Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite March 10
  • Izu Na-amalite March 17
  • Izu Na-amalite March 24
  • Izu Na-amalite March 31
  • Izu Na-amalite April 7
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 3/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite March 10

Abụ nke 5

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 15 na Teta! nke April 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke April 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.

15 min: Tụlee akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Kọwaa ndokwa nke iji akwụkwọ ọhụrụ ahụ mee ihe dị ka akwụkwọ nke abụọ a ga-amụ. (km-IB 6/00 p. 4 para. 5-6) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ ahụ ndị ha nwere mmasị na ha. Kọwapụta na akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ ahụ na-eji ajụjụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ eme ihe iji mee ka onye mmụta chemie echiche n’Okwu Chineke. Gosi ihe atụ dị na peeji nke 47-49, paragraf nke 13.

20 min: “Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!”a (Paragraf nke 1-12) Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 6, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke onye nkwusa na-akpọ onye ikwu, onye agbata obi, nwa akwụkwọ ibe ya, ma ọ bụ onye ọrụ ibe ya òkù ịbịa Ememe Ncheta, na-eji akwụkwọ ịkpọ òkù eme ihe. Ọ bụrụ na e kesabeghị akwụkwọ ịkpọ òkù, e kwesịrị ike akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ememe Ncheta mgbe nzukọ mechisịrị.

Abụ nke 19 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 17

Abụ nke 34

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara ọnwa March.

15 min: Irite Uru Site na 2003 Yearbook. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Tụlee isi ihe ndị dị ‘n’Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi’ nke ya na Ozi Alaeze Anyị nke February 2003 so. Tụọ aro ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi duzie ndị ọhụrụ gaa ná nzukọ Jehova ma gbaa ha ume ịga nzukọ dị iche iche.

20 min: “Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!”b (Paragraf nke 13-26) Ọ bụ onyeisi oche ndị nlekọta ga-eme ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 14, mee ihe ngosi dị mkpirikpi ebe otu onye okenye gara ileta otu nwanna nwoke na-adịkwaghị ike iji gbaa ya ume, n’oge nleta ahụ, o jiri obiọma kọwaa otú nwanna nwoke ahụ pụrụ isi kere òkè n’ọrụ ka ukwuu ọgbakọ ga-arụ n’oge Ememe Ncheta.

Abụ nke 53 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 24

Abụ nke 72

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 1 na Teta! nke April 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke April 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: Ndịàmà Jehova—Ndị Na-enwe Mmetụta Dị Mma n’Obodo. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe ohere ịkọwa otú ozi anyị na ihe nlereanya anyị si abara obodo uru. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’isi ihe ndị na-esonụ: (1) Anyị na-akụziri ndị mmadụ ibi ndụ dị ka ụkpụrụ omume Bible banyere omume ọma si dị. (2) Anyị na-akụzi ịkwụwa aka ọtọ na irubere ndị ọchịchị isi. (3) Anyị na-akụzi ịdị n’otu n’etiti ndị si n’agbụrụ, mba, na ìgwè dị iche iche. (4) Anyị na-enyere ndị ọzọ aka ime ka ndụ ezinụlọ ha ka mma site n’ịgba ha ume itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. (5) Anyị akụziworo ọtụtụ puku mmadụ otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. (6) Anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ inyere ndị ọzọ aka mgbe e nwere ọdachi. (7) Anyị ekerewo òkè dị mkpa n’ime ka e nwee nnwere onwe ikpe okpukpe bụ́ nke mmadụ nile na-anụ ụtọ ya.—Lee akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 699.

Abụ nke 121 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 31

Abụ nke 130

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ngwụsị ọnwa March. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’April, karịsịa mee ka a mata na e kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji akwụkwọ Fee Chineke Ofufe malitere ndị mụworo akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ ọmụmụ Bible. Tụlee isi ihe ndị dị ‘n’Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta.’

13 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Gwa ọgbakọ ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere n’oge a rụrụ ọrụ ka ukwuu na March. Jaa ha mma maka mgbalị ha tinyere, gbaakwa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu dị ka ọnọdụ ha nyere ha ohere ya n’April.

20 min: “Jehova Bụ Onye A Ga-eto nke Ukwuu.”c Mesie mkpa Ememe Ncheta ahụ dị ike. Gosi otú mmadụ nile pụrụ isi nye aka n’inyere ndị ọzọ aka ịbịa. Kọwaa ihe a pụrụ ime iji kpọtụrụ ndị na-adịghị ejekwa ozi iji tụteghachi mmasị ha. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla na-agba ume ha nwere n’ememe nke afọ gara aga.

Abụ nke 173 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 7

Abụ nke 191

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Ememe Ncheta—Oge Ịtụgharị Uche nke Ọma.”

15 min: Ụzọ Isi Na-atụgharị Uche Site n’Akwụkwọ Nsọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ikike nke isoro ndị anyị na-ezute n’ozi na-atụgharị uche n’ụzọ dị irè? (1) Nweta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ ịgba site n’inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya na ịgachi nzukọ anya. (2) Na-atụgharị uche n’ihe ị na-amụta, na-enyocha eziokwu site n’akụkụ dịgasị iche iche. (3) Achọla nanị nkọwa nke Akwụkwọ Nsọ kamakwa ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere e ji nye nkọwa ndị ahụ. (4) Chee echiche otú ị ga-esi kọwaara ụdị mmadụ dịgasị iche iche Akwụkwọ Nsọ. (5) Chee echiche otú ị pụrụ isi mee ihe atụ iji kọwaa isi ihe ụfọdụ.

20 min: “Otú Eziokwu Si Eme Ka Anyị Nwere Onwe Anyị.”d Gụnye ihe ndị e kwuru n’igbe dị na peeji nke 6 n’Ụlọ Nche nke October 1, 1998. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú eziokwu sitere n’Okwu Chineke si wetara ha nnwere onwe.

Abụ nke 217 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya