Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite August 12
Abụ nke 76
13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche banyere otú a pụrụ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 15 na Teta! nke September 8. Na nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi merie ihe na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Gịnị mere unu ji abịa ọtụtụ ugbo?”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 12.
20 min: “Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, kwuo okwu ndị na-akpali akpali banyere ịsụ ụsọ oge nile, ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, na ozi Betel site n’akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 112-116.
12 min: “Ndị Kasị Enwe Obi Ụtọ n’Ụwa.”b Kọọ ná mkpirikpi “Nzọụkwụ Ndị Na-eduga n’Obi Ụtọ,” nke dị na peeji nke 6 n’Ụlọ Nche nke October 15, 1997.
Abụ nke 57 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 19
Abụ nke 182
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Gịnị Na-egbochi Ha? Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee na ihe ngosi. Mgbe anyị na-aga ozi, anyị na-ezutekarị ndị na-adịghị njikere ikwurịta ihe ndị ha kwere. Nke a na-abụ ihe mgbochi nke pụrụ igbochi anyị iso ha kerịta ozi Alaeze ahụ. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe na-egbochi mmadụ, nke a pụrụ inyere anyị aka ichepụta ụzọ nke ga-agba onye ahụ ume ikwupụta echiche ya. Tụlee otú anyị pụrụ isi gbanwee ozi anyị mgbe anyị zutere ụdị mmadụ ndị a: (1) Ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe, ọbụna na nke ha. (2) Ndị nwere nkekọ siri ike n’ebe ememe okpukpe ndị ezinụlọ na ndị nna nna hà na-eme dị. (3) Ndị na-eme ihere ikwu banyere ihe ndị ha kwenyere n’ihi na ha amaghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ha ga-eji kwadoo ha. (4) Ndị nwere ajọ mbunobi banyere anyị n’ihi okwu na-ezighị ezi ndị mmegide na-ekwu. Hazigharịa ihe ndepụta ahụ dị ka o kwesịrị iji kwekọọ n’ókèala unu, na-elekwasị anya n’àgwà ndị a na-ahụkarị. Gụnye ihe ngosi dị mkpirikpi na-egosi ụzọ isi dọbata mmadụ ná mkparịta ụka dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.
22 min: “Anyị Nwere Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Maka Iji Na-amalite Ọmụmụ Ihe!” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Mee ka ndị atendantị nye onye ọ bụla bịaranụ otu n’ime traktị ọhụrụ ahụ bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma ọ bụrụ na unu nwere ya. Gbaa mmadụ nile ume inye onye ọ bụla ha zutere n’ozi traktị ọhụrụ ahụ.
Abụ nke 191 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 26
Abụ nke 189
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ka otu onye ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nke inyeaka mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 1. Gbaa ndị nkwusa nile ume ka ha gụnye otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ iche ihe n’ihu ha.
18 min: “Bụrụ Onye Na-ekwurịta Okwu!”c
15 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ kpọọ ọgbakọ òkù ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nweworo n’ịgba àmà mberede, ikekwe, site n’ikwusara ndị nọ n’ebe a na-adọba ụgbọala, n’ime ụgbọala ọha na eze, n’ogige ntụrụndụ, n’ebe azụmahịa, n’ebe ụgbọala na-akwụsị, na n’ebe ndị ọzọ ọha na eze na-anọ, ozi ọma. Meghachi ihe ndị merenụ site n’ime ihe ngosi nke otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ.
Abụ nke 99 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 2
Abụ nke 84
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka August. Kọwapụta ná mkpirikpi isi ihe ndị dị n’isiokwu bụ́ “Soro Ụmụ Gị Na-agụ Ihe,” nke dị n’Ụlọ Nche nke May 1, 1999, peeji nke 25.
20 min: Mee Nkwadebe Tupu Ị Gawa. Nkwurịta okwu na ihe ngosi. Ime atụmatụ dị mma na-eme ka anyị dịkwuo irè n’ozi. Ya mere, tupu oge eruo: (1) Nweta akwụkwọ ndị ị ga-achọ iji mee ihe. (2) Hụ na i nwere ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ zuru ezu na mkpịsị akwụkwọ ma ọ bụ pensịl. (3) Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịba ụgbọala, mee ndokwa kwesịrị ekwesị maka ime njem. (4) Chee echiche banyere nletaghachi ndị ị na-eme atụmatụ ịga. (5) Kwadebe ihe ị gaje ikwu. Ọ bụrụ na ị ga-eduzi nzukọ maka ije ozi ubi, nweta ókèala nke ga-ezunụ. Soro ndị na-ege ntị tụlee ụzọ abụọ ma ọ bụ atọ a pụrụ isi nyefee nke ọ bụla n’ime broshuọ nwere peeji dị 32 n’ozi na September. Mee ihe ngosi nke otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị ahụ, webatakwa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ná mkparịta ụka ahụ.—Lee aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị nke August 1996, peeji nke 8, na nke July 1995, peeji nke 8.
15 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ógbè unu. Kpọọ ọgbakọ òkù ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetaworo n’iji traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? eme ihe. À malitewo ọmụmụ Bible ọ bụla? Ọ bụrụ na a malitewo nke ọ bụla, kọwaa otú e si malite ya ma ọ bụ meghachi ihe ndị merenụ n’otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ. Tụlee igbe bụ́ “Ohere Ndị E Nwere Iji Kesaa Traktị Ahụ” na peeji nke 4.
Abụ nke 123 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.