Nwee Nzube I Ji Eme Nkwusa
1 Dị ka ndị ohu Chineke, anyị aghaghị ịhụ ya na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Ikwusa ozi ọma ahụ bụ otu ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya a. Mgbalị anyị nọgidere na-etinye n’ozi kwesịrị ịja mma.
2 Nzube E Ji Eme Nkwusa: Inwe nzube e ji eme nkwusa na-eme ka ozi anyị ghara ịbụ nanị ihe e ji emezu iwu. Otu nzube e ji eme nkwusa bụ izi ihe ma mee ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Lee ihe ọṅụ ọ bụ inyere mmadụ aka ịghọ ohu Jehova n’iṅomi Jisọs Kraịst!
3 N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile na-enwe ekele maka ya. Ma nke a ekwesịghị ibelata ịnụ ọkụ n’obi anyị ime ihe ọma. (Gal. 6:9) Tụkwasị n’ime ndị na-eso ụzọ, nzube ọzọ e ji eme nkwusa bụ ịgba àmà. (Mat. 24:14) Ya mere, ma ndị mmadụ hà gere ntị ma ọ bụ na ha egeghị, ime nkwusa anyị dị oké mkpa. Ndị anyị na-agwa okwu agaghị enwe ihe ngọpụ ọ bụla maka ịghara ife Jehova. (Tụlee Ezikiel 2:3-5; 3:19.) Nke kasị mkpa n’ime ha nile bụ na ime nkwusa anyị na-ewetara Jehova otuto.—Ọma 50:23.
4 Na-enye Akụkọ Ozi Gị: Ọ bụ ezie na Jehova maara ihe onye ọ bụla na-eme, o nwekwara ike ikpebi ma ozi anyị ò sitere ná mkpụrụ obi anyị dum ka ọ bụ nanị obere ihe n’ime ihe anyị pụrụ ime n’ezie. Ma e nwere ezi ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-enye akụkọ ozi ubi anyị. (Ezi. 9:11; Mak 6:30) Akụkọ ozi na-enyere anyị aka ịmata ihe a na-arụzu n’ọrụ nkwusa ahụ n’ụwa nile, ha na-enyekwara anyị aka ịmata otú anyị na-eme n’otu n’otu.
5 N’ihi abamuru nke akụkọ ozi, ọ dị mkpa ka anyị na-echeta inye akụkọ ozi ubi anyị ugboro abụọ kwa ọnwa, n’etiti nakwa ná ngwụsị ọnwa. Ọ bụrụ na anyị eburu n’uche ihe ndị mere anyị ji eme nkwusa, nchegbu anyị agaghị abụ nanị ịgụkọ oge kama iji oge mee ihe bara uru. Ọ bụghị ihe amamihe dị na ya igbu oge n’iso ndị na-enweghị nkwanye ùgwù maka ozi Alaeze na-arụ ụka. Ọzọkwa, buru n’uche na “oge ozi ubi gị kwesịrị ịmalite mgbe i bidoro ọrụ ịgba àmà gị kwụsịkwa mgbe i mesịrị nleta ikpeazụ gị n’oge ịgba àmà ọ bụla.”—om-IB peeji nke 104.
6 Ka anyị na-enwe nzube anyị ji eme nkwusa, na-adabere n’ụzọ zuru ezu n’ebe Jehova nọ, anyị ga-enweta afọ ojuju nke ime ihe na-atọ ya ụtọ ugbu a, n’ọdịnihu dị nso, anyị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.—Ilu 27:11; 1 Tim 4:16.