Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/01 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite October 8
  • Izu Na-amalite October 15
  • Izu Na-amalite October 22
  • Izu Na-amalite October 29
  • Izu Na-amalite November 5
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 10/01 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite October 8

Abụ nke 109

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ United by Divine Teaching iji kwadebe maka ntụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke October 22. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi abụọ dị nkenke nke ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ, a ga-eji Ụlọ Nche nke October 15 mee otu ma jiri ụzọ iche ihe nke mbụ sitere na Teta! nke November 8 mee nke ọzọ.

17 min: “Gịnị Bụ Ebumnobi E Ji Na-eme Ya?”a Mesie ike mkpa ọ dị inyere ndị a na-amụrụ ihe aka ịhụ uru ịga nzukọ ọgbakọ bara. Meekwa ihe ngosi a kwadebere nke ọma banyere ụzọ e si eme nke a, na-eji isiakwụkwọ nke 17, paragraf nke 6-8, n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.

18 min: “Bụrụ Onye Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe.”b Ọ bụ okenye ga-eme ya.

Abụ nke 54 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 15

Abụ nke 113

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Ì Nwere “Obi Na-anụ Ihe”? (1 Eze 3:9) Okwu okenye ga-ekwu, bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke July 15, 1998, peeji nke 29-31. Tụlee ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi gosipụta nrubeisi n’iso ọgbakọ na-arụkọ ọrụ.

20 min: Jiri Magazin Anyị Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè. Onye nlekọta ije ozi na ohu na-ahụ maka magazin atụlee nchegbu ha na-enwe banyere otú e si ekesa magazin n’ógbè ha. Ha ekwuo mkpụrụ ole ọgbakọ ha na-enweta kwa ọnwa ma jiri ya tụnyere ọnụ ọgụgụ a na-edenye n’akụkọ ozi dị ka ndị e tinyere etinye. Dị ka ihe àmà na-egosi, a na-akwakọba ọtụtụ n’ime ha ma ọ bụ na-atụfu ha. Olee otú ndị nkwusa pụrụ isi jiri magazin anyị na-eme ihe n’ụzọ dị irè karị? Ụmụnna ahụ atụlee isi ihe asaa ahụ dị n’ihe omume Nzukọ Ije Ozi bụ́ “Dị Njikere Ịdị Na-enyefe Magazin!” nke izu October 11, 1999. Ha atụleghachi ahụmahụ dị n’Ụlọ Nche nke February 15, 1998, peeji nke 28-29, ma tụlee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi tinye aro ndị ahụ n’ọrụ n’ógbè ha. A na-agba mmadụ nile ume ịnwale ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ ndị a na-egosipụta n’Ozi Alaeze Anyị kwa ọnwa.

Abụ nke 156 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 22

Abụ nke 120

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi abụọ dị nkenke nke ụzọ isi chee magazin n’ihu mmadụ, jiri Ụlọ Nche nke November 1 mee otu ma jiri ụzọ iche ihe nke abụọ sitere na Teta! nke November 8 mee nke ọzọ.

10 min: Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa? Ná nkenke, kọwapụta ihe e kwuru na peeji nke 29, paragraf nke 2, nke broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? bụ́ ebe e nyere azịza doro anya maka ajụjụ bụ́, “Ndịàmà hà kweere na ọ bụ nanị okpukpe ha bụ nke ziri ezi?” Mee ihe ngosi a kwadebere nke ọma nke ụzọ isi zaa ajụjụ a ná nletaghachi, bụ́ nke ọkpụkpọ òkù maka ịbịa nzukọ ọgbakọ ga-esochi.

25 min: “United by Divine Teaching—Ileba Anya n’Ezi Ịdị n’Otu Ụmụnna.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Jiri paragraf nke mbụ malite ihe omume a ma jiri paragraf nke ikpeazụ mechie ya. Iji mee ka e nwee nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ banyere vidio ahụ, jụọ nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị ahụ e depụtara. Ọ bụrụ na ọ dị ndị nọ n’ọgbakọ unu gaworo mgbakọ ná mba ọzọ, mee ka ha kọọ mmetụta ha nwere n’iji anya ha hụ ozuzu nke nzukọ anyị zuru mba nile nakwa ịdị n’otu e nwere na ya. Ọ bụrụ na unu enweghị ha, mee ka a kọọ ụfọdụ ahụmahụ na-akpali akpali e nwetara na 1994 Yearbook, peeji nke 7-9, na 1995 Yearbook, peeji nke 8-11. Na December anyị ga-atụle vidio bụ́ To the Ends of the Earth. N’ọnọdụ ya, tụlee “Mgbakọ Ndị Na-akpali Akpali Na-akwalite Izi Ihe Chineke.” Okwu okenye ga-ekwu bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke January 15, 1994, peeji nke 24-30.

Abụ nke 47 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 29

Abụ nke 164

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka October. Akwụkwọ a ga-enyefe na November bụ broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ihe ngosi a dị nkenke nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ: “N’oge ndị a e nwere ihe isi ike akụ̀ na ụba, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike inweta ihe e ji ebi ndụ. Ì chere na ọchịchị ụmụ mmadụ ga-agwọta nsogbu a n’ụzọ ọ ga-adịrị onye ọ bụla mma? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ahụwo m nkwa a dị na Bible dị ka nke na-agba nnọọ ume.” Gụọ Abụ Ọma 72:12-14. Mgbe ahụ nyefee broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma, na-agbakwụnye okwu kwesịrị ekwesị e nwetara n’akwụkwọ ahụ.

15 min: “Iji Ihe Anyị Nwere Kpọrọ Ihe.” Okwu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ga-eso ndị na-ege ntị tụlee.

18 min: “Olee Otú Ị Na-eriru Nri Ime Mmụọ nke Ọma?”c Mee ka ndị na-ege ntị kwukwuo okwu dabere n’Ụlọ Nche nke April 15, 1997, peeji nke 28-31, ị kọwaa ihe mere anyị na-aghaghị ijisi ike iji nọgide na-eri nri ime mmụọ nke ọma na otú anyị ga-esi na-eme ya.

Abụ nke 181 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 5

Abụ nke 167

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

18 min: Ezinụlọ Ime Nkwadebe Maka Nzukọ. Nna esoro ezinụlọ ya tụlee otú ha nile pụrụ isi kwadebe maka ikere òkè zuru ezu ná nzukọ. N’iji ntụziaka dị n’Ụlọ Nche nke July 1, 1999, peeji nke 20, paragraf nke 9 mee ihe, ha akwadebe azịza ndị ha ga-aza n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke izu a. (1) Onye òtù ezinụlọ nke ọ bụla ahọrọ otu ajụjụ ma ọ bụ abụọ ọ ga-aza. (2) Mgbe ha tụlesịrị paragraf nke onye nke ọ bụla, ha echepụta azịza ha ga-aza n’okwu nke aka ha. (3) Ha ahọpụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi e zoro aka na ha, tụlee ihe jikọrọ nke ọ bụla na isiokwu ahụ, ma kwadebe ihe ha ga-ekwu iji jikọta ha n’ihe ọmụmụ ahụ. Ọ na-agụsi ha nile agụụ ike ikere òkè ná nzukọ ahụ.

17 min: “Nwee Nzube I Ji Eme Nkwusa”d Ọ bụ okenye ga-eme ya.

Abụ nke 151 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya