Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị mgbe a gara nletaghachi, a pụrụ inyefe ụtụ. Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ, na-eburu n’obi ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. June: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji dị 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ— Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị ekwesị. August: Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ. N’ebe a na-enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla nwere peeji dị 192 nke mere ochie karị.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.