọ, bụ́ nke ndị Asiria meriri n’ikpeazụ n’afọ (740; 607; 537) T.O.A. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 6/1 p. 30 para. 1.]
27. (Akwụkwọ Nsọ Hibru; mmụọ nsọ) dị anyị mkpa iji ghọta (Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst; Akwụkwọ Nsọ). [w85 6/1 p. 30 para. 6]
28. Dị ka Ọpụpụ 4:11 na-egosi, Jehova Chineke ‘na-eme mmadụ ka ọ bụrụ onye ogbi, onye ntị chiri, onye na-ahụ ụzọ, na onye ìsì’ n’echiche bụ́ na (ụta dịịrị ya maka nkwarụ ndị mmadụ nwere; ọ na-ahọrọ ndị dị iche iche maka ihe ùgwù ije ozi; o kwewo ka nkwarụ na-apụta ìhè n’etiti ụmụ mmadụ). [w99 5/1 p. 28 para. 2]
29. Eze Devid haziri ndị nchụàjà gaa ‘n’òtù,’ ma ọ bụ ìgwè (12; 24; 36), na-ekenye ìgwè nke ọ bụla ije ozi n’ụlọ nsọ (otu izu; izu abụọ; otu ọnwa). [w85 11/1 p. 28 (igbe)]
30. Ajụjụ Setan bụ́: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” na-enye echiche na (Setan enweghị ekele maka ihe Jehova nyeworo; Chineke na-anapụ Iv ihe dị oké ọnụ ahịa, ihe ga-emeghe anya ya ma mee ya ka o yie Chineke n’onwe ya; Iv enweghị ekele maka ọtụtụ ngọzi Jehova wụkwasịworo ya). (Jen. 3:1, 5, 6) [w99 4/15 p. 17 para. 1]
Jikọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Luk 14:28-30; Ilu 25:11; Rom 12:2; Ilu 22:4; Ekli. 7:14
31. A chọrọ mgbalị si n’obi iji gbanwee echiche anyị ma jiri eziokwu nke Chineke mejuo uche anyị. [w99 4/1 p. 22 para. 2]
32. Mgbe a na-enye ndụmọdụ, ọ dị mkpa ịhọrọ okwu ndị ziri ezi. [w99 1/15 p. 23 para. 1]
33. Ọ dị anyị mkpa ime atụmatụ na ịdị njikere maka ibu ọrụ, ihe omume, mkpebi, na nsogbu anyị—ma hà dị ngwa ma ọ bụ na ha adịghị. [w99 3/15 p. 21 para. 3]
34. Eziokwu bụ́ na Chineke na-ekwe ka anyị nwee ma ọṅụ ma nsogbu na-echetara anyị na anyị apụghị ikwu ihe ọdịnihu ga-eweta. [w99 5/1 p. 29 para. 4-5]
35. Ịdị umeala n’obi na-eweta ọtụtụ ụgwọ ọrụ. [w99 2/1 p. 7 para. 6]