Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite December 8
  • Izu Na-amalite December 15
  • Izu Na-amalite December 22
  • Izu Na-amalite December 29
  • Izu Na-amalite January 5
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 12/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite December 8

Abụ nke 221

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke December 15 na Teta! nke January 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke January 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.

20 min: “Inwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Kọmputa Eme Ihe.”a Ihe ntinye. Gụọ paragraph ndị bụ́ isi, ndị dị ka nke 4-8 nakwa nke 12-13, dị ka oge nyere ohere ya. N’ọnọdụ ya, ị pụrụ ịtụle ihe omume ndị ọzọ na-ewe oge ma ọ bụ ememe ndị pụrụ ịdị ize ndụ bụ́ ndị a na-eme n’ógbè unu.

15 min: “Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2004.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Gbakwụnye ihe e kwuru n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October 2003.

Abụ nke 108 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 15

Abụ nke 71

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke December. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke December 29. Tụlee igbe bụ́ “Biko Gaa Leta Ha Ozugbo.” Gosi fọm S-70 ma ọ bụrụ na unu nwere ya. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche e mere maka ozi ubi na December 25 nakwa na January 1.

15 min: Ọmụmụ Ihe Onwe Onye—Otu Ụzọ nke Ife Ofufe. Okwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke October 1, 2000, peeji nke 14-15, paragraf nke 6-10.

20 min: “Nyere Ndị Nwere ‘Ezi Ọchịchọ Obi’ Aka.”b Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Tụleghachi ndepụta nke aro ndị a tụrụ maka ime nletaghachi n’igbe dị na peeji nke 3 n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1997.

Abụ nke 42 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 22

Abụ nke 10

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 1 na Teta! nke January 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke January 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. Chetara mmadụ nile banyere Nzukọ Ije Ozi pụrụ iche a ga-enwe n’izu na-abịanụ, bụ́ mgbe anyị ga-atụleghachi vidio bụ́ Patient Needs and Rights, anyị ga-atụlekwa ma kesaa kaadị Advance Medical Directive/Release.

10 min: “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit.” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Maa ọkwa mgbe unu ga-enwe mgbakọ sekit na-abịanụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit n’ime ọnwa ole na ole na-abịanụ, kwuo na ndị chọrọ ka e mee ha baptizim kwesịrị ime ka onyeisi oche ndị nlekọta mara. Gbaa mmadụ nile ume ime mgbalị siri ike ịkpọ ndị ha na-amụrụ Bible ka ha bịa mgbakọ ahụ ma nọrọkwa ya mgbe nnọkọ nke ọ bụla na-aga n’ihu.

20 min: “Ịchọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị.”c Kwuo okwu ka o kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ógbè unu. Olee mgbe o yikarịrị ka ndị mmadụ hà na-anọ n’ụlọ? Olee ihe ndị a rụzuworo site n’ije ozi n’uhuruchi? Olee otú a pụrụ isi kpọtụrụ ndị na-adịghị anọkebe n’ụlọ?

Abụ nke 209 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 29

Abụ nke 200

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gbaa ndị nkwusa nile ume ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka December. Kwuo akwụkwọ ndị a ga-enyefe na January.

17 min: “Vidio nke Na-eme Ka Otu Ụzọ Dị Mkpa E Sizi Agwọ Ọrịa Pụta Ìhè.” Ọ bụ okenye ruru eru ga-ekwu ya. Gụọ Ọrụ 15:28, 29, ma mee ka ọ pụta ìhè n’ụzọ dị nkenke na ihe bụ́ isi mere Ndị Kraịst na-eji ajụ ịnara mmịnye ọbara bụ iji rube isi n’iwu Chineke nyere banyere ịdị nsọ nke ọbara. Malitezie ozugbo ịtụle vidio bụ́ Patient Needs and Rights, na-eji ajụjụ ndị e depụtara n’isiokwu a eme ihe. Mechie site n’ịgụ paragraf nke ikpeazụ.

N’ọnọdụ ya, kwuo okwu dabeere ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ bụ́ ndị dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke June 15 nakwa October 15, 2000.

23 min: Iji Obi Ike Eche Nsogbu Ahụ́ Ike Ihu. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu, na-eji ihe ndepụta alaka ụlọ ọrụ nyere eme ihe. Tụlee isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Ndokwa Ndị E Mere Iji Nyere Anyị Aka Izere Ọbara.”

Abụ nke 182 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 5

Abụ nke 103

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Ndọgbu Unu Na-adọgbu Onwe Unu n’Ọrụ Abụghị n’Efu. (1 Kọr. 15:58) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Mee ndokwa tupu oge eruo ka ndị nkwusa bụ́ ndị nọworo na-ejechi ozi anya eri ọtụtụ afọ kọọ ahụmahụ ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere ọrụ ịgba àmà n’oge ndị gara aga. Mmadụ ole nọ n’ọgbakọ? Olee otú ókèala e kenyere ọgbakọ unu hà? Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume n’ebe ozi Alaeze ahụ dị? Olee ụdị mmegide unu nwetara? Olee otú ọrụ Alaeze ahụ siworo mụbaa n’ógbè unu n’ime afọ ndị gafeworonụ?

25 min: “Ezi Ịdị n’Otu Ndị Kraịst—N’ụzọ Dị Aṅaa?”d Mgbe ị na-atụle paragraf nke 5, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere ná mgbakọ mba nile, n’ọrụ ihe owuwu ọchịchị Chineke, ma ọ bụ n’ịrụ ọrụ enyemaka n’ebe e nwere ọdachi, bụ́ ndị na-eme ka ịdị n’otu Ndị Kraịst pụta ìhè.

Abụ nke 7 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya