Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2003
Ntụziaka
N’afọ 2003, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst [bi7-IB], Ụlọ Nche [w-IB], Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke [be-IB], na Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi [kl-IB].
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, mgbe ahụ gaa n’ihu n’usoro a:
NKÀ OKWU: Minit 5. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, onye ndụmọdụ na-enyere ya aka, ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-atụle otu nkà okwu nke dabeere n’akwụkwọ ọgụgụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. (N’ọgbakọ ebe ndị e nwere ndị okenye ole na ole, a pụrụ iji ohu na-eje ozi ruru eru mee ihe.) Ọ gwụla ma e kwuru ka a ghara ime otú ahụ, e kwesịrị ịtụlekwa igbe ndị dị na peeji ebe ihe omume e kenyere sitere mgbe a na-ekwu okwu ahụ. E kwesịrị ịmafere akụkụ bụ́ ihe omume. Ndị a, n’ụzọ bụ́ isi, bụ maka mmadụ iji ha eme ihe n’onwe ya nakwa maka ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha.
IHE OMUME NKE 1: Minit 10. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A ga-ekwu ya dị ka okwu izi ihe nke ga-ewe minit iri n’enweghị ntụleghachi ajụjụ na azịza. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ kama ilekwasị anya n’uru ihe ọmụma ahụ a na-atụle bara, na-eme ka ihe ga-akasị baara ọgbakọ uru pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe. A na-atụ anya na ụmụnna e kenyere okwu a ga-elezi anya ka ha ghara ịgafe oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha dị ka o si dị mkpa.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: Minit 10. Na minit isii mbụ, okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị igosi otú ihe ọmụma ahụ si metụta mkpa e nwere n’ọgbakọ. Ọ pụrụ ikwu okwu n’akụkụ ọ bụla sitere n’ebe e kenyere maka ọgụgụ Bible n’izu ahụ, ebe ọ bụ na nwanna na-eme ihe omume nke 2 agaghị ekwu okwu n’amaokwu ndị ọ ga-agụpụta. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe dị n’ebe e kenyere ka a gụọ. Nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere ihe ọmụma ahụ ji baa uru na otú o si baa uru. Mgbe nke ahụ gasịrị, ruo minit anọ, ọkà okwu ga-agwa ndị na-ege ntị ka ha kere òkè site n’ikwu okwu dị mkpirikpi (sekọnd 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) n’ajụjụ abụọ na-esonụ: “Olee ihe ị gụtara n’ọgụgụ Bible nke izu a nke ga-abara gị uru n’ozi gị ma ọ bụ n’ụzọ ndụ gị?” nakwa “Olee ihe wusikwuru okwukwe gị ike ma mee ka i nwekwuo ekele n’ebe Jehova nọ?” Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwazi ndị mmụta e kenyere na klas ndị ọzọ ka ha gawa n’ebe ndị ahụ.
IHE OMUME NKE 2: Minit 4. Nke a bụ ihe ọgụgụ nke nwanna nwoke ga-agụ. Ihe ọgụgụ ahụ ga-abụkarị site na Bible. Otu ugboro n’ọnwa, ihe omume a ga-esite n’Ụlọ Nche. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ ihe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. Site n’izu ruo n’izu, otú ihe a ga-agụ ga-aha ga-adịtụ iche kama o kwesịrị iwe minit anọ ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwesịrị ile ihe omume ahụ anya tupu ọ na-ekenye ya mmadụ, na-ekenye ihe omume ahụ dị ka afọ ndụ na ikike nke ndị mmụta si dị. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’inyere ndị mmụta aka iji nghọta, mmesi okwu ike kwesịrị ekwesị, mgbanwe ụda olu, na nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị na-agụ ihe n’ụzọ na-aga were were, nakwa dị ka ha si ekwu okwu.
IHE OMUME NKE 3: Minit 5. Ọ bụ nwanna nwanyị ka a ga-ekenye nke a. Ndị mmụta e nyere ihe omume a ga-eji aka ha họrọ ọnọdụ okwu ma ọ bụkwanụ e kenye ha otu site n’ihe ndepụta dị na peeji nke 82 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Onye mmụta ahụ kwesịrị iji isiokwu e kenyere ya mee ihe ma mee ka o kwekọọ n’otu akụkụ nke ozi ubi bụ́ nke a pụkwara iji mee ihe n’ókèala ọgbakọ. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọmụma maka ihe omume a site n’ime nnyocha n’akwụkwọ dị iche iche òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bipụtara. E kwesịrị ikenye ndị mmụta ọhụrụ okwu ndị e gosiri ebe ha sitere. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta si akọwapụta isiokwu ahụ na ụzọ o si na-enyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ịghọta isi ihe ndị dị n’okwu ya. Ndị mmụta e kenyere ihe omume a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ga-ekenye onye mmụta otu onye inyeaka.
IHE OMUME NKE 4: Minit 5. Onye mmụta kwesịrị ịkọwapụta isiokwu e kenyere ya. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọmụma maka ihe omume a site n’ime nnyocha n’akwụkwọ dị iche iche òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bipụtara. Mgbe ọ bụ nwanna nwoke ka e kenyere ya, a pụrụ ime ihe omume a dị ka okwu, na-eburu ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’uche. Mgbe e kenyere nwanna nwanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya mgbe nile dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3. Biko rịba ama na ọ bụ nanị nwanna nwoke ka e kwesịrị ikenye isiokwu nwere akara “*” n’akụkụ ya ikwu ya dị ka okwu.
IDEBE OGE: Ọ dịghị okwu kwesịrị ịgafe oge e nyere maka ya, okwu onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke 2 ruo nke 4 mgbe oge zuru. Ọ bụrụ na ụmụnna na-ekwu okwu mmeghe metụtara nkà okwu, Ihe Omume nke 1, ma ọ bụ nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible agafee oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha. Mmadụ nile kwesịrị iji nlezianya hụ na ha agafeghị oge ha. Usoro ihe omume ahụ dum ga-ewe minit 45, n’agụnyeghị abụ na ekpere.
NDỤMỌDỤ: 1 minit. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eji ihe na-agafeghị otu minit kwuo okwu na-ewuli elu n’akụkụ kwesịrị ịja mma n’okwu ahụ mgbe onye mmụta nke ọ bụla mesịrị ihe omume ya. Ebumnobi ya abụghị nanị ịsị ya “i meela” kama ịdọrọ uche gaa kpọmkwem n’ihe ndị mere ka akụkụ ahụ nke okwu ya dị irè. Dị ka mkpa nke onye mmụta ọ bụla si dị, a pụrụ inyekwu ya ndụmọdụ na-ewuli elu nke na-agaghị abụ n’ihu ọha mgbe a gbasasịrị nzukọ ma ọ bụ n’oge ọzọ.
ONYE NDỤMỌDỤ INYEAKA: Òtù ndị okenye pụrụ ịhọrọ onye okenye ruru eru, ma ọ bụrụ na e nwere, tụkwasị n’onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ inyeaka. Ọrụ ya ga-abụ inye ụmụnna mere Ihe Omume nke 1 na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere na Bible ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha, ma ọ́ dị mkpa. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-enye ndụmọdụ mgbe ọ bụla ndị okenye ibe ya ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi kwusịrị nke ọ bụla n’ime okwu ndị ahụ. Ndokwa a ga-adị irè n’afọ 2003, e nwekwara ike ịhazigharị ya mgbe e mesịrị.
FỌM NDỤMỌDỤ OKWU: Ọ dị n’akwụkwọ ọgụgụ ahụ.
NTỤLEGHACHI: Minit 30. N’ọnwa abụọ ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi. Tupu e mewe ya, a ga-ebu ụzọ tụlee otu nkà okwu na isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible dị ka a kọwapụtara n’elu. Ntụleghachi ahụ ga-adabere n’ihe a tụlere n’ụlọ akwụkwọ n’ime ọnwa abụọ bu ya ụzọ, gụnyere izu ahụ a nọ na ya.
USORO IHE OMUME
Jan. 6 Ọgụgụ Bible: Matiu 1-6 Abụ nke 91
Nkà Okwu: Anyị Na-anabata Gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (be-IB p. 5 para. 1–p. 8 para. 1)
Nke 1: Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke (be-IB p. 9 para. 1-5)
Nke 2: Matiu 4:1-22
Nke 3: Ihe Ịlaghachi n’Ájá Pụtara n’Ezie (kl-IB p. 82-83 para. 7-10)
Nke 4: Gịnị Ka Jizọs Na-eme Ugbu A?
Jan. 13 Ọgụgụ Bible: Matiu 7-11 Abụ nke 40
Nkà Okwu: Na-agụ Bible Kwa Ụbọchị (be-IB p. 10 para. 1−p. 12 para. 3)
Nke 1: “Na-agbanụ Otú A” (w01-IB 1/1 p. 28-31)
Nke 2: Matiu 9:9-31
Nke 3: Ihe Mere Anyị Na-eji Ekwusara Ndị Ọzọ Ozi Ọma
Nke 4: Gịnị Bụ Ọnọdụ nke Ndị Nwụrụ Anwụ? (kl-IB p. 83-84 para. 11-14)
Jan. 20 Ọgụgụ Bible: Matiu 12-15 Abụ nke 133
Nkà Okwu: Ịgụzi Ihe Agụzi (be-IB p. 83 para. 1-5)
Nke 1: Ị Pụrụ Ịnagide Nkụda Mmụọ! (w01-IB 2/1 p. 20-23)
Nke 2: Matiu 13:1-23
Nke 3: A Ga-akpọlite Ndị Nile Nọ ná Ncheta Jehova n’Ọnwụ (kl-IB p. 85-87 para. 15-18)
Nke 4: Chineke Ọ̀ Na-agbanwe Agbanwe?
Jan. 27 Ọgụgụ Bible: Matiu 16-21 Abụ nke 129
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Gụzie Ihe Agụzi (be-IB p. 84 para. 1–p. 85 para. 3)
Nke 1: Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Omume Ọma (w01-IB 1/15 p. 4-7)
Nke 2: w01-IB 1/15 p. 20 para. 20–p. 21 para. 24
Nke 3: Gịnị Ga-eme Ka Ụwa Dị n’Otu?
Nke 4: Mbilite n’Ọnwụ Gaa n’Ebee? (kl-IB p. 88-89 para. 19-22)
Feb. 3 Ọgụgụ Bible: Matiu 22-25 Abụ nke 139
Nkà Okwu: E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya (be-IB p. 86 para. 1-6)
Nke 1: “Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị” (be-IB p. 13 para. 1–p. 14 para. 5)
Nke 2: Matiu 22:15-40
Nke 3: Alaeze Chineke na Nzube Ya (kl-IB p. 90-91 para. 1-5)
Nke 4: Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi, nke Nwekwara Uche?
Feb. 10 Ọgụgụ Bible: Matiu 26-28 Abụ nke 27
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Kwuo Okwu n’Ụzọ Doro Anya (be-IB p. 87 para. 1–p. 88 para. 3)
Nke 1: Ụzọ E Si Achọta Ezi Obi Ụtọ (w01-IB 3/1 p. 4-7)
Nke 2: Matiu 26:6-30
Nke 3: Ihe Mere na Mụ Adịghị Eji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe
Nke 4: Alaeze Chineke Bụ Ọchịchị (kl-IB p. 91-92 para. 6-7)
Feb. 17 Ọgụgụ Bible: Mak 1-4 Abụ nke 137
Nkà Okwu: Ịkpọzi Okwu Akpọzi—Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche (be-IB p. 89 para. 1–p. 90 para. 2)
Nke 1: Ngọzi Alaeze Pụrụ Ịbụ nke Gị (w01-IB 4/1 p. 5-7)
Nke 2: w01-IB 2/15 p. 25 para. 10–p. 26 para. 14
Nke 3: Otú Anyị Si Mara na Alaeze Chineke Bụ Ezie (kl-IB p. 92-93 para. 8-11)
Nke 4: Ihe Mere Ịgba Chaa Chaa Ji Dị Njọ
Feb. 24 Ọgụgụ Bible: Mak 5-8 Abụ nke 72
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Na-akpọ Okwu nke Ọma Karị (be-IB p. 90 para. 4–p. 92)
Ntụleghachi
Mar. 3 Ọgụgụ Bible: Mak 9-12 Abụ nke 195
Nkà Okwu: Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ (be-IB p. 93 para. 1–p. 94 para. 3)
Nke 1: Ịṅa Ntị n’Okwu, Mgbe A Na-eme Ntụle, Nakwa ná Mgbakọ Dị Iche Iche (be-IB p. 15 para. 1–p. 16 para. 5)
Nke 2: Mak 10:1-22
Nke 3: Otú Anyị Pụrụ Isi Nweta Ike Site n’Aka Chineke
Nke 4: Ihe Mere Alaeze Chineke Ji Bụrụ Nanị Olileanya Ihe A Kpọrọ Mmadụ Nwere (kl-IB p. 94-95 para. 12-13)
Mar. 10 Ọgụgụ Bible: Mak 13-16 Abụ nke 187
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Na-ekwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ Karị (be-IB p. 94 para. 4–p. 96 para. 3, e wezụga igbe dị na p. 95)
Nke 1: Gịnị Bụ Paradaịs Ime Mmụọ? (w01-IB 3/1 p. 8-11)
Nke 2: Mak 13:1-23
Nke 3: Ihe Mere Jizọs Amaliteghị Ịchị Ozugbo Ọ Rịgosịrị n’Eluigwe (kl-IB p. 95-96 para. 14-15)
Nke 4: Chineke Ọ̀ Na-akwado Akụkụ Ọ Bụla n’Agha Ụmụ Mmadụ Na-alụ?
Mar. 17 Ọgụgụ Bible: Luk 1-3 Abụ nke 13
Nkà Okwu: Ịnagide Ịsụ Nsụ (be-IB p. 95, igbe)
Nke 1: “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ” (w01-IB 3/15 p. 25-28)
Nke 2: Luk 3:1-22
Nke 3: Ò Kwesịrị Ekwesị Ife Jizọs Ofufe?
Nke 4: Olee Mgbe Oge nke Mba Ọzọ Malitere, Oleekwa Mgbe Ọ Gwụrụ? (kl-IB p. 96-97 para. 16-18)
Mar. 24 Ọgụgụ Bible: Luk 4-6 Abụ nke 156
Nkà Okwu: Nkwụsịtụ Iji Kebie Okwu na Maka Mgbanwe Echiche (be-IB p. 97 para. 1–p. 98 para. 5)
Nke 1: Ọ̀ Na-adị Gị Ka A Na-aghọtahie Gị? (w01-IB 4/1 p. 20-23)
Nke 2: Luk 6:1-23
Nke 3: Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ (kl-IB p. 98-99 para. 1-4)
Nke 4: Ndị Kraịst Hà Pụrụ Ịtụ Anya Nchebe Chineke?
Mar. 31 Ọgụgụ Bible: Luk 7-9 Abụ nke 47
Nkà Okwu: Nkwụsịtụ Iji Mesie Okwu Ike, Nkwụsịtụ Iji Ṅaa Ntị (be-IB p. 99 para. 1–p. 100 para. 4)
Nke 1: “Tụọ Egwu Ezi Chineke ahụ, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu” (be-IB p. 272 para. 1–p. 275 para. 3)
Nke 2: w01-IB 3/15 p. 18 para. 17–p. 19 para. 20
Nke 3: Otú Anyị Si Mara na Bible Sitere n’Aka Chineke
Nke 4: Gịnị Bụ Akụkụ Ụfọdụ nke Mgbe Ikpeazụ? (kl-IB p. 99-103 para. 5-7)
Apr. 7 Ọgụgụ Bible: Luk 10-12 Abụ nke 68
Nkà Okwu: Imesi Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị (be-IB p. 101 para. 1–p. 102 para. 3)
Nke 1: “Ịgba Àmà Banyere Jizọs” (be-IB p. 275 para. 4–p. 278 para. 4)
Nke 2: Luk 10:1-22
Nke 3: E Buru Amụma na A Ga-enwe Omume Rụrụ Arụ nke Ụmụ Mmadụ na Mgbe Ikpeazụ (kl-IB p. 103-104 para. 8-12)
Nke 4: Akụkụ Abụọ Pụrụ Iche nke Mgbe Ikpeazụ (kl-IB p. 105 para. 13-14)
Apr. 14 Ọgụgụ Bible: Luk 13-17 Abụ nke 208
Nkà Okwu: Inwe Ọganihu n’Imesi Echiche Okwu Ike (be-IB p. 102 para. 4–p. 104 para. 4)
Nke 1: “Ozi Ọma Nke A nke Alaeze” (be-IB p. 279 para. 1–p. 281 para. 4)
Nke 2: Luk 15:11-32
Nke 3: Ụzọ Isi Chebe Onwe Anyị Pụọ n’Ike Ndị Mmụọ Ọjọọ
Nke 4: Mee Ihe Na-adabere n’Ihe Àmà Na-egosi na Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ (kl-IB p. 106-107 para. 15-17)
Apr. 21 Ọgụgụ Bible: Luk 18-21 Abụ nke 23
Nkà Okwu: E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike (be-IB p. 105 para. 1–p. 106 para. 2)
Nke 1: Otú E Si Anagide Mmetụta Ndị Na-ezighị Ezi (w01-IB 4/15 p. 22-24)
Nke 2: w01-IB 4/15 p. 6 para. 19–p. 7 para. 22
Nke 3: Otú Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Si Emetụta Ndụ Anyị
Nke 4: Ndị Ajọ Mmụọ Dị! (kl-IB p. 108 para. 1-3)
Apr. 28 Ọgụgụ Bible: Luk 22-24 Abụ nke 218
Nkà Okwu: Ụda Olu nke Kwesịrị Ndị Na-ege Ntị (be-IB p. 107 para. 1–p. 108 para. 4)
Ntụleghachi
May 5 Ọgụgụ Bible: Jọn 1-4 Abụ nke 31
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Mee Ka Ụda Olu Gị Ka Mma (be-IB p. 108 para. 5–p. 110 para. 2)
Nke 1: Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Icheta Ihe Gị (be-IB p. 17 para. 1–p. 19 para. 1)
Nke 2: Jọn 2:1-25
Nke 3: Chineke Ọ̀ Kagburu Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya?
Nke 4: Ndị Ajọ Mmụọ Na-akwado Setan (kl-IB p. 109 para. 4-5)
May 12 Ọgụgụ Bible: Jọn 5-7 Abụ nke 150
Nkà Okwu: Mgbanwe Ụda Olu—Na-eweli Ma Na-eweda Olu Gị (be-IB p. 111 para. 1–p. 112 para. 2)
Nke 1: Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Agbanyeghị Otú E Si Zụlite Gị (w01-IB 4/15 p. 25-28)
Nke 2: Jọn 5:1-24
Nke 3: Ihe Mere na Ezi Uche Adịghị n’Ozizi nke Ọdịnihu A Kara Aka
Nke 4: Jụ Ụdị Nile nke Mgbaasị (kl-IB p. 111 para. 6-8)
May 19 Ọgụgụ Bible: Jọn 8-11 Abụ nke 102
Nkà Okwu: Mgbanwe Ụda Olu—Na-agbanwe Ọ̀tụ̀tụ̀ Ịgba Ọsọ n’Okwu Gị (be-IB p. 112 para. 3-6)
Nke 1: ‘Site n’Amamihe Ka Ụbọchị Anyị Ga-aba Ụba’ (w01-IB 5/15 p. 28-31)
Nke 2: Jọn 10:16-42
Nke 3: Ihe Mere Bible Ji Akagbu Mgbaasị (kl-IB p. 112-113 para. 9-11)
Nke 4: Ụzọ Isi Nagide Nrụgide
May 26 Ọgụgụ Bible: Jọn 12-16 Abụ nke 24
Nkà Okwu: Mgbanwe Ụda Olu—Na-agbanwe Ọdịdị Ụda Olu Gị (be-IB p. 113 para. 1–p. 114 para. 3)
Nke 1: Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya (w01-IB 5/15 p. 4-8)
Nke 2: w01-IB 5/1 p. 14 para. 4–p. 15 para. 7
Nke 3: Ihe “Abụghị Akụkụ nke Ụwa” Pụtara
Nke 4: Bible Na-ekpughe Otú Ndị Ajọ Mmụọ Si Arụ Ọrụ (kl-IB p. 113-114 para. 12-13)
June 2 Ọgụgụ Bible: Jọn 17-21 Abụ nke 198
Nkà Okwu: Jiri Mmetụta Kwuo Okwu (be-IB p. 115 para. 1–p. 116 para. 4)
Nke 1: Ọrụ Mmụọ Chineke Na-arụ n’Icheta Ihe (be-IB p. 19 para. 2–p. 20 para. 3)
Nke 2: Jọn 20:1-23
Nke 3: Ụzọ Isi Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ (kl-IB p. 114-115 para. 14-15)
Nke 4: Okpukpe A Haziri Ahazi Ọ̀ Dị Mkpa?
June 9 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 1-4 Abụ nke 92
Nkà Okwu: Ịnụ Ọkụ n’Obi Kwesịrị Ihe A Na-ekwu (be-IB p. 116 para. 5–p. 117 para. 4)
Nke 1: Mee Ka Ntụkwasị Obi Gị n’Ebe Jehova Nọ Sikwuo Ike (w01-IB 6/1 p. 7-10)
Nke 2: Ọrụ 4:1-22
Nke 3: Ụzọ Isi Wusie Okwukwe Gị Ike (kl-IB p. 115-116 para. 16-17)
Nke 4: Otú Anyị Si Efe Ofufe Ọ̀ Dị Ihe O Mere n’Anya Chineke?
June 16 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 5-7 Abụ nke 2
Nkà Okwu: Igosi Mmetụta Ịhụnanya (be-IB p. 118 para. 1–p. 119 para. 5)
Nke 1: Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ (w01-IB 6/1 p. 28-31)
Nke 2: Ọrụ 7:1-22
Nke 3: Otú Ndịàmà Jehova Si Dị Iche n’Okpukpe Ndị Ọzọ
Nke 4: Nọgide n’Agha Gị Megide Ndị Ajọ Mmụọ (kl-IB p. 116-117 para. 18-20)
June 23 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 8-10 Abụ nke 116
Nkà Okwu: Igosipụta Mmetụta Uche (be-IB p. 119 para. 6–p. 120 para. 5)
Nke 1: Na-elekọtanụ Ụmụ Mgbei na Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ ná Mkpagbu Ha (w01-IB 6/15 p. 9-12)
Nke 2: w01-IB 6/1 p. 12 para. 1–p. 13 para. 5
Nke 3: Ịdị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke Na-eweta Obi Ụtọ (kl-IB p. 118-119 para. 1-4)
Nke 4: aIhe Mere Ịga Nzukọ Ji Dị Oké Mkpa Maka Uto Ime Mmụọ
June 30 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 11-14 Abụ nke 167
Nkà Okwu: Ịdị Mkpa nke Mmegharị Ahụ́ na Ọdịdị Ihu (be-IB p. 121 para. 1-4)
Ntụleghachi
July 7 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 15-17 Abụ nke 38
Nkà Okwu: Iji Mmegharị Ahụ́ na Ọdịdị Ihu Na-eme Ihe (be-IB p. 122 para. 1–p. 123 para. 2)
Nke 1: N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe? (be-IB p. 21 para. 1–p. 23 para. 3)
Nke 2: Ọrụ 15:1-21
Nke 3: Otú Anyị Si Akwado Ọbụbụeze Jehova
Nke 4: Ịkwụwa Aka Ọtọ Na-arụpụta Obi Ụtọ (kl-IB p. 119-120 para. 5-6)
July 14 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 18-21 Abụ nke 32
Nkà Okwu: Ile Ndị A Na-agwa Okwu Anya n’Ozi Ubi (be-IB p. 124 para. 1–p. 125 para. 4)
Nke 1: Ekwela Ka Inwe Obi Abụọ Bibie Okwukwe Gị (w01-IB 7/1 p. 18-21)
Nke 2: Ọrụ 19:1-22
Nke 3: Mmesapụ Aka Na-eweta Obi Ụtọ (kl-IB p. 120 para. 7-8)
Nke 4: Ihe ‘Ịnọgide Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze ahụ’ Pụtara
July 21 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 22-25 Abụ nke 222
Nkà Okwu: Ile Ndị A Na-agwa Okwu Anya Mgbe A Na-ekwu Okwu (be-IB p. 125 para. 5–p. 127 para. 1)
Nke 1: Ị̀ Na-anagide Ihe n’Ezie? (w01-IB 7/15 p. 21-23)
Nke 2: Ọrụ 24:1-23
Nke 3: Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?
Nke 4: Chebe Ikike Iche Echiche Gị Ma Zere Ihe Ọjọọ (kl-IB p. 121 para. 9-10)
July 28 Ọgụgụ Bible: Ọrụ 26-28 Abụ nke 14
Nkà Okwu: Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu n’Ozi Ubi (be-IB p. 128 para. 1–p. 129 para. 1)
Nke 1: Ị̀ Pụrụ Isi Aṅaa Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Ego? (w01-IB 6/15 p. 5-8)
Nke 2: w01-IB 7/1 p. 14 para. 5-8
Nke 3: Mmadụ Ikwesị Ntụkwasị Obi Nye Onye Òtù Ọlụlụ Ya Na-eweta Obi Ụtọ n’Alụmdi na Nwunye (kl-IB p. 122-123 para. 11-13)
Nke 4: Otú Anyị Si Egosi Nkwanye Ùgwù Maka Onyinye nke Ndụ
Aug. 4 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 1-4 Abụ nke 106
Nkà Okwu: Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu n’Elu Ikpo Okwu (be-IB p. 129 para. 2–p. 130 para. 1)
Nke 1: Ụzọ Ị Ga-esi Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe (be-IB p. 23 para. 4–p. 26 para. 5)
Nke 2: Ndị Rom 2:1-24
Nke 3: Ọ̀ Dịwo Mgbe Ị Dịrị Ndụ Mbụ?
Nke 4: Abụla Akụkụ nke Ụwa (kl-IB p. 123-125 para. 14-15)
Aug. 11 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 5-8 Abụ nke 179
Nkà Okwu: Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu Mgbe Ị Na-agụ Ihe n’Ihu Ọha (be-IB p. 130 para. 2-4)
Nke 1: ‘Ngọzi Nile Na-adịrị Onye Ezi Omume’ (w01-IB 7/15 p. 24-27)
Nke 2: Ndị Rom 5:6-21
Nke 3: Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Na-ejighị Agba Krịsmas Ma Ọ Bụ Na-eme Ememe Ncheta Ọmụmụ (kl-IB p. 126 para. 16-17)
Nke 4: Ì Kwesịrị Ikwere n’Ịlọ Ụwa?
Aug. 18 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 9-12 Abụ nke 206
Nkà Okwu: Ịdị Ọcha Onwe Onye Na-eme Ka Ozi ahụ Nwee Ùgwù (be-IB p. 131 para. 1-3)
Nke 1: Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ́ Baara Gị Uru (w01-IB 8/1 p. 19-22)
Nke 2: w01-IB 8/15 p. 22 para. 10-13
Nke 3: Ụmụ Mmadụ Hà Agbanweela Bible?
Nke 4: Nọgide Na-eme Ememe Nri Anyasi nke Onyenwe Anyị (kl-IB p. 127 para. 18)
Aug. 25 Ọgụgụ Bible: Ndị Rom 13-16 Abụ nke 43
Nkà Okwu: Otú Imeru Ihe n’Ókè na Uche Zuru Òkè Si Emetụta Uwe na Ejiji Mmadụ (be-IB p. 131 para. 4–p. 132 para. 3)
Ntụleghachi
Sept. 1 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 1-9 Abụ nke 48
Nkà Okwu: Uru Uwe E Doziri nke Ọma Bara (be-IB p. 132 para. 4–p. 133 para. 1)
Nke 1: Ụzọ Isi Mụọ Ihe (be-IB p. 27 para. 1−p. 31 para. 2)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 3:1-23
Nke 3: Otú Ụkpụrụ Bible Si Emetụta Ọrụ na Ntụrụndụ (kl-IB p. 127-128 para. 19-20)
Nke 4: Ọ̀ Dị Mgbe Ịda Ogbenye Na-eme Ka Izu Ohi Zie Ezi?
Sept. 8 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Kọrint 10-16 Abụ nke 123
Nkà Okwu: Ezi Ọdịdị Onwe Onye Adịghị Akpata Ịsụ Ngọngọ (be-IB p. 133 para. 2-4)
Nke 1: Merie Ihe Ndị Na-egbochi Gị Inwe Ọganihu! (w01-IB 8/1 p. 28-30)
Nke 2: 1 Ndị Kọrint 12:1-26
Nke 3: Gịnị Mere Chineke Ji Ekwe Ka Ihe Ọjọọ Mee?
Nke 4: Gosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ na Ọbara (kl-IB p. 128-129 para. 21-23)
Sept. 15 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Kọrint 1-7 Abụ nke 16
Nkà Okwu: Ịnọ Otú Dị Mma na Ihe Ndị E Ji Eme Ihe Ndị Dị Mma n’Anya (be-IB p. 133 para. 5–p. 134 para. 4)
Nke 1: Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Oge Ntorobịa Gị (w01-IB 8/15 p. 4-7)
Nke 2: 2 Ndị Kọrint 6:1-7:1
Nke 3: Na-erubere Ịbụisi Kasị Elu Isi Mgbe Nile (kl-IB p. 130-131 para. 1-6)
Nke 4: Mmetọ A Na-emetọ Ụwa Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Ahụ́?
Sept. 22 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Kọrint 8-13 Abụ nke 207
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Belata Nchegbu Ikwu Okwu (be-IB p. 135 para. 1–p. 137 para. 2)
Nke 1: Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Dị Mma (w01-IB 9/1 p. 27-30)
Nke 2: 2 Ndị Kọrint 8:1-21
Nke 3: Gịnị Na-eme Mkpụrụ Obi Mgbe Mmadụ Nwụrụ
Nke 4: Doo Onwe Gị n’Okpuru Ndị Na-achị Isi (kl-IB p. 131-133 para. 7-10)
Sept. 29 Ọgụgụ Bible: Ndị Galeshia 1-6 Abụ nke 163
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Nwee Ahụ́ Iru Ala (be-IB p. 137 para. 3–p. 138 para. 5)
Nke 1: Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe (w01-IB 10/1 p. 4-7)
Nke 2: w01-IB 9/1 p. 15 para. 8–p. 17 para. 11
Nke 3: Jiri Ndokwa Chineke Mere Maka Ịbụisi n’Ime Ezinụlọ Kpọrọ Ihe (kl-IB p. 134-136 para. 11-18)
Nke 4: Otú Anyị Si Mara na Alaeze Chineke Na-achị
Oct. 6 Ọgụgụ Bible: Ndị Efesọs 1-6 Abụ nke 99
Nkà Okwu: Mkpa Ọ Dị Ime Ka Ụda Olu Na-adasikwu Ike (be-IB p. 139 para. 1–p. 140 para. 1)
Nke 1: Ịmụ Ihe Na-enye Ụgwọ Ọrụ (be-IB p. 31 para. 3–p. 32 para. 4)
Nke 2: Ndị Efesọs 2:1-22
Nke 3: Ezi Uche Dị n’Inwe Okwukwe na Chineke
Nke 4: Ịbụisi n’Ime Ọgbakọ—Ndokwa Ịhụnanya Sitere n’Aka Jehova (kl-IB p. 137-139 para. 19-25)
Oct. 13 Ọgụgụ Bible: Ndị Filipaị 1–Ndị Kọlọsi 4 Abụ nke 105
Nkà Okwu: Jiri Ígwè Okwu Na-eme Ihe nke Ọma (be-IB p. 140 para. 3–p. 142 para. 1)
Nke 1: Na-eje Ije ‘n’Ụzọ nke Izi Ezi’ (w01-IB 9/15 p. 24-28)
Nke 2: Ndị Filipaị 2:1-24
Nke 3: Otú Iguzosi Ike n’Ihe Si Eme Ka E Nwee Alụmdi na Nwunye Na-enye Obi Ụtọ (kl-IB p. 140-141 para. 1-6)
Nke 4: Ihe Jehova Na-achọ n’Aka Anyị Taa
Oct. 20 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Tesalonaịka 1-2 Ndị Tesalonaịka 3 Abụ nke 145
Nkà Okwu: Iji Bible Azaghachi (be-IB p. 143 para. 1-3)
Nke 1: Isi Ihe nke Ga-eweta Ụwa Obi Ụtọ (w01-IB 10/15 p. 4-7)
Nke 2: w01-IB 10/15 p. 23 para. 6–p. 24 para. 9
Nke 3: Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?
Nke 4: Ọrụ Dị Oké Mkpa Nkwurịta Okwu Na-arụ n’Alụmdi na Nwunye (kl-IB p. 142-143 para. 7-9)
Oct. 27 Ọgụgụ Bible: 1 Timoti 1-2 Timoti 4 Abụ nke 46
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Jiri Bible Na-eme Ihe nke Ọma Karị (be-IB p. 144 para. 1-4)
Ntụleghachi
Nov. 3 Ọgụgụ Bible: Taịtọs 1–Faịlimọn Abụ nke 30
Nkà Okwu: A Gbara Ume Iji Bible Eme Ihe (be-IB p. 145-146)
Nke 1: Ụzọ Isi Jiri Bible Mee Nnyocha (be-IB p. 33 para. 1–p. 35 para. 2)
Nke 2: Faịlimọn 1-25
Nke 3: Ịdị Ndụ n’Izu Okè Ọ̀ Ga Na-agwụ Ike?
Nke 4: Na-asọpụrụ Ma Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù (kl-IB p. 143-144 para. 10-14)
Nov. 10 Ọgụgụ Bible: Ndị Hibru 1-8 Abụ nke 149
Nkà Okwu: Mkpa Ọ Dị Iwebata Akwụkwọ Nsọ n’Ụzọ Dị Irè (be-IB p. 147 para. 1–p. 148 para. 2)
Nke 1: Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ Chineke (w01-IB 9/15 p. 29-31)
Nke 2: Ndị Hibru 2:1-18
Nke 3: Setịpụ Ezi Ihe Nlereanya Ma Gosi Ụmụ Gị Ịhụnanya (kl-IB p. 145-146 para. 15-18)
Nke 4: Olee Otú A Ga-esi Kpee Ndị E Si n’Ọnwụ Kpọlite Ikpe Dị Ka Omume Ha Si Dị?
Nov. 17 Ọgụgụ Bible: Ndị Hibru 9-13 Abụ nke 144
Nkà Okwu: Ịhọrọ Okwu Kwesịrị Ekwesị Iji Webata Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 148 para. 3–p. 149 para. 2)
Nke 1: Gịnị Ka Ịbụ Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe Pụtara? (w01-IB 10/1 p. 20-23)
Nke 2: Ndị Hibru 9:11-28
Nke 3: Ihe Ịdọ Aka ná Ntị Sitere n’Ịhụnanya na Ezi Ndụmọdụ Pụrụ Ịrụzu (kl-IB p. 148-149 para. 19-23)
Nke 4: Ihe Ime Omume Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ Ji Baa Uru
Nov. 24 Ọgụgụ Bible: Jems 1-5 Abụ nke 88
Nkà Okwu: Mmesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Na-agụnye Mmetụta (be-IB p. 150 para. 1-2)
Nke 1: Ụkpụrụ Ọma Ahụ—Ọ Dị Irè (w01-IB 12/1 p. 4-7)
Nke 2: w01-IB 11/1 p. 12 para. 15–p. 13 para. 19
Nke 3: Uru Mmadụ Ịma Ebe Ikike Ya Jedebere Bara
Nke 4: Ihe Mere Anyị Ji Chọọ Ịbịaru Chineke Nso (kl-IB p. 150-151 para. 1-5)
Dec. 1 Ọgụgụ Bible: 1 Pita 1-2 Pita 3 Abụ nke 54
Nkà Okwu: Mesie Okwu Ndị Kwesịrị Ekwesị Ike (be-IB p. 150 para. 3–p. 151 para. 2)
Nke 1: Ịmụta Iji Ihe Ndị Ọzọ E Ji Eme Nnyocha Eme Ihe (be-IB p. 35 para. 3–p. 38 para. 4)
Nke 2: 1 Pita 1:1-16
Nke 3: Ihe Ndị A chọrọ Iji Bịaruo Chineke Nso (kl-IB p. 152-153 para. 6-9)
Nke 4: Otú Àjà Mgbapụta Kraịst Kwesịrị Isi Emetụta Ndụ Anyị
Dec. 8 Ọgụgụ Bible: 1 Jọn 1–Jud Abụ nke 22
Nkà Okwu: Ụzọ Dị Iche Iche nke Isi Emesi Okwu Ike (be-IB p. 151 para. 3–p. 152 para. 5)
Nke 1: Chebe Akọ na Uche Gị (w01-IB 11/1 p. 4-7)
Nke 2: 1 Jọn 3:1-18
Nke 3: Ihe Mere na A Pụghị Ịta Bible Ụta Maka Ụzọ E Si Emeso Ụmụ Nwanyị n’Enweghị Nkwanye Ùgwù
Nke 4: Gwa Chineke Okwu, Ka Ọ Nụkwa Olu Gị (kl-IB p. 153-155 para. 10-14)
Dec. 15 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 1-6 Abụ nke 219
Nkà Okwu: E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi (be-IB p. 153 para. 1–p. 154 para. 3)
Nke 1: Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe (w01-IB 11/15 p. 28-31)
Nke 2: Mkpughe 2:1-17
Nke 3: Nọgidesie Ike n’Ekpere Ma Gee Ntị (kl-IB p. 156-159 para. 15-20)
Nke 4: Ihe Mere na Krismas Adịghịrị Ndị Kraịst
Dec. 22 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 7-14 Abụ nke 6
Nkà Okwu: Ime Ka Nkọwa Akwụkwọ Nsọ Doo Anya (be-IB p. 154 para. 4–p. 155 para. 4)
Nke 1: Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ (w01-IB 12/1 p. 9-13)
Nke 2: w01-IB 12/15 p. 17 para. 10–p. 18 para. 13 (gụnyere ihe odide ala ala peeji)
Nke 3: Ụzọ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ
Nke 4: Chọta Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Etiti Ndị Chineke (kl-IB p. 160-161 para. 1-4)
Dec. 29 Ọgụgụ Bible: Mkpughe 15-22 Abụ nke 60
Nkà Okwu: Tụgharịa Uche Site n’Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 155 para. 5–p. 156 para. 5)
Ntụleghachi
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Kenye ya nwanna nwoke.