Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ndị nkwusa kwesịrị ịgwa ndị nwe ụlọ na ha pụrụ inye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na ha achọọ. N’ebe e gosiri mmasị ná nletaghachi, gụnye onye ahụ n’ụzọ magazin. Nyefee broshuọ Na-achọ, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible. June: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ ndị a, nyefee broshuọ kwesịrị ekwesị nke ọgbakọ nwere. July: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụru, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ ndị a, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị.
◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ na-enwe ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na nke ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe mgbe ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm bụ́ Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba ndị a na-apị tupu a kpọọ ógbè nke ọ bụla.
◼ Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị inwe ọnụ ọgụgụ ga-ezuru ha nke fọm bụ́ Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b). A pụrụ iji Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Nwee ma ọ dịkarịa ala ndị ga-ezu n’otu afọ. Nyochaa akwụkwọ dum e dejupụtara maka ịsụ ụzọ oge nile iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị na-etinye akwụkwọ ndejupụta apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ikwu otu ụbọchị o yikarịrị ka ọ̀ bụ ma detuo ya n’akwụkwọ.
◼ Mgbe ọ bụla atụmatụ i mere ịga njem na-agụnye ije nzukọ ọgbakọ, mgbakọ, ma ọ bụ mgbakọ distrikti ná mba ọzọ, ị ghaghị ịjụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ anyị ná mba ahụ maka ihe ọmụma banyere ụbọchị, oge, na ebe ndị a ga-enwe ha. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.
◼ Na May 25, 2002, a ga-emechi ihe owuwu Betel. N’ihi ya, biko unu abịala maka ime ngagharị ma ọ bụ inweta akwụkwọ n’ụbọchị a.