Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, na-etinye mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible. November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetawo ha, a pụrụ inyefe akwụkwọ mere ochie karị. December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. N’ọnọdụ ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu enweghị nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị ahụ a pụrụ inyefe n’ọnọdụ nke ahụ a ga-enyefe n’ọnwa ahụ, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere nke unu pụrụ inweta iji mee ihe. January: Akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1988 nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị ndị unu pụrụ inweta iji mee ihe.
◼ Ihe ntinye dị ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị bụ “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2003,” e kwesịkwara idebe ya maka izo aka na ya n’ime afọ 2003 dum.
◼ Ọ bụrụ na oge nzukọ nke ọgbakọ unu ga-agbanwe na January 1, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịgwa alaka ụlọ ọrụ banyere mgbanwe ndị ahụ site n’izite fọm bụ́ Congregation Meeting Information and Handbill Request (S-5). Ọ bụrụ na unu chọrọ ya, unu pụrụ iji otu fọm ahụ tụọ ọda maka mpempe akwụkwọ ndị ọhụrụ. E kwesịrị ịtụ ọda maka mpempe akwụkwọ ndị ahụ ọ dịkarịa ala izu asatọ tupu mgbe unu chọrọ inweta ha.
◼ Anyị agaghị atụle vidio Society ọ bụla n’October. Na December anyị ga-atụle vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge.
◼ Kaseti Vidio Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Faithful Under Trials—Jehovah’s Witnesses in the Soviet Union—Bekee
No Blood—Medicine Meets the Challenge—Bekee