Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite June 9
  • Izu Na-amalite June 16
  • Izu Na-amalite June 23
  • Izu Na-amalite June 30
  • Izu Na-amalite July 7
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 6/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite June 9

Abụ nke 81

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke June 15 na Teta! nke July 8. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. Gụọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mgbe a na-eche nke ọ bụla n’ime ha n’ihu mmadụ.

18 min: “Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Kọwapụta ụzọ dị iche iche broshuọ ọhụrụ a ga-esi dị irè n’ókèala ọgbakọ unu nakwa n’iji duzie ọmụmụ Bible. Gụnye ihe ngosi nke ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ nke ga-ewe minit atọ, na-eji otu n’ime ihe ọmụmụ ndị dị n’ime broshuọ a na otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ dabara n’isiokwu ahụ eme ihe. Gbaa mmadụ nile ume ikesa n’ụzọ sara mbara na iji broshuọ ọhụrụ a a kwadebere karịsịa maka iji jee ozi n’Africa na-eme ihe.

17 min: “Ịla Ezumike Nká—Ọ̀ Bụ Ọnụ Ụzọ Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ Ka Ukwuu?”a Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ bụ́ onye jiworo oge ịla ezumike nká n’ọrụ ego ya mee ihe n’ịrụkwu ọrụ n’ozi Jehova. Jụọ ya mgbanwe ndị o meworo na ngọzi ndị o nwetaworo n’ihi ya.

Abụ nke 190 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 16

Abụ nke 55

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara ọnwa June.

12 min: Mkpa ọgbakọ.

25 min: “Dị Uchu ‘n’Ịgba Àmà nke Ọma.’”b Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 5 na nke 6, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ịgbara onye akawo nọ n’otu ụlọ ahịa àmà n’oge a na-anọghị n’ozi na inyefe ya traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? Tupu a na-atụle paragraf nke 7 na nke 8, mee ka a gụpụta ha agụpụta.

Abụ nke 131 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 23

Abụ nke 95

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke July 1. N’ihe ngosi ahụ, gosi onye nkwusa nke na-agba àmà n’okporo ámá.

20 min: Gịnị Ka A Pụrụ Ime Banyere Nkụda Mmụọ? Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke dabeere n’Ụlọ Nche nke November 15, 1999, peeji nke 28-29, ruo ma gụnyere isiokwu nta bụ́ “Ịnọgide Na-enwe Àgwà Ziri Ezi.” Tụleghachi aro ndị dị irè a tụrụ tinyere ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa dị irè ma ọ bụ abụọ kọwaa ihe na-enyere ha aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ozi ha.

15 min: “Ime Nkwusa n’Ime Ụwa nke Na-agbanwe Agbanwe Mgbe Nile.”c Mgbe a na-atụle paragraf nke 2-3, jụọ ndị na-ege ntị okwu a kpụ n’ọnụ ndị a pụrụ iji malite mkparịta ụka n’ógbè unu. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, mee otu ihe ngosi dị mkpirikpi, na-eji otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu e kwuru okwu ya eme ihe.

Abụ nke 15 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 30

Abụ nke 3

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ngwụsị ọnwa June. Tụlee akwụkwọ a ga-enyefe na July na August. Kwuo okwu na broshuọ abụọ e nwere n’ọgbakọ. Mee ndokwa ka e mee ihe ngosi ndị a kwadebere nke ọma nke ụzọ isi nyefee ha n’ozi.

15 min: “Ozi Ndị Kraịst—Ọrụ Anyị Bụ́ Isi.”d Gbaa ndị ntorobịa ume ịtụle ngọzi ndị ha pụrụ inweta site n’ịbanye n’ozi oge nile. Gụnye ihe ndị e kwuru banyere isiokwu a n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Mgbe Ihe A Na-emekebe Megidere Akọ na Uche,” n’Ụlọ Nche nke November 1, 2000, peeji nke 19-20.

20 min: Jiri Okwu Chineke Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè Iji Kwusaa Alaeze Ahụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke onye okenye ga-ekwu. Anyị na-agbalị iso onye ọ bụla anyị zutere n’ozi anyị kerịta otu echiche na-ewuli elu nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Alaeze ahụ. Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ime ihe karịrị nanị ịgụ akụkụ Bible. Ọ dị anyị mkpa ịkọwa, inye ihe atụ, na ịkọwa otú a pụrụ isi tinye ha n’ọrụ. Gosi otú a pụrụ isi mee nke a, na-eji ụfọdụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 154-155 eme ihe dị ka ihe atụ, n’okpuru isiokwu nta ahụ e dere n’aka akwụkwọ dị iche bụ́ “Human rulers are not providing what mankind urgently needs,” [Ọchịchị ụmụ mmadụ adịghị enye ihe a kpọrọ mmadụ ihe ndị dị ha oké mkpa]. Mgbe nkwurịta okwu ahụ gasịrị, mee ndokwa ka otu onye nkwusa mee ihe ngosi a kwadebere nke ọma nke otú a pụrụ isi jiri otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe n’ụzọ dị irè mgbe a gara nletaghachi, na-enye nkọwa dị nkenke, ihe atụ dị mfe, na nkọwa dị mkpirikpi nke na-egosi onye nwe ụlọ otú ịchịisi Alaeze ga-esi baara ya onwe ya uru. Ihe ngosi ahụ ga-amalite site n’onye nkwusa ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Mgbe ihe ngosi ahụ gasịrị, tụleghachi otú e si kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, nye ihe atụ ya, ma kọwaa otú a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ. Gbaa mmadụ nile ume ịzụlite ikike nke iji Okwu Chineke na-eme ihe n’ụzọ dị irè.

Abụ nke 171 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 7

Abụ nke 165

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Kọọ ma ọ bụ mee ihe ngosi nke ahụmahụ ndị nkwusa nwetara mgbe (1) a na-agbara ndị si n’agbụrụ dị iche iche ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ àmà ma ọ bụ (2) na-agba àmà n’ọnọdụ ndị ọzọ na-abụghị n’ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ na ịgba àmà n’okporo ámá. Gbaa mmadụ nile ume iji akwụkwọ nta bụ́ Good News for All Nations na fọm bụ́ Please Follow Up (S-43) na-eme ihe nke ọma mgbe ha zutere ndị na-asụ asụsụ ọzọ.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke September 1999, peeji nke 2, Ịma Ọkwa.

25 min: “Ime Ka A Mara Aha Chineke.”e Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, webata ihe ndị e kwuru n’igbe bụ́ “Making Known the Name of God” [Ime Ka A Mara Aha Chineke], nke dị na peeji nke 124 n’akwụkwọ Proclaimers. Mee ndokwa ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi otú e si eme nletaghachi. Site n’iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ ma ọ bụ atọ sitere n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 196-197 eme ihe, gosi ihe mere o ji dị mkpa ịmara na iji aha aka Chineke eme ihe.

Abụ nke 197 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya