Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite November 10
Abụ nke 212
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Mee ihe ngosi kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala ọgbakọ unu nke ụzọ isi jiri aro a tụrụ na peeji nke 4 mee ihe n’inyefe Ụlọ Nche nke November 15. N’ihe ngosi ahụ, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’ihe ngosi ahụ, gbakwụnye nkọwa nke ụzọ e si akwado ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ n’ụzọ ego.—Lee Ụlọ Nche, p. 2, ma ọ bụ Teta! p. 5.
15 min: “Gosipụtanụ na Unu Bụ Ndị Dị Njikere.”a Mee ka ndị na-ege ntị kwuo ihe na-enyere ha aka ịhụ na nchekasị na ihe ndọpụ uche nke usoro ihe dị ugbu a adịghị ewere oge ga-aka aba uru ma e jiri ya chụsoo ihe ime mmụọ.
20 min: Olee Otú I si Ahọrọ Ndị Enyi Gị? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Fee Chineke Ofufe, peeji nke 47-49. N’iji ajụjụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha na paragraf nke 13 eme ihe, mee ka ndị na-ege ntị kwuo ụkpụrụ Bible ndị kwesịrị iduzi anyị n’ịhọrọ ndị enyi anyị.
Abụ nke 127 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 17
Abụ nke 96
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa November. Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị nweworo ahụmahụ ndị na-akpali akpali n’ozi ubi mgbe ha ji akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa a mee ihe. Ụfọdụ pụrụ ịmalitewo ọmụmụ Bible.
15 min: Zụlite Mmụọ Inye Ihe. Okwu nke onye okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke November 1, 2003, peeji nke 27-30.
18 min: “Ịja Mma Na-enye Ume Ọhụrụ.”b Gbakwụnye ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 49-50, paragraf nke 21. Mee ka ndị nwetaworo agbamume site n’ịja mma nke ndị ọzọ kọọ banyere ya n’ụzọ dị nkenke.
Abụ nke 58 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 24
Abụ nke 213
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Mee ihe ngosi abụọ nke ụzọ isi jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 mee ihe n’inyefe Ụlọ Nche nke December 1 na Teta! nke December 8. A pụrụ iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche ma e wezụga nke ahụ a tụrụ aro ya na peeji nke 4 mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye na-anọghị n’ozi na-enyefe magazin n’ụgbọ njem ọha na eze ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị ọzọ kwekọrọ ókèala unu.
10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu.
23 min: “Isoro Jehova Na-akpachi Anya.”c Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha si kwekọọ n’ihe a na-ekwu. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kwuo ihe nyewooro ha aka ime ka ọmụmụ Bible ha ka mma.
Abụ nke 202 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite December 1
Abụ nke 138
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa November. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na December. Tụlee n’ụzọ dị nkenke otu ma ọ bụ ụzọ iche ihe n’ihu abụọ a tụrụ aro ha. Kọwaa ụzọ ndị nkwusa pụrụ isi jiri akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index mee ihe iji chọta ụzọ ndị ọzọ nke iche ihe n’ihu mmadụ.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: Ndị Ruru Eru nke Ọma Ịkụziri Ndị Ọzọ Ihe. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke June 1, 2000, peeji nke 16-17, paragraf nke 9-13. Inwe ike ịkụzi ihe nke ọma bụ ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi n’ozi anyị. Anyị inwe ihe ịga nke ọma n’inyere ndị yiri atụrụ aka na-adabere n’ikike anyị nwere izi ozi Alaeze ahụ n’ụzọ na-eme ka ha mụta ihe nakwa n’ụzọ na-akpali ha ime ihe. Tụlee ajụjụ ndị na-esonụ: (1) Olee ọdịiche dị n’etiti ikwusa ozi ọma na izi ihe? (2) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-eji ala azụ ma a bịa n’ịgbalị iduzi ọmụmụ Bible? (3) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ikike izi ihe anyị ka mma? (4) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na onye anyị na-amụrụ ihe na-aghọta ihe ọ na-amụ? (5) Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịgbalị inyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka iru?
Abụ nke 70 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.