Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite April 12
  • Izu Na-amalite April 19
  • Izu Na-amalite April 26
  • Izu Na-amalite May 3
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 4/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite April 12

Abụ nke 93

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 15 na Teta! nke May 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke May 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi merie ihe na-egbochi nkwurịta okwu, bụ́ “Eji m ọrụ n’aka.” (Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11-12.) Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa April.

18 min: “Inye Jehova Ihe Kasị Mma Anyị Nwere.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo kpọmkwem ụzọ ndị anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ mgbe anyị na-eje ozi anyị.

15 min: Kọọ ahụmahụ ndị dị ụtọ enwetara n’oge Ememe Ncheta na n’oge ije ozi ka ukwuu e jere n’ọnwa March.

Abụ nke 91 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 19

Abụ nke 55

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

17 min: “Na-eṅomi Ụzọ Iche Echiche Jizọs.”b Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gwa ndị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ka ha kwuo ngọzi ndị ha nwetaworo n’ihi ime otú ahụ.

20 min: Kwadebe Okwu Mmeghe Ndị Dabeere n’Ihe Ndị Na-eme Ugbu A Iji Kpalie Mmasị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Kwuo ọtụtụ ihe ndị na-eme ugbu a bụ́ ndị dọrọworo mmasị ndị mmadụ n’ógbè unu. Olee nchegbu ihe ndị a kpataworo banyere ọdịnihu? N’iji akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 4 mee ihe, tụọ arọ ụfọdụ banyere ụzọ a pụrụ isi kwadebe okwu mmeghe ndị ga-eduga ná nkwurịta okwu Bible. Mee ihe ngosi abụọ a kwadebere nke ọma bụ́ ndị kwekọrọ n’ókèala unu.

Abụ nke 80 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 26

Abụ nke 46

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa April. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na May. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 1 na Teta! nke May 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke May 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe mmadụ na-agbara onye ọrụ ibe ya ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe ya àmà.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

18 min: N’ihi Gịnị Ka Ha Na-ejighị Enwe Okwukwe? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Anyị na-ezutekarị ndị na-enwechaghị okwukwe. (2 Tesa. 3:2) Iji gwa ha eziokwu banyere Jehova, anyị kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ihe kpatara ha ji nwee echiche ha nwere banyere Chineke. Tụlee isi ihe anọ ndị a kpọtụrụ aha n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 129-130, bụ́ ndị pụrụ igbochi ndị mmadụ inwe okwukwe. Gwa ndị na-ege ntị ka ha tụọ aro otú a pụrụ isi malite mkparịta ụka n’ọnọdụ nke ọ bụla. Kọọ otu ahụmahụ banyere ụzọ dị iré e si malite mkparịta ụka, ma ọ bụ kọọ ahụmahụ dị na Teta! (Bekee) nke August 22, 1993, peeji nke 14-15.

Abụ nke 38 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 3

Abụ nke 48

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: “Ndị Na-eto Eto—Na-agụnụ Okwu Chineke!”c Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kwuo banyere usoro ọgụgụ Bible ha nakwa ụzọ ha si na-erite uru na ya. Gbaa ndị ntorobịa ume ime ịgụcha Bible ihe mgbarụ ọsọ ha. Webata ihe e kwuru n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 10, paragraf nke 4.

15 min: Ahụmahụ Ndị E Nwetara n’Ịmalite Mkparịta Ụka. N’usoro ihe omume maka Nzukọ Ije Ozi nke izu na-amalite n’April 19, a tụrụ aro ka anyị kwadebe okwu mmeghe ndị dabeere n’ihe ndị na-eme n’oge a iji kpalie mmasị ndị mmadụ na iji sooro ha malite nkwurịta okwu n’ozi. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ịga nke ọma ndị ha nwetaworo ka ọ dị ugbu a site n’iji aro ndị a mee ihe.

Abụ nke 164 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya