Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 6 ruo August 19, 2002. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha nke gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Jeremaịa 18:1-6 na-egosi na Jehova na-eme ka ndị mmadụ mee ihe ndị megidere ọchịchọ ha. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w99 4/1 p. 22 para. 3-4.]
2. Ndị amụma ụgha ahụ zuuru ikike na mmetụta nile nke okwu Chineke site n’ịgba ndị mmadụ ume ka ha ṅaa ntị n’okwu ụgha dị iche iche kama ịṅa ntị n’ezi ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke. (Jer. 23:30) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 2/1 p. 4 para. 3.]
3. Na Jeremaịa 25:15, 16, “iko mmanya nke ọnụma nke a” bụ́ nke na-eme ka “mba nile . . . wịa ara” na-ezo aka ná mmetụta na-akpaghasị isi nke okpukpe ụgha. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 3/1 p. 20 para. 13.]
4. N’ikwekọ n’ụzọ Matiu si jiri amụma Jeremaịa mee ihe, “ala onye iro” ahụ na-ezo aka n’ala nke ọnwụ, bụ́ ebe ụmụaka ahụ Herọd Onye Ukwu gburu ga-esi lọghachite site ná mbilite n’ọnwụ. (Jer. 31:15, 16; Mat. 2:17, 18) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w79 12/15 p. 19 para. 13.]
5. Jeremaịa 37:21 na-enye mmesi obi ike na Jehova pụrụ ịkwagide ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ihe isi ike akụ̀ na ụba ruo n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ọbụna mgbe ọnọdụ pụrụ iyi nke olileanya na-adịghị na ya. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 9/15 p. 3 para. 4–p. 4 para. 2.]
6. Akwụkwọ Abụ Ákwá na-eme ka anyị kwenye na ọ bụ nanị Jehova na-enye ezi olileanya n’oge iru újú. [w88 9/1 p. 27 para. 4]
7. Abụ Ákwá 5:7 na-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova na-enye ụmụaka ahụhụ kpọmkwem n’ihi mmehie nke ndị mụrụ ha. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/1 p. 27 igbe.]
8. Akara ahụ a kara n’egedege ihu, nke e zoro aka na ya n’Ezikiel 9:4, pụtara na ihe ọmụma nanị ga-azọpụta mmadụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/15 p. 14 para. 18.]
9. “Onyinye n’ụdị mmadụ” e kwuru okwu banyere ya ná Ndị Efesọs 4:8 bụ Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ họpụta ma nye ikike ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe ha. (Ọrụ 20:28) [w00 8/1 p. 6 para. 3]
10. N’iji Ezikiel isi 23 mee ihe n’oge a, a pụrụ iji okpukpe Protestant tụnyere Oholiba, jirikwa Roman Katọlik tụnyere nwanne ya nwanyị nke okenye bụ́ Ohola. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/15 p. 21 para. 22.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Olee ndị na-eje ozi dị ka “onyenche” Jehova taa, n’ihi gịnịkwa ka a ga-eji gee ntị mgbe “onyenche” ahụ na-ekwu okwu? [w88 9/15 p. 10, 12 para. 1, 8]
12. Olee otú e si egosi ezi obi ekele maka àjà mgbapụta Kraịst, n’ịza òkù ahụ dị na Luk 9:23? [w00 3/15 p. 8 para. 1]
13. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘raa Jeremaịa ụra’? (Jer. 20:7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 5/1 p. 31 para. 6.]
14. Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na mmụọ nsọ “ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile nke Mụ onwe m gwara unu”? (Jọn 14:26) [w00 4/1 p. 8 para. 7-8]
15. Dị ka Jeremaịa 35:18, 19 si kwuo, olileanya dị aṅaa ka a na-esetịpụrụ òtù ndị Rikab nke oge a? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee su-IB p. 131 para. 7.]
16. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Nefilim si bụrụ “ndị dike” na “ndị a maara aha ha”? (Jen. 6:4) [w00 4/15 p. 28 para. 1]
17. Olee otú Beruk si kwụsị iguzosi ike n’ụzọ ime mmụọ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ ya? (Jer. 45:1-5) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w97 8/15 p. 21 para. 14-16.]
18. Olee mgbe amụma dị na Jeremaịa 50:38 mezuru, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka o si mezuo? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee dp-IB p. 150 para. 2-3.]
19. Gịnị ka ihe dakwasịrị Jeruselem, bụ́ “ada Juda na-amaghị nwoke” na-egosi banyere Krisendọm, dị ka Abụ Ákwá 1:15 si kwuo? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/1 p. 27 igbe.]
20. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Wezụga ákwà nkuku isi ahụ, bupụ okpueze ahụ” pụtara, dị ka e dekọrọ n’Ezikiel 21:26? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/15 p. 19 para. 16.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Onye dị obi umeala adịghị agafe __________________________ nke __________________________ ọma, ọ na-ekwetakwa na ihe o kwesịrị ime na ihe ọ ga-emeli, nwere __________________________. (Maị. 6:8) [w00 3/15 p. 21 para. 1-2]
22. Ọ bụ ezie na mmụọ nsọ nwere ike ọ gaghị ewepụ __________________________ ma ọ bụ __________________________ dị iche iche, ọ pụrụ inyere anyị aka __________________________ na ha. (1 Kọr. 10:13; 2 Kọr. 4:7) [w00 4/1 p. 11 para. 6]
23. Kemgbe afọ ahụ e nwetara ume ime mmụọ ọhụrụ bụ́ __________________________ akpọsawo ihe Chineke kpere n’ikpe, bụ́ ozi dị ike nke mbibi, nye __________________________ n’atụghị egwu. (Tụlee Jeremaịa 11:9-13.) [w88 4/1 p. 22 para. 7]
24. Ọ bụ onye amụma na onye àmà Jehova bụ́ __________________________ dezuru akwụkwọ Abụ Ákwá n’afọ __________________________. [w88 9/1 p. 26 para. 1]
25. Ihe nlereanya Ebreham nke ikwenye ekwenye mgbe a na-edozi esemokwu bụ ihe agbamume nye anyị ka anyị ghara ikwe ka __________________________ ma ọ bụ __________________________ mebie mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na ụmụnna anyị. (Jen. 13:5-12) [w00 8/15 p. 24 para. 3-4]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Job ji (ihe ọmụma; ebere; ikpe) Jehova kpọrọ ihe, n’ihi ya kwa, o ji (nghọta; obi ebere; ịdị mma) mesoo ndị ohu ya. (Job 31:13, 14) [w00 3/15 p. 26 para. 1]
27. Na Jeremaịa 16:2-4, e nyere onye amụma ahụ iwu ịnọgide n’alụghị nwunye (iji gosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ya; iji gosipụta ihe atụ nke ụzọ alụghị nwanyị nke Mezaịa ahụ gbasoro; iji gosipụta ojiji e ji okwu Jehova banyere mbibi Jeruselem n’aka). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w78-E 4/15 p. 31 para. 2.]
28. N’Ilu 4:7, amamihe na-ezo aka (n’ịmara ihe ndị bụ́ eziokwu; n’ịhụ otú ihe ndị bụ́ eziokwu si metụta ibe ha; n’itinye ihe ọmụma na nghọta n’ọrụ). [w00 5/15 p. 21 para. 1]
29. Okwu bụ́ (“nwa a mụrụ ọhụrụ,” “ka agụụ na-agụsi unu ike”) na-apụta na ọtụtụ adịghị enwe agụụ n’ime onwe ha maka nri ime mmụọ. (1 Pita 2:2) [fy p. 58 para. 17]
30. Ụgbọ agha Chineke bụ́ nke a kọwara n’Ezikiel isi 1 na-anọchite anya (Alaeze Mezaịa nke Chineke; ọgbakọ ndị mmụọ ozi nke Jehova; okwu Jehova so ihe ahụ fọdụrụ na-ekwurịta). [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 9/15 p. 11 para. 5.]
Jikọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Jer. 18:18; Deut. 11:18, 19; Ilu 5:21; Jer. 46:28; Rom 15:4
31. Ka ndị ndú okpukpe na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agbalị ịkwụsị nkwusa nke ihe Chineke kpere n’ikpe, ndịàmà ya kwesịrị ntụkwasị obi na-aga n’ihu, mesie obi ha ike ịrụzu ọrụ ịdọ aka ná ntị ahụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 4/1 p. 26 para. 19.]
32. Otu ụzọ kpọmkwem nke Jehova si enye nkasi obi bụ site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ nke bu olileanya dị ebube maka ọdịnihu. [w00 4/15 p. 5 para. 4]
33. Ịdọ aka ná ntị ndị nne na nna ekwesịghị ịgabiga ókè ezi uche dị na ya ma ọ bụ gafee nzube e bu n’uche nke bụ́ inye mgbazi na ịkụzi ihe. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee kl p. 148 para. 20.]
34. Onyeisi ezinụlọ nke na-ahụ n’anya kwesịrị mgbe nile ịdị ngwa ịhụta ohere iji wulite ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ ya. [fy IB p. 70 para. 14]
35. Omume mmekọahụ ọ bụla na-adịghị ọcha, n’agbanyeghị otú ọ bụruru ihe nzuzo, ezoghị ezo n’anya Chineke. [w00 7/15 p. 31 para. 3]