Otú Eziokwu Si Mee Ka Anyị Nwere Onwe Anyị
1 N’otu oge, Jizọs gwara ndị Juu, bụ́ ndị kweere na ya, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Ọ na-ekwu banyere nnwere onwe nke karịrị nanị ihe ndị ruuru mmadụ, nnwere onwe nke dịịrị mmadụ nile—ma ndị bara ọgaranya ma ndị dara ogbenye, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ. Jizọs kụziri eziokwu ndị ga-eweta nnwere onwe pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. Dị ka Jizọs kọwara, “onye ọ bụla na-eme mmehie bụ ohu nke mmehie.” (Jọn 8:34) Lee otú o si na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ oge ahụ mgbe ‘a ga-eme ka ụmụ mmadụ nile na-erube isi nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke’!—Rom 8:21.
2 Eziokwu banyere Jizọs na òkè ọ na-ekere ná mmezu nke nzube Chineke na-eweta nnwere onwe dị otú ahụ. Ọ na-agụnye ịmata banyere àjà mgbapụta ọ chụrụ n’ihi anyị. (Rom 3:24) Ọbụna ugbu a, ịnakwere na iji nrubeisi na-ekwenyere eziokwu Bible na-eme ka anyị nwee ike inweta ọ̀tụ̀tụ̀ nnwere onwe ụfọdụ pụọ n’ụjọ, obi nkoropụ, na ụdị omume dị iche iche na-emerụ ahụ́.
3 Nnwere Onwe Pụọ n’Ụjọ na Obi Nkoropụ: Anyị ekwesịghị inwe obi nkoropụ n’ihi ọnọdụ ụwa n’ihi na anyị maara ihe mere ajọ omume ji dịrị, anyị makwaara na a ga-ekpochapụ ya n’ụwa n’isi nso. (Ọma 37:10, 11; 2 Tim. 3:1; Mkpu. 12:12) Ọzọkwa, eziokwu ahụ na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ozizi ụgha banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Anyị maara na ndị nwụrụ anwụ apụghị imerụ anyị ahụ́, na ha anọghị ná mmekpa ahụ́ ebighị ebi, nakwa na Chineke anaghị eme ka ndị mmadụ nwụọ ka ha wee soro ya biri n’ógbè ndị mmụọ.—Ekli. 9:5; Ọrụ 24:15.
4 Eziokwu dị otú ahụ nyeere otu nne na nna aka ịtachi obi mgbe nwa ha nwụrụ n’otu ihe ọghọm. “E nwere oghere ná ndụ anyị nke a na-apụghị imechi emechi ruo mgbe anyị hụrụ nwa anyị ọzọ site ná mbilite n’ọnwụ,” ka nne ya kwuru. “Ma anyị maara na iru újú anyị ga-adịru nanị nwa oge.”
5 Nnwere Onwe Pụọ n’Omume Ndị Na-emerụ Ahụ́: Eziokwu Bible pụrụ ịgbanwe otú mmadụ si eche echiche na ụdị onye ọ bụ, mee ka o nwere onwe ya pụọ ná nsogbu ndị a pụrụ izere ezere. (Efe. 4:20-24) Ime ihe n’eziokwu na ịgba mbọ pụrụ inye aka belata ịda ogbenye. (Ilu 13:4) Igosipụta ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà na-eme ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya ka mma. (Kọl. 3:13, 14) Ịsọpụrụ ụkpụrụ ịbụisi nke Ndị Kraịst na-ebelata nsogbu ezinụlọ. (Efe. 5:33–6:1) Izere ịṅụbiga mmanya ókè, mmekọahụ rụrụ arụ, ụtaba na ọgwụ ndị na-eri ahụ́ na-eme ka e nwee ezi ahụ́ ike.—Ilu 7:21-23; 23:29, 30; 2 Kọr. 7:1.
6 Otu nwa okorobịa akwụsịlighị ịṅụ ọgwụ ọjọọ nke riworo ya ahụ́ ruo afọ itoolu. Otu ụbọchị, o zutere otu onye nkwusa nọ na-agba àmà n’okporo ámá. Ọ natara akwụkwọ, e mekwara ndokwa ịkpọtụrụ ya n’ebe obibi ya. A malitere iduziri ya ọmụmụ Bible. Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ kwụsiri ịṅụ ọgwụ ọjọọ kpam kpam, mgbe ọnwa asatọ gasịkwara, e mere ya baptizim. Ịhụ na ọ kwụsịwo àgwà ahụ riri ya ahụ́ kpaliri nwanne ya nwoke na nwunye nwanne ya nwoke ahụ ịmalite ịmụ Bible.
7 Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Nnwere Onwe: Ọ pụrụ isiri ndị bụ ohu nye ozizi ụgha kemgbe ndụ ha nile ike ịghọta nnwere onwe nke Okwu Chineke na-enye. Iru ha n’obi pụrụ ịchọ ịdị nnọọ uchu pụrụ iche na ime ezi nkwadebe n’aka onye na-akụziri ha ihe. (2 Tim. 4:2, 5) Ugbu a abụghị oge iselata aka n’ọrụ anyị nke “ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha.” (Aịsa. 61:1) Nnwere onwe Ndị Kraịst dị oké ọnụ ahịa. Inweta ya pụtara inweta ndụ ebighị ebi.—1 Tim. 4:16.