Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/02 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite July 8
  • Izu Na-amalite July 15
  • Izu Na-amalite July 22
  • Izu Na-amalite July 29
  • Izu Na-amalite August 5
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 7/02 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite July 8

Abụ nke 201

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee mmadụ Ụlọ Nche nke July 15 na Teta! nke August 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke August 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche a pụrụ isi zaghachi n’ihe na-egbochi mkparịta ụka bụ́ “Anyị aghọworị Ndị Kraịst n’ebe a.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11.

10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ga-ekwu, na-egosi otú o si metụta ọgbakọ unu.

20 min: Ime Nhazi Iji Gbaa Àmà Mberede. Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 93-94. N’iji aro ndị dị na peeji mbụ nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002 eme ihe, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ụzọ abụọ ma ọ bụ atọ a pụrụ isi gbaara onye a na-amabughị, onye agbata obi, onye ikwu, ma ọ bụ enyi mmadụ àmà mberede.

Abụ nke 139 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 15

Abụ nke 144

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: Ezi Ihe Ndị Mere Anyị Ga-eji Jiri Bible Na-eme Ihe n’Ozi Anyị. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Jizọs maara Akwụkwọ Nsọ ma zoo aka na ha ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-ezi ihe. (Luk 24:27, 44-47) Ihe ọ kụziri esiteghị n’echiche nke aka ya. (Jọn 7:16-18) Ọ dị mkpa ka anyị onwe anyị kwa jiri Okwu Chineke na-eme ihe. Ọ dị ike karịa ihe ọ bụla anyị pụrụ ikwu n’onwe anyị. (Jọn 12:49, 50; Hib. 4:12) Nkasi obi na olileanya Akwụkwọ Nsọ na-enye na-adọta ndị nwere obi eziokwu. Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịgụ otu amaokwu Bible ma ọ dịkarịa ala n’ozi gị. Kọwapụta na e nwere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’ụzọ isi chee magazin n’ihu mmadụ n’ọnwa a bụ́ ndị a tụrụ aro ha. Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’otú ha siworo jiri Bible na-eme ihe n’ozi na mmetụta nke a nweworo n’ebe ha nọ na n’ebe ndị ha meere nkwusa nọ.

Abụ nke 215 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 22

Abụ nke 47

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Otu nne ma ọ bụ nna nke ya na nwa ya na-ejekọ ozi emee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 nyefee magazin nke August 1 na August 8. A ga-enyefe Ụlọ Nche n’otu ihe ngosi, nyefeekwa Teta! na nke ọzọ. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke August 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. Gbaa ndị mụrụ ụmụ ume ịdị na-enye ụmụ ha ọzụzụ n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu n’ozi.

17 min: “Gosi na I Ji Akwụkwọ Anyị Kpọrọ Ihe n’Ezie.”a Mesie ike mkpa ọ dị ịchọpụta ezi mmasị tupu a na-ahapụrụ onye nwe ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na e gosiri ntakịrị mmasị, a pụrụ inyefe traktị.

18 min: Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Intanet? Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere na Teta! nke April 8, 2000, peeji nke 23-25. Kọwapụta ihe ize ndụ ndị dị n’iji Intanet eme ihe n’ụzọ a na-akpaghị ókè, kọwaakwa ụzọ isi zere ịbụ ndị a matara n’ọnyà. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kwuo otú ha siworo rite uru site n’itinye ndụmọdụ a n’ọrụ.

Abụ nke 61 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 29

Abụ nke 54

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka July.

10 min: “Mmetụta nke Vidio Ndị Na-agba Àmà.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Ka ọ dị ugbu a, anyị atụlewo vidio anyị 11 n’usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi. Mgbe ị tụlesịrị n’ụzọ dị mkpirikpi ihe atụ ndị e nyere n’isiokwu ahụ, gwa ndị nkwusa ka ha kọọ ihe ịga nke ọma ha nweworo n’igosi ndị ọzọ vidio ndị ahụ.

25 min: “Bụrụnụ Ndị E Jikọrọ Ọnụ n’Otu.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, webata ihe ndị e kwuru na Teta! nke May 8, 2000, peeji nke 9-10. Na paragraf nke 4, webata ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche nke April 1, 1995, peeji nke 16-17, paragraf nke 4-6.

Abụ nke 81 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 5

Abụ nke 38

10 min:  Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: “Ịchịkọta Ndị Mmadụ Site n’Asụsụ Nile.”c Gụnye ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche nke April 1, 2002, peeji nke 24. Ọ bụrụ na o metụtara ọgbakọ unu, kwuo ná mkpirikpi ihe ndị a na-eme iji nyere ndị nọ n’ókèala unu, bụ́ ndị na-asụ asụsụ ala ọzọ aka, meekwa ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị na paragraf nke 4.

15 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ ahụmahụ ụfọdụ na-ewuli elu n’ihe metụtara ịga mgbakọ sekit ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, ịsụ ụzọ inyeaka, ma ọ bụ ikere òkè n’ihe omume ime mmụọ ndị ọzọ rute ugbu a n’afọ a.

Abụ nke 184 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya