Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite April 14
  • Izu Na-amalite April 21
  • Izu Na-amalite April 28
  • Izu Na-amalite May 5
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 4/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite April 14

Abụ nke 20

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara ọnwa April. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 15 na Teta! nke May 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke May 8, 2003, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.

10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ga-ekwu.

20 min: “Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè.”a Mechie site n’ikwu okwu ga-ewe minit ise nke dabeere n’Ụlọ Nche nke June 1, 1997, peeji nke 14-15, paragraf nke 8-13. Mesie ya ike ihe mere anyị ji ezere izo ihe ọ bụla mgbe a bịara n’ihe banyere ozi Alaeze ahụ.

Abụ nke 134 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 21

Abụ nke 25

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Ndị E Ritere n’Uru n’Ekwughị Okwu Ọ Bụla. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Àgwà ọma Ndị Kraịst bụ àmà dị ike. Ọ kpaliwo ụfọdụ ndị di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe ịghọ ndị na-efe Jehova. (1 Pita 3:1, 2) Kọọ ahụmahụ ndị dị n’Ụlọ Nche nke January 1, 1999, peeji nke 4; Ụlọ Nche nke October 1, 1995, peeji nke 10-11 nakwa na 1995 Yearbook, peeji nke 46. Mee ndokwa tupu oge eruo ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo ihe ndị dị mma ha hụworo si n’ịgbaso ndụmọdụ Bible n’akụkụ a pụta.

20 min: “Mee Ohere Maka Ya.”b Gụnye ịgba otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị ji alụghị di ma ọ bụ nwunye ha eme ihe nke ọma iji na-eme ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na-aga n’ihu. Gwa ha ka ha kwuo ihe na-enyere ha aka inweta afọ ojuju n’ozi ha.

Abụ nke 35 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 28

Abụ nke 51

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ngwụsị ọnwa April. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 1 na Teta! nke May 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke May 8, 2003, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe.

35 min: “Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?” Okwu na-agba ume nke ndị na-ege ntị ga na-etinye ọnụ na ya site n’oge ruo n’oge site n’ịza ajụjụ ndị a kwadebere na paragraf nke 11 na nke 16-21. Gbaa ndị mụrụ ụmụ ume inyere ụmụ ha aka ịtụle iwere ozi Betel dị ka ọrụ ha ga-arụ. Tụọ aro ka ezinụlọ nile mụkọọ ihe ntinye a ọnụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha.

Abụ nke 197 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 5

Abụ nke 120

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na May. Tụlee “Jiri Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe Na-eduzi Ọmụmụ Bible.”

20 min: “Nletaghachi Na-eduga n’Ọmụmụ Bible.”c Ọ bụ okenye ga-eme ya, na-eji ajụjụ ndị e depụtara eme ihe. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ná mkpirikpi ahụmahụ ndị ha nwetara n’ozi ubi bụ́ ndị na-akwado ihe a na-ekwu. Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, meghachi otu ahụmahụ e nwetara n’ókèala unu bụ́ ebe a malitere ọmụmụ Bible.

15 min: Akụkọ Ọma—Ihe Na-akpata Ịṅụrị Ọṅụ. (Ilu 15:30) Mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke na-egosi ihe ọgbakọ rụzuru n’ihi mgbalị pụrụ iche e tinyere na March na April. Gwa ọgbakọ ka ha kọọ ahụmahụ ndị na-agba ume ha nwetara n’akụkụ ndị na-esonụ: (1) inyere onye nwere mmasị aka ịbịa Ememe Ncheta, (2) ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, (3) ịgba onye nkwusa na-adịghị ejekwa ozi ume ịmaliteghachi isoro ọgbakọ na-eje ozi, (4) inyere onye ọhụrụ aka ịmalite ime nkwusa, na (5) ịzụlite mmasị nke ndị bịara Ememe Ncheta. Mee ndokwa maka ndị ga-akọ ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị a tupu oge eruo. Jaa mmadụ nile mma, gbaakwa ha ume ịnọgide na-etinye mgbalị ndị a n’ọrụ n’ọdịnihu.

Abụ nke 126 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya