Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-Achị Isi
Ka anyị na-abanye ná mmalite afọ ndị nke narị afọ nke 21, ọ bụ ihe obi ụtọ idetara unu, “òtù ụmụnna dum” gburugburu ụwa, akwụkwọ ozi ma jaa unu mma maka nrụsi ọrụ ike unu. (1 Pita 2:17) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, Jizọs jụrụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ okwukwe ahụ n’elu ụwa?” (Luk 18:8) Ọrụ unu ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ n’ime afọ ije ozi gara aga na-aza ee n’olu dara ụda nye ajụjụ Jizọs! A kwawo ụfọdụ n’ime unu emo ma jiri unu mee ihe ọchị n’ihi okwukwe unu. N’ọtụtụ ebe, unu na-atachi obi n’agbanyeghị agha, ọdachi, ọrịa, ma ọ bụ agụụ. (Luk 21:10, 11) N’ihi ịnụ ọkụ n’obi unu maka ọrụ ọma, Jizọs ka pụrụ ‘ịhụ okwukwe ahụ n’elu ụwa.’ N’ezie e nwere ọṅụ n’eluigwe n’ihi nke ahụ!
Anyị maara na inwe ntachi obi adịghị mfe. Tụlee ọnwụnwa dị iche iche nke ụmụnna anyị n’otu mba dị n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia nwere. Ime ihe ike megide Ndịàmà Jehova bụ ihe a na-ahụkarị n’ala ahụ. Na nso nso a, ndị uwe ojii kpaghasịrị otu mgbakọ nke ihe dị ka mmadụ 700 nọ na-enwe n’udo. Ụzọ ndị e mechiri emechi gbochiri mmadụ 1,300 ọzọ ịga. Ìgwè na-eme ihe ike bụ́ ndị kpuchiri ihe n’ihu, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị uwe ojii, wakporo ebe a na-enwe mgbakọ ahụ, tie ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ihe, ma suo ihe owuwu a gaje iji mee ihe maka mgbakọ ahụ ọkụ. N’oge ndị ọzọ, ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè ejiriwo obi ọjọọ jiri okpiri ndị a kụnyegasịrị ntú na ha tie ụmụnna anyị ihe.
Mwakpo ndị dị otú ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma ha abụghị ihe ijuanya. E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “A ga-akpagbukwa ndị nile na-achọ ibi ndụ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (2 Tim. 3:12) Na narị afọ mbụ, Ndị Kraịst diri nkwutọ na mkpagbu anụ ahụ́, e gbukwara ọbụna ụfọdụ. (Ọrụ 5:40; 12:2; 16:22-24; 19:9) Otú ahụ ka ọ dị na narị afọ nke 20, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ ga-adịgide otú ahụ na narị afọ nke 21 a. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova na-agwa anyị, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide [unu] ga-aga nke ọma.” (Aịsa. 54:17) Lee okwu mmesi obi ike magburu onwe ya nke ahụ bụ! N’ezie, anyị dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’ebe Jehova nọ nke na site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zekaraịa, ọ sịrị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m].” (Zek. 2:8) Ndị iro nke ndị na-efe Jehova ofufe enweghị ohere ọ bụla nke inwe mmeri n’ikpeazụ. Ofufe dị ọcha ga-emeri!
Dị ka ihe atụ, ná mba ahụ a kpọtụrụ aha ná mbụ, Ndịàmà Jehova nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ abụọ kasị elu nke ndị nkwusa n’ime afọ ije ozi 2001. Ee, ụmụnna anyị na-anọgidesi ike n’ihe n’ebe ahụ n’agbanyeghị ihe isi ike, dị ka ha na-eme n’ebe nile. Gburugburu ụwa n’ime afọ ije ozi gara aga, kwa izu e mere mmadụ 5,066 baptizim ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova. Ugbu a, ndị ọhụrụ a ekpebisiwo ike, tinyere ndị fọdụrụ n’ime anyị, ‘ịbụ ndị zuru ezu n’ikpeazụ, na-ekwenyesikwa ike n’uche nile nke Chineke.’—Kọl. 4:12.
Ọzọkwa, tụlee ihe ndị mere na nso nso a na Gris. N’agbanyeghị afọ ndị e nwere mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ site n’aka Chọọchị Ọtọdọks nke Gris, gọọmenti mba ahụ ekwupụtawo ugbu a na Ndịàmà Jehova bụ “okpukpe a ma ama.” Akwụkwọ bu nnabata a gara n’ihu ikwu na ebe obibi Betel dị na Gris bụ “ebe e doro nsọ a raara nye iji fee Chineke ofufe.” Obi dịkwa anyị ụtọ ịgwa unu na n’ime afọ ije ozi gara aga, ụlọikpe dị iche iche kwupụtara mkpebi ikpe ndị dị mma metụtara ofufe anyị na Bulgaria, Canada, Germany, Japan, Romania, Russia, na United States. Lee ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ maka ime ka ọnụ ụzọ ịrụ ọrụ ghere oghe n’ala ndị ahụ!
Ka anyị na-atụle ụzọ ndị Jehova si na-akwado ndị ya n’oge ikpeazụ ndị a, anyị na-ahụ na ọ bụ Enyi kasị mma anyị pụrụ inwe. Anyị nwere ọṅụ ná mmekọrịta anyị na ya, na-amara na ọ hụrụ anyị n’anya, na-ezi anyị ihe, na-agbazikwa anyị. Ee, ọnwụnwa nke okwukwe ga-anọgide na-abịara anyị. Ma okwukwe na-apụghị ịda ada anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-akwagide anyị. Jems dere, sị: “Gụọnụ ya dị ka nanị ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche, ebe unu maara na ọdịdị okwukwe unu a bụ́ nke e lere ule na-arụpụta ntachi obi.” (Jems 1:2, 3) Ọzọkwa, ntachi obi anyị na-egosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, nke a na-ewetakwara anyị ọṅụ dị ukwuu! Ezigbo ụmụnna anyị, jidenụ n’aka na Jehova ga-enyere onye nke ọ bụla n’ime anyị aka. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghị ahapụ inyere anyị aka ịbanye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Ọ chọrọ ka anyị nwee ihe ịga nke ọma.
N’ihi ya, anyị na-agba unu ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị na-eto eto na ndị agadi ume, iburu n’uche ngọzi dị ebube ndị dị n’ihu. Ka àgwà anyị dịrị ka nke Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “N’ihi ya, ana m ewere ya na ahụhụ nke oge a a kara aka enweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere ebube ahụ nke a gaje ikpughe n’ime anyị.” (Rom 8:18) Daberenụ na Jehova mgbe unu na-eche ụdị ahụhụ ọ bụla ihu. Tachienụ obi, unu adakwala mbà. Unu agaghị akwa ụta ya ma ọlị. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye ezi omume ga-eji okwukwe ya dị ndụ.”—Hab. 2:4.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova