Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite February 10
  • Izu Na-amalite February 17
  • Izu Na-amalite February 24
  • Izu Na-amalite March 3
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 2/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite February 10

Abụ nke 4

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Faithful Under Trials—Jehovah’s Witnesses in the Soviet Union iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke February 24. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 15 na Teta! nke March 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke March 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.

35 min: “Mee Nkwusa Ma Gbaa Àmà nke Ọma.”a Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Gbaa mmadụ nile nwere ike ume ka ha rụọ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka na March na April. Gwa ndị sụrụ ụzọ n’oge Ememe Ncheta gara aga ka ha kwuo okwu. Olee otú ha si hazie ihe iji sụọ ụzọ? Olee mgbalị na nhazigharị ihe nke a chọrọ? Ngọzi na ọṅụ dịgasị aṅaa ka ha nwetara? Tụlee usoro ihe omume nke bụ́ ihe nlereanya ndị dị n’ime igbe dị na peeji nke 4. Maa ọkwa na a pụrụ inweta akwụkwọ ndejupụta maka ịsụ ụzọ inyeaka mgbe e mechiri nzukọ.

Abụ nke 30 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 17

Abụ nke 48

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee akwụkwọ a ga-enyefe na March. Tụọ otu aro ma ọ bụ abụọ maka inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma, na-eji isi ihe ndị sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002 eme ihe. Mesie ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi ike.

7 min: Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.” Maa ọkwa ụbọchị unu ga-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ọzọ, gbaakwa mmadụ nile ume ịbịa n’oge na ịṅa ntị mgbe usoro ihe omume ahụ dum na-aga n’ihu. Gbaa ndị nkwusa nile ume ịkpọ ndị ọhụrụ nwere mmasị na ndị ha na-amụrụ Bible òkù ka ha bịa.

30 min: “Irite Uru n’Ụzọ Zuru Ezu ná Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi.’” Ọ bụ onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-eme ya. Mgbe e kwusịrị okwu mmeghe ga-ewe otu minit, duzie ntụle nke usoro ihe omume mgbakọ distrikti nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, na-eji ajụjụ ndị dị n’isiokwu ahụ eme ihe. Kee oge gị nke ọma. A pụrụ ikwu okwu ndị dị mkpirikpi iji chetaghachiri ndị na-ege ntị isi ihe ndị e kwuru. Mgbe o kwesịrị ekwesị, jụọ ndị na-ege ntị otú ha siworo na-etinye ihe ndị ha mụtara n’ọrụ nakwa uru ndị ha na-erite site n’ime otú ahụ.

Abụ nke 194 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 24

Abụ nke 74

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka February. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 1 na Teta! nke March 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke March 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.

10 min: “Enyemaka nke Bịara n’Ezi Oge.” Okwu okenye ga-ekwu. Kọwapụta mgbalị pụrụ iche a na-eme iji nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ịhụ mmetụta ịhụnanya Jehova nwere maka ndị ya.

25 min: “Vidio nke Ga-eme Ka Ị Mụta Ihe Ma Kpalie Gị Ime Ihe!” Gaa ozugbo ná ntụle nke vidio bụ́ Faithful Under Trials nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, na-eji ajụjụ ndị e depụtara eme ihe. Jiri nlezianya kee oge e nyere maka ihe omume ahụ ka ọtụtụ ndị wee nwee ohere ikwu okwu n’ajụjụ nke ikpeazụ. Mechie site ịgụpụta igbe dị na peeji nke 192 nke 2002 Yearbook. N’ọnọdụ ya, tụlee “Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ọnwụnwa Anya?” Okwu onye okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke September 1, 2002, peeji nke 29-31.

Abụ nke 56 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 3

Abụ nke 14

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ná mkpirikpi “Ndokwa Ọhụrụ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Kpọọ aha onye ga na-eje ozi dị ka onye na-elekọta ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Gịnị Ka Ị Na-ebute Ụzọ?”b Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kwuo otú ha siworo nwee ike ịhazigharị ọnọdụ ha iji nwee ike ikerekwu òkè n’ozi.

Abụ nke 57 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya