Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’August na September: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji dị 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, na-etinye mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible. November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetawo ha, a pụrụ inyefe akwụkwọ mere ochie karị.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ E kwesịrị ime ngụkọ a na-eme kwa afọ nke akwụkwọ na magazin nile e nwere n’August 31, 2002, ma ọ bụ n’oge dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ịgụ akwụkwọ ọnụ kpọmkwem, nke onye nlekọta akwụkwọ na-eme kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ngụkọta ha na fọm Literature Inventory (S-18). A pụrụ ịjụta magazin ole e nwere site n’aka ndị na-elekọta magazin nọ n’ọgbakọ ọ bụla so n’ìgwè nwekọrọ akwụkwọ ọnụ. Ọgbakọ ọ bụla nhazi dị n’aka ga-enweta fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ ibé nke mbụ tupu September 6 agafee. Debenụ otu na faịlụ unu. A pụrụ iji ibé nke atọ mee ihe dị ka ibé akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ. Odeakwụkwọ na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ nhazi dị n’aka ga-abịanye aka na fọm ahụ.
◼ Malite n’August 26 ruo August 31, 2002, a ga-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ihi nke a, ọ dịghị ọda akwụkwọ ọgbakọ tinyere nke a ga-akwadebe n’ụbọchị ndị ahụ.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere: Amụma Aịsaịa — Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II—Ná Mkpụrụ Akwụkwọ Okpotokpo—Bekee
Mpịakọta Teta! 2001—Bekee