Ntụleghchi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke January 7 ruo April 22, 2002. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha nke gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. N’Eklisiastis 2:2, ihe Solomọn na-ekwu bụ na e kwesịrị izere ịchị ọchị na ịṅụrị ọṅụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 9/15 p. 24 para. 5.]
2. Inwe ọchịchọ siri ike maka ‘ụbọchị ndị mbụ ihe dị mma’ agaghị eme ka ihe kara anyị mma. (Ekli. 7:10) [w87-E 9/15 p. 25 para. 5]
3. N’Aịsaịa 1:7, onye amụma ahụ na-ezo aka n’ịtọgbọrọ n’efu nke Juda n’oge ọchịchị nke Ehaz. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 17 para. 16.]
4. Ọ bụrụ na i nwere oké ihe ndị na-esichaghị gị ike n’obi banyere onye gị na ya na-eme mbedo, ihe amamihe dị na ya ị ga-eme bụ ịkwụsị mmekọrịta ahụ. [fy p. 23 para. 19]
5. Ịhụnanya na-ekpuchi njehie ma ọ dịghị ehichapụ ha, ebe ọ na-adịghị mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ inwere onwe ya pụọ ná ndahie. (1 Pita 4:8; Ọma 130:3, 4; Jems 3:2) [fy p. 29 para. 5]
6. ‘Ihe omume na-eju anya na ọrụ a na-adịghị ahụkebe’ nke oge a bụ́ nke e buru n’amụma n’Aịsaịa 28:21 na-ezo aka ná mbibi a ga-ebibi mba nile n’Amagedọn. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 295 para. 16; p. 301 para. 28.]
7. Dị ka Matiu 24:38, 39 si egosi, ọ bụ mmikpu ndị nke oge Noa mikpuru ná nri nakwa n’ihe ọṅụṅụ, tinyere ihe omume ndị ọzọ nke mmadụ, mere ka Iju Mmiri ahụ kpochapụ ha. [w00 2/15 p. 6 para. 6]
8. Ọ bụ mgbe nile ka Jehova na-emere ndị ohu ya dị umeala n’obi bụ́ ndị ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-ejere ya ozi, ihe ha na-arịọ ya. [w00-IB 3/1 p. 4 para. 3]
9. “Mba nile” ahụ e zoro aka na ya n’Aịsaịa 60:3 bụ mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche bụ́ ndị a dọtaworo n’ìhè Chineke na-enye. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w00 1/1 p. 12 para. 4.]
10. Jehova ‘doro Jeremaịa nsọ’ tupu a mụọ ya n’ụdị na O kpebiri ọdịnihu a kara aka ga-adịru ebighị ebi nke Jeremaịa. (Jer. 1:5) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 4/1 p. 10 para. 2.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. N’Eklisiastis 11:1, gịnị ka ‘izipụ nri’ pụtara? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 9/15 p. 25 para. 11.]
12. N’Aịsaịa 6:8, ònye ka Jehova gụnyere mgbe ọ sịrị “anyị”? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 94-95 para. 13.]
13. Ná mmezu nke Aịsaịa 9:2, olee otú “ìhè ukwu” si nwuo na Galili? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 126 para. 17.]
14. Gịnị n’oge a ka a pụrụ iji tụnyere ọdịda Babilọn dara na 539 T.O.A. na mbibi e bibiri ya n’ikpeazụ? (Aịsa. 13:19, 20; 14:22, 23) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1-IB p. 188 para. 30-31.]
15. Olee otú “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” siworo rụọ ọrụ dị ka “onye nche” ahụ a kọwara n’Aịsaịa 21:6? (Mat. 24:45) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 221-222 para. 11.]
16. Ndụmọdụ amamihe dị aṅaa nye nwa okorobịa na-achọ onye ọ ga-alụ dị n’Ilu 31:10? [w00 2/1 p. 31 para. 1]
17. N’Aịsaịa 43:9, aka dị aṅaa ka a mara chi ndị nke mba nile? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 2/1 p. 16 para. 3.]
18. N’ụzọ dị aṅaa ka ụkwụ nke ndị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke si “maa mma”? (Aịsa. 52:7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 4/15 p. 27 para. 6.]
19. Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee iji zere ịbụ ndị obi anyị ghọgburu? (Jer. 17:9) [w00 3/1 p. 30 para. 4]
20. Gịnị ka ndị ‘na-eje ije n’ụzọ Jehova’ na-aghaghị ime? (Jer. 7:23) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 8/15 p. 29 para. 6.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. “Obi onye maara ihe dị n’aka nri ya” n’echiche bụ́ na “aka nri” na-apụtakarị __________________________ ; n’ihi ya, nke a na-egosi na __________________________ ya na-akpali ya ịgbaso ụzọ ndụ dị mma. (Ekli. 10:2; Mat. 25:33) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 9/15 p. 25 para. 8.]
22. Ụfọdụ n’ime ihe mmụta ndị bara uru a na-akụzi n’Abụ nke Abụ bụ __________________________ na __________________________. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 11/15 p. 25 para. 9]
23. Onye na-apụnara obodo dị iche iche nke Juda ihe, bụ́ onye a kọwara n’Aịsaịa 33:1, bụ __________________________, bụ́ nke a ga-emesị merie na 632 T.O.A., na-ahapụrụ ndị bi na __________________________ ihe nkwata dị ukwuu ka ha kwara, bụ́ ndị ‘ga-achịkọta ya dị ka igurube.’ (Aịsa. 33:4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 343 para. 4; p. 345 para. 6.]
24. Iji Aịsaịa 54:1 tụnyere Ndị Galeshia 4:26, 27 na-egosi na “nwanyị aga” ahụ na-ese onyinyo “ __________________________”; “nwanyị nke a lụrụ na nwunye,” na-esekwa onyinyo __________________________. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 8/1 p. 11 para. 8.]
25. Mgbe a kwara anyị emo ma jụ anyị ka anyị nọ n’ozi anyị na-eje maka ọha, ọ dị anyị mkpa icheta na ọ bụghị __________________________ ka a na-emegide otú ahụ, kama ọ bụ __________________________, bụ́ Isi Iyi nke ozi anyị. (2 Kọr. 4:1, 7) [w00 1/15 p. 21 para. 2]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Mgbe Pọl na-ede banyere ọhụhụ ọ hụrụ ebube eluigwe Jizọs, o zoro aka n’ebe onwe ya nọ dị ka onye “a mụkworo amụkwo,” nke pụtara na (e ji mmụọ nsọ mụọ ya ọhụrụ; a họpụtara ya n’oge dị ka onyeozi nke mba nile; ọ dị nnọọ ka a ga-asị na e nyela ya ihe ùgwù nke ịbụ onye a mụrụ, ma ọ bụ onye a kpọlitere n’ọnwụ, gaa ná ndụ nke mmụọ tupu oge eruo). (1 Kọr. 9:1; 15:8) [w00 1/15 p. 29 para. 6]
27. Utu aha bụ́ “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi” na-ezo aka n’ikike Eze Mezaịa ahụ nwere inye ụmụ mmadụ (ike ime mmụọ; ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe; olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala). (Aịsa. 9:6; Jọn 11:25, 26) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 131 para. 26.]
28. Ná mmezu nke oge a nke Aịsaịa 66:7, “nwa nwoke” ahụ a mụpụtara na-anọchite anya (Jizọs Kraịst; Alaeze Mezaịa ahụ; mba ime mmụọ ọhụrụ na 1919). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 1/1 p. 11 para. 3.]
29. Iji mmesapụ aka na-eji ihe ndị anyị nwere—oge, nkà, ume, na ihe onwunwe anyị—“asọpụrụ Jehova” na-eweta (ngọzi anụ ahụ́; ngọzi ime mmụọ bara ụba; ngọzi nke ego) site n’aka Jehova. (Ilu 3:9, 10) [w00 1/15 p. 25 para. 1]
30. Ná mmezu ya nke oge a, “mba ahụ nke na-egeghị ntị olu Jehova,” bụ́ nke e kwuru banyere ya na Jeremaịa 7:28, na-ezo aka na (Babịlọn Ukwu ahụ; Krisendọm; ike ọchịchị ụwa nke asaa ahụ). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 4/1 p. 18 para. 10.]
Jikọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ilu 24:16; Ekli. 3:11; Aịsa. 40:8; Aịsa. 32:1, 2; Luk 14:28
31. N’oge ya, a ga-ekpughe ebe kwesịrị ekwesị ọrụ ọ bụla nke Chineke dabara ná nzube ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87-E 9/15 p. 24 para. 8.]
32. Ọ dị ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye mkpa inwe echiche ziri ezi banyere ma ngọzi nile nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma banyere ihe ndị ọ na-ewe. [fy p. 13-14 para. 1-2]
33. Ọ bụ ezie na a pụghị izere ndọghachi azụ ezere ná ndụ, onye na-asọpụrụ Chineke adịghị akwụsị ịgbalị ime ihe ọma. [w00 2/1 p. 5 para. 1]
34. A pụghị ịkagbu ma ọ bụ gbochie okwu Chineke, ma ọ bụ nzube ya nke o kwupụtara ekwupụta imezu. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee ip-1 p. 401-402 para. 10.]
35. Ọgbakọ bụ ihe nchebe ọbụna ugbu a, ebe Ndị Kraịst na-achọta nchebe n’etiti ụmụnna ha, n’okpuru nlekọta ịhụnanya nke ndị okenye. [w01 3/1 p. 21 para. 17]