Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite May 12
Abụ nke 1
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara ọnwa May. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 15 na Teta! nke June 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke June 8, 2003, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. Hotakwa ndokwa nke inye onyinye.
20 min: Ndị Nne na Nna—Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Inwe Ọganihu. A ga-atụle isi ihe ndị sitere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 9-12 na peeji nke 21-38. Gbaa ndị nne na nna ume iji ụfọdụ n’ime ihe ọmụma a mee ihe n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha, n’ebumnobi nke ịzụ ụmụ ha inwe ọganihu n’ozi. Dọrọ uche gaa n’isi ihe ụfọdụ kpọmkwem ndị a pụrụ iji nyere ndị na-eto eto aka ịzụlite nkà ndị dị mkpa.
15 min: “Ndị E Nyefere Ozi Ọma ahụ n’Aka.”a Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kọọ ná nkenke otú ha si nwee ike ịhazigharị ihe iji mụbaa òkè ha na-ekere n’ọrụ nkwusa ahụ.
Abụ nke 46 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 19
Abụ nke 62
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Too Jehova Site n’Ịgba Àmà Mberede.” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, jụọ ndị na-ege ntị ihe a pụrụ ikwu iji malite mkparịta ụka dabeere na Bible n’ụfọdụ n’ime ọnọdụ ndị na-esonụ: (1) mgbe mmadụ nọ n’ahịa, (2) mgbe mmadụ nọ n’ụgbọ njem ọha na-eze, (3) mgbe mmadụ na-agwa onye agbata obi ya nke na-arụ ọrụ gburugburu ụlọ ya okwu, (4) mgbe mmadụ na-agwa onye ọrụ ibe ya okwu n’ebe ha na-arụ ọrụ, (5) mgbe mmadụ na-agwa nwa klas ya okwu n’ụlọ akwụkwọ. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa kọọ ahụmahụ o nwere n’ókèala unu bụ́ nke na-egosi otú o si gbaa àmà mberede n’ụzọ gara nke ọma.
20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Nye Chineke Otuto’ nke Ndịàmà Jehova nke 2003.”b Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya, na-elekwasị anya na paragraf nke 3-13. Mgbe a na-atụle paragraf nke 13, mesie ya ike na ọ bụ odeakwụkwọ bụ onye nhazi nke okwu metụtara mgbakọ n’ọgbakọ. Jaa mmadụ nile mma nke ọma maka ime ndokwa maka mgbakọ ngwa ngwa o kwere mee.
Abụ nke 147 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 26
Abụ nke 174
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ngwụsị ọnwa May. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke June 1 na Teta! nke June 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke June 8, 2003, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. Ná ngwụsị nke otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, nye onye nwe ụlọ bụ́ onye na-anaraghị magazin ndị ahụ traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible?
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Okwu Chineke Bụ Eziokwu.”c Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Jụọ ndị na-ege ntị otú e si nyere ha aka ịmụta eziokwu ahụ mgbe ndị nkwusa ji Bible zaa ajụjụ ha. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ a ga-esi jiri Bible mee ihe ná nleta nke mbụ, na-eji ụfọdụ n’ime aro ndị dị n’isiokwu bụ́ “Na-ekwuzi Okwu Chineke Ekwuzi” eme ihe.—km-IB 12/01 p. 1 para. 3-4.
Abụ nke 188 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 2
Abụ nke 210
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi otu aro ma ọ bụ abụọ sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002 banyere inyefe broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma.
20 min: Alụmdi na Nwunye Dị Nsọpụrụ—Ihe Chineke Chọrọ. Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. N’ọtụtụ ala, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ nwoke na nwanyị ibikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Ụfọdụ na-azọrọ na nke a bara uru. Mee ka echiche Bible pụta ìhè, na-emesi ya ike na ọ bụ Chineke guzobere alụmdi na nwunye. (rs-E p. 248-249) Ibikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye bụ ịkwa iko. ( fy-IB p. 17) N’ụzọ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere, nchọpụta na-egosi na ibikọ ọnụ tupu a lụọ di na nwunye na-ebelata ohere e nwere na alụmdi na nwunye ahụ ga-enwe ihe ịga nke ọma. (g02-E 3/8 p. 29; g92-E 9/8 p. 28; g91-E 5/8 p. 28) Ndị Kraịst na-asọpụrụ Jehova site n’ime ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ ya. Site n’ime otú ahụ, ha onwe ha na-erite uru.—Aịsa. 48:17, 18.
15 min: Olee Otú I Si Erite Uru? Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eme. Malite na January, anyị malitere iji ụzọ ọhụrụ nke isi na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-eme ihe. Tụleghachi ná mkpirikpi ụfọdụ n’ime ihe ndị ọhụrụ e nwere n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Kọwapụta abamuru ndị e nwetaworo na ya ka ọ dị ugbu a. È nwewo ndị ọhụrụ denyere aha ha n’ụlọ akwụkwọ a? È nwewo ọchịchọ ka ukwuu ikere òkè? Olee otú ndị mmụta si erite uru ná ndokwa ọhụrụ ahụ e mere maka inye ndụmọdụ? Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ha onwe ha siworo rite uru ka ọ dị ugbu a nakwa ụzọ ha chere ihe omume ọhụrụ a ga-esi nyere ha aka n’ọdịnihu.
Abụ nke 225 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.