Ndokwa Ikesa Akwụkwọ Anyị nke E Mere Ka Ọ Dị Mfe
1 Ndokwa e mere ka ọ dị mfe nke ikesa akwụkwọ n’ekwughị ego ole a ga-akwụ anọwo ihe karịrị otu afọ ugbu a. Ndokwa a ò nwewo ihe ịga nke ọma? Akụkọ ozi ubi na-ekpughe mmụba e nwere n’inyefe akwụkwọ nile. N’ụzọ nkịtị, a na-enye ọtụtụ nde mmadụ ohere ‘ịbịa nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’—Mkpu. 22:17.
2 Otú ọ dị, ọ bụghị iwu, ọ bụghịkwa ọchịchọ anyị inyefe akwụkwọ anyị aghara aghara n’aka onye ọ bụla nke ga-anara ya. Dị nnọọ ka anyị si eji amamihe eji ihe ndị anyị nwere eme ihe, onye nkwusa nke ọ bụla nwere ibu ọrụ nke iji akwụkwọ ndị a na-ekwughị ego ole a ga-akwụ maka ha mgbe ọ natara ha bụ́ ndị ọ natara n’aka Society site n’ọgbakọ, mee ihe n’ụzọ amamihe. Na Society na-enye ndị nkwusa akwụkwọ ha n’ekwughị ego ole ha ga-akwụ apụtaghị na ibipụta na ikesa ha adịghị efu ego. Mmadụ nile kwesịrị inwe ekele karịsịa maka uru akwụkwọ anyị bara n’inyere ndị nwere obi eziokwu aka n’ọchịchọ ha na-achọ ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jisọs Kraịst.—Jọn 17:3.
3 Olee otú Society si enwe ike enye mmadụ nile akwụkwọ ha n’ekwughị ego ole a ga-akwụ? E ji onyinye akwụ ụgwọ mmefu ndị a na-aghaghị inwe n’ibipụta na ikesa ha. Ọ bụ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye bụ ndị bụ́ isi n’inye nkwado a. Ndịàmà Jehova adịghị elegara ọha mmadụ anya ịkwado ọrụ a dị oké mkpa nke nkwusa Alaeze. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla anyị tinyere aka n’ịgba ọnyà ego, anyị adịghịkwa etinye aka na ya ugbu a. Otú ọ dị, anyị na-enwe ekele maka ntakịrị onyinye ndị sitere n’aka ndị nwere ezi mmasị na obi ekele bụ́ ndị anyị zutere n’ubi.
4 Ihe Onyinye Anyị Na-arụzu: N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị ka anyị dị njikere ịkọwa ná mkpirikpi na n’ụzọ doro anya otú e si eji onyinye afọ ofufo akwado ọrụ nkụzi Bible anyị na-arụ n’ụwa nile. A na-eji ego nile a natara akwụ ụgwọ mmefu dị ukwuu a na-enwe n’ịrụzu ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’oge a. Tụkwasị n’ibipụta akwụkwọ a na-ekesa n’ụwa nile, Society na-elekọta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, ebe obibi Betel, ụlọ akwụkwọ ndị ozi na nke ndị ozi ala ọzọ, na-elekọtakwa ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ebe nkesa akwụkwọ dị iche iche, na ọtụtụ ọrụ nkwado ndị ọzọ bụ́ ndị dị mkpa maka ịrụzu ọrụ nile Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 24:14; 28:19, 20.
5 Uto dị mkpa nke na-ewere ọnọdụ n’etiti ndị Jehova akpaliwo ọtụtụ ndị ịjụ banyere ihe ndị ha pụrụ ime iji nye aka. Ọtụtụ ndị enweghị ike inye aka n’onwe ha n’iwu alaka ụlọ ọrụ ndị ọhụrụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche ma ọ bụ ịga mba ndị dị anya iji nye aka ná mgbalị ndị a na-eme n’ịgbasa ozi ọma n’ebe ahụ. Ma iji kere òkè ụfọdụ n’uto a na-enye obi ụtọ ruo n’ókè ha nwere ike, ọtụtụ ndị nkwusa na ezinụlọ ha emewo ka ọ bụrụ omume ha iwepụta ihe iche mgbe nile iji nye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 16:1, 2.) N’ụzọ dị otú a, a na-akwado ọrụ nile nke Society, gụnyere ikesa akwụkwọ. Ọ dịghị onye kwesịrị ile onyinye afọ ofufo a na-enye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ anya dị ka a ga-asị na ọ bụ nanị ịkwụ ụgwọ akwụkwọ.
6 Mgbe anyị na-ejekwuru ndị nwe ụlọ ma ọ bụ ndị ọzọ iji gbaara ha àmà, anyị kwesịrị ịdị njikere iso ha kwurịta isiokwu Bible. A tụrụ aro okwu mmeghe ndị na-adọrọ mmasị na ọtụtụ isiokwu Bible ndị kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible. Ma ọ bụkwanụ anyị pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu dị iche iche a tụrụ aro ha n’Ozi Alaeze Anyị mee ihe. Na-adabere n’otú onye ahụ si gee ntị n’ozi Alaeze ahụ, onye nkwusa ahụ aghaghị ikpebi otú ọ ga-esi gaa n’ihu n’ihe banyere inyefe akwụkwọ. Ọ bụrụ na o yiri ka o nwechaghị mmasị nke ga-eme ka i nyefee ya otu akwụkwọ ma ọ bụ mbipụta ọzọ, ị pụrụ ikpebi iji akọ kwụsị mkparịta ụka ahụ ma gakwuru onye ọzọ. Ma ọ bụ i nwere ike chọọ ịhapụrụ ya otu mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ otu traktị ma ọ bụrụ na onye ahụ kwere nkwa ịgụ ya. Jide n’aka idetu ihe banyere mmasị ahụ ka i wee nwee ike ịga nletaghachi. A pụrụ ime otu ihe ahụ mgbe a na-enwechaghị ohere isoro mmadụ nwee mkparịta ụka na-arụpụta ihe n’ihi na o ji ọrụ n’aka ma ọ bụ n’ihi na anyị abịaghị mgbe o nwere ohere.
7 Ndokwa ikesa akwụkwọ nke e mere ka ọ dị mfe na-enyere mmadụ nile aka ịhụ na ọrụ nkụzi Bible anyị na-arụ abụghị nke azụmahịa n’ụzọ ọ bụla. Ọ na-enyekwara anyị aka ibute ụzọ nzube anyị bụ́ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ nke Jisọs Kraịst. N’ụzọ dị nnọọ iche n’òtù dị iche iche ‘na-agba ọnyà ego iji rụọ ọrụ ebere,’ Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ ịhụ na a pụrụ ime ka mmadụ nile nweta akwụkwọ n’ekwughị ego ole ha ga-akwụ. A dịghị arịọ ndị na-enweghị ezi mmasị n’ozi anyị inye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. (Lee Ụlọ Nche nke December 1, 1990, peeji nke 22 na nke 23.) A na-eji onyinye nile a na-anata arụ ọrụ a zuru ụwa ọnụ nke nkụzi Bible, ebe ọ bụ na ndị nile na-arụ ọrụ ahụ bụ ndị ọrụ afọ ofufo, ọ dịghịkwa onye ọ bụla nọ ná nzukọ a nke a na-akwụ ụgwọ ọnwa ma ọ bụ na-ekenye ego n’ihi ọrụ ọ rụrụ. Ọ bụ nanị ndị jụrụ ase maka ya ma ọ bụ ndị gosiri mmasị n’ọrụ anyị ka a na-agwa okwu banyere inye onyinye iji nye aka n’ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ.
8 Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-amụba ozi anyị, na-eji mbipụta ndị na-enye aka nke Society eme ihe n’ụzọ amamihe, Jehova ga-anọgide na-eme ka a na-enwe mmụba. Ndị nwere ezi obi bụ́ ndị nọ ebe nile, na-enwe ekele maka nkọwa ndị anyị ji nlezianya na-akọwa otú anyị si eje ozi anyị, ha na-enwekwa obi ụtọ igosi nkwado ha site n’onyinye afọ ofufo ha na-enye.