Ememe Ncheta—Oge Ịtụgharị Uche nke Ọma
Ntakịrị oge ka Jizọs guzobesịrị ememe nri anyasị nke Onyenwe anyị, e jidere ya, mesịakwa gbuo ya. Ọ bụghị oge ime oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ oge ịtụgharị uche nke ọma. Ọ dịghị ebe ọ bụla e zoro aka n’ime Bible ebe e nwere oriri na ọṅụṅụ mgbe e mesịrị ememe nri anyasị ahụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst guzobere. Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ndokwa inwe ụdị oriri na ọṅụṅụ ọ bụla dị otú ahụ tupu ma ọ bụ mgbe e mesịrị Ememe Ncheta.
Ememe Ncheta abụghị nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. N’ihi ya, ọ gaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị ka ọgbakọ mee ndokwa isi nri ma ọ bụ ka ndị nkwusa kpọọ ibe ha òkù maka ntụrụndụ na egwú. Nke a pụrụ ime ka ndị na-abụghị Ndịàmà na-ekwu na ọ bụ “Krismas Ndịàmà Jehova.” Nke a pụrụ ịbụ ihe ịsụ ngọngọ. (1 Kọr. 8:12, 13; 10:23, 24) Ememe Ncheta abụghị oge maka mmadụ isi “nri pụrụ iche.” Mmadụ isi ọnwụ na ya ga-enwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ n’ụbọchị Ememe Ncheta n’echebaraghị akọ na uche ndị ọzọ echiche agaghị abụ iṅomi Kraịst, bụ́ onye ‘na-emeghị ihe masịrị ya onwe ya.’ (Rom 15:2, 3) E kwesịghị ijikọta ihe ndị dị otú ahụ n’Ememe Ncheta nke na-ewetara Jehova nsọpụrụ.
Olee otú anyị pụrụ isi mee ka Ememe Ncheta bụrụ oge maka ịtụgharị uche nke ọma n’ụzọ ndụ nke anyị, dị ka Ndị Kraịst? Anyị pụrụ ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị jiworo ndụ anyị mee nakwa ihe ndị anyị ga-eji ya mee n’ọdịnihu. Anyị pụrụ ime ka mkpebi anyị mere ime uche Jehova n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ sikwuo ike. Nke ka nke, anyị pụrụ ịtụgharị uche n’ụzọ miri emi n’ịhụnanya Jehova n’inye ihe mgbapụta ahụ, nakwa n’ịhụnanya Jizọs, bụ́ onye ji ọchịchọ obi ya kwụọ ihe mgbapụta ahụ ka anyị wee nwee ike inwe olileanya. (Jọn 15:13; Fil. 2:7, 8) Lee ihe na-agba ume na ihe na-akpali akpali ọ bụ iche echiche banyere ndokwa a magburu onwe ya!—1 Jọn 4:11.