Okwukwe Anyị Na-akpali Anyị Ịrụ Ezi Ọrụ
1 Okwukwe mere ka Noa, Mozis, na Rehab mee ihe. Noa wuru ụgbọ. Mozis hapụrụ uru ndị na-adịghị adịte aka nke dị n’ụdị ndụ a na-ebi n’obí Fero. Rehab zobere ndị nledo ahụ ma rube isi ná ntụziaka ndị ha nyere, na-azọpụta ezinụlọ ya. (Hib. 11:7, 24-36, 31) Olee ezi ọrụ ndị okwukwe anyị na-akpali anyị ịrụ taa?
2 Ịgba Àmà: Okwukwe na-akpali anyị ikwu okwu banyere Chineke anyị dị ebube nakwa ndokwa ndị o meworo maka inwe obi ụtọ ebighị ebi. (2 Kọr. 4:13) Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ịlatụ azụ n’ịgba àmà. Ma mgbe anyị ‘debere Jehova n’ihu anyị mgbe nile,’ anyị na-abụ ndị e wusiri ike, anyị na-ebelatakwa ụjọ anyị na-atụ. (Ọma 16:8) Mgbe ahụ okwukwe anyị na-akwali anyị isoro ndị ikwu, ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị.—Rom 1:14-16.
3 Izukọta Ọnụ: Ịgachi nzukọ anya bụ ezi ọrụ nke na-esite n’okwukwe. Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ? Ọ na-egosipụta nkwenye anyị nwere nke bụ́ na Jizọs nọnyeere anyị site na mmụọ nsọ Chineke mgbe anyị zukọtara ná nzukọ Ndị Kraịst. (Mat. 18:20) Ọ na-egosipụta ọchịchọ anyị nwere ‘ịnụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.’ (Mkpu. 3:6) Anyị na-eji ntụziaka ndị anyị na-anata akpọrọ ihe, n’ihi na anyị na-eji anya nke okwukwe anyị ahụ na onye na-ezi anyị ihe bụ Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova.—Aịsa. 30:20.
4 Nhọrọ Ndị Anyị Na-eme: Ikwenyesi ike n’ihe ndị dị adị a na-adịghị ahụ anya na-akpali anyị ibute ihe ime mmụọ ụzọ ná ndụ anyị. (Hib. 11:1) Nke a na-agụnyekarị ịchụ ihe onwunwe n’àjà. Dị ka ihe atụ, otu okenye jụrụ ọrụ nke na-enye ego n’ihi na nke ahụ gaara apụtara ya ịhapụ ịga nzukọ ụfọdụ, ịhapụ ezinụlọ ya, nakwa ịkwusị ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ya. N’otu aka ahụ, ka anyị nwee obi ike zuru ezu ná mmesi obi ike ahụ Bible na-enye nke bụ́ na Jehova ga-enye ndị “buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya” ihe ndị dị ha mkpa.—Mat. 6:33.
5 Ndị ọzọ na-ahụkwa mmetụta dị ike nke okwukwe na-enwe ná ndụ anyị. N’ezie, a maara banyere okwukwe anyị n’ụwa nile. (Rom 1:8) Ya mere, ka anyị nile site n’ezi ọrụ anyị gosipụta na okwukwe anyị dị ndụ.—Jems 2:26.