Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’August na September: Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ. N’ebe a na-enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla nwere peeji dị 192 nke mere ochie karị. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! A pụrụ inyefe ụtụ n’ebe a chọtara mmasị ná nletaghachi. November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweelarị ha, a pụrụ inyefe akwụkwọ ọzọ mere ochie karịa.
◼ N’ọkwa a mara banyere akwụkwọ ndị e nwere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2001, e kwuru ihe na-esonụ banyere akwụkwọ bụ́ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị: “(mpịakọta anọ; nanị maka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism).” Nke a kwesịrị ịbụ: “(mpịakọta anọ; nanị maka ndị nkwusa).”
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla ókè fọm zuru ezu maka iji mee ihe n’afọ ije ozi 2002. Biko jirinụ ezi uche were fọm ndị a mee ihe. E kwesịrị iji ha mee ihe nanị maka nzube e ji mepụta ha.
◼ Malite n’afọ a, ndị ọsụ ụzọ oge nile agaghị eru eru ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ ọgwụla ma hà eruola ma ọ dịkarịa ala afọ 16 tupu September 1 nke afọ ha ga-aga ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe a na-agaghị agbaso nke a bụ ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna nke nwatakịrị ahụ, nke bụ́kwa ọsụ ụzọ n’onwe ya, eruo eru ịga otu klas ahụ.
◼ E kwesịrị ime ngụkọ a na-eme kwa afọ nke akwụkwọ na magazin nile e nwere n’August 31, 2001, ma ọ bụ n’oge dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ịgụ akwụkwọ ọnụ kpọmkwem nke onye nlekọta akwụkwọ na-eme kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ngụkọta ha na fọm Literature Inventory (S-18). A pụrụ ịjụta magazin ole e nwere site n’aka ndị na-elekọta magazin n’ọgbakọ ọ bụla so n’ìgwè nwekọrọ akwụkwọ ọnụ. Ọgbakọ ọ bụla nhazi dị n’aka ga-enweta fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ ibé nke mbụ tupu September 6 agafee. Debenụ ibé nke abụọ ya na faịlụ unu. A pụrụ iji ibé nke atọ mee ihe dị ka ibé akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ. Ya na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ nhazi dị n’aka ga-abịanye aka na fọm ahụ.
◼ Malite n’August 27, 2001, ruo September 1, 2001, a ga-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ihi nke a, ọ dịghị ọda akwụkwọ ọgbakọ tinyere nke a ga-akwadebe maka ibupụ ma ọ bụ ka a bịa buru n’ụbọchị ndị ahụ.