Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/01 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite May 14
  • Izu Na-amalite May 21
  • Izu Na-amalite May 28
  • Izu Na-amalite June 4
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 5/01 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite May 14

Abụ nke 3

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: Igbe Ajụjụ. Ọ bụ onye okenye ga-eme ya.

18 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Na-ezi Okwu Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 2001.” Odeakwụkwọ emee ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu dị n’ihe ntinye, paragraf nke 1-10.

Abụ nke 31 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 21

Abụ nke 52

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

20 min: Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ nke Na-eweta Ọṅụ. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye okenye ga-eme, dabere n’Ụlọ Nche nke August 1, 1997, peeji nke 26-29.

15 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Na-ezi Okwu Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 2001.” Onye okenye emee ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu dị n’ihe ntinye, paragraf nke 11-15. Mesie ike mkpa ọ dị ime ndokwa, ngwa ngwa o kwere omume, maka ịhapụ ọrụ iji nwee ike ịga ụbọchị atọ nile nke mgbakọ ahụ. Jaa mmadụ nile mma maka ịkwado ndokwa ndị Society na-eme.

Abụ nke 105 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 28

Abụ nke 58

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka May.

15 min: “Okwu Mmeghe Pụrụ Ime Ka E Nwee Ọdịiche.” Soro ndị na-ege ntị tụlee isiokwu a. Okwu mmeghe ndị dị aṅaa ka ha chọpụtaworo kasị adị irè n’ókèala unu? Olee mgbe ndị nkwusa na-eji akwadebe ma na-amụgharị okwu mmeghe ha maka ozi ubi? Mee ndokwa ka e mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke okwu mmeghe ndị dịworo irè n’ókèala unu.

20 min: “‘Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike.’”a Gụnye ihe ngosi abụọ a kwadebere nke ọma, na-egosi otú ụzọ iche ihe n’ihu ndị dị nkenke pụrụ isi dọrọ uche gaa n’Okwu Chineke.

Abụ nke 79 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 4

Abụ nke 100

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Na-akpali Ihe Ka n’Ọnụ Ọgụgụ.”

15 min: “Kere Òkè Zuru Ezu n’Owuwe Ihe Ubi Ahụ.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gụnye ihe atụ sitere n’Ụlọ Nche nke September 15, 1996, peeji nke 19, paragraf nke 10, na-egosi ihe ụfọdụ ndị na-eme iji mụbaa ozi ha.

18 min: “Anyị Arụọla Ókèala Anyị Ọtụtụ Ugboro!”c Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. (Ọgbakọ ndị nwere ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya pụrụ ịtụle isiokwu bụ́ “Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ,” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke April 1998.) Tụlee ihe unu pụrụ ime iji na-arụzu ókèala unu nke ọma karị. Kọọ ahụmahụ ndị dị na1997 Yearbook, peeji nke 204, nakwa n’Ụlọ Nche nke February 15, 1996, peeji nke 26. Kwusie okwu ike ná mkpa ọ dị inwe ezi ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ, ịgaghachi na nke ndị na-anọghị n’ụlọ, na ịga nletaghachi n’egbughị oge.

Abụ nke 142 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya