Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite July 12
  • Izu Na-amalite July 19
  • Izu Na-amalite July 26
  • Izu Na-amalite August 2
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 7/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite July 12

Abụ nke 108

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa July. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi nyefee Ụlọ Nche nke July 15 na Teta! nke August 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke August 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe a na-enyefe onye nọ n’okporo ámá nke na-adịghị asụ asụsụ gị nke ọma magazin.

18 min: “Na-eṅomi Ikpe Ziri Ezi nke Jehova.”a Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

15 min: Bible—Akwụkwọ Nwere Amụma Ndị A Pụrụ Ịdabere na Ha. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke dabeere na broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, peeji nke 27-29. N’ozi anyị, anyị na-ezutekarị ndị nwere mmasị n’ọdịnihu. Bible na-enye ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke na-ekwu banyere ọdịnihu dị mma maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Tụlee ụfọdụ amụma Bible ndị na-eme ka e nwekwuo obi ike n’amụma Bible ndị ka ga-emezu n’ọdịnihu. Mee ka onye nkwusa mee ihe ngosi dị mkpirikpi banyere otú a pụrụ isi jiri ihe ndị mere na Bible nyere onye nwere mmasị aka inwe obi ike na Bible.

Abụ nke 16 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 19

Abụ nke 83

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo banyere mkpa ọ dị inwe usoro ihe omume nke ịgụ Bible kwa ụbọchị, ọbụna mgbe oge ezumike mere ka usoro ihe omume anyị gbanwetụ. Gbakwụnye ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche nke August 15, 2000, peeji nke 32.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 1.” Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Nye ndị na-ege ntị ohere ikwu ihe ndị dị n’akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 572-574, bụ́ nke na-ekwu otú ọrụ iduzi ọmụmụ Bible si na-aga n’ihu n’oge a. Kpalie ndị na-ege ntị ịtụsi anya ike maka isiokwu ndị ka na-abịa n’ihu n’usoro isiokwu a. Ụfọdụ n’ime isiokwu ndị a ka ga-atụle bụ otú e si akwadebe ma na-eduzi ọmụmụ ihe, otú e si enyere onye a na-amụrụ ihe aka ịkwadebe, ókè ihe a ga-amụ ga-aharu, otú e si eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ dị irè, otú e si aza ajụjụ onye a na-amụrụ ihe jụrụ, otú e si amalite iji ekpere ebido ọmụmụ ihe, na otú e si eduru onye a na-amụrụ ihe aga ná nzukọ Jehova. Gbaa mmadụ nile ume itinye aro ndị a tụrụ n’ọrụ na idebe isiokwu ndị a maka iji ha mee ihe n’ọdịnihu.

Abụ nke 10 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 26

Abụ nke 216

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa July. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 1 na Teta! nke August 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke August 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi zaghachi ihe na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Gịnị mere unu ji abịa ọtụtụ ugbo?”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 12.

8 min: Igbe Ajụjụ. Ọ bụ okenye ga-eme ya. Gụọ ma kọwaa isiokwu ahụ dum.

25 min: “Otú E Si Eme Nkwusa n’Ógbè Azụmahịa.”b Kwuo ndokwa ndị e mere maka ije ozi n’ógbè azụmahịa. Jiri aro abụọ ahụ dị na paragraf nke 4-5 ma ọ bụkwanụ ụzọ ndị ọzọ nke iche ihe n’ihu mmadụ nke dịworo irè n’ógbè unu, mee ihe ngosi. Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị dị mma ha nwetaworo mgbe ha na-eje ozi n’ógbè azụmahịa.

Abụ nke 173 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 2

Abụ nke 60

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

22 min: Ị̀ Na-ekwu Ihe Ndị Kpatara Ihe? Okwu na mkparịta ụka nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 254, paragraf nke 1-2. Mgbe anyị nọ n’ozi ubi nakwa mgbe anyị na-ekwu okwu n’ikpo okwu, ọ bụrụ na anyị akọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma kwuo ụzọ a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ, ihe anyị na-ezi ga-adịkwu irè ma anyị kwuo ihe kpatara anyị ji kwuo ihe anyị kwuru kama ikwu nanị na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị. N’iji ihe atụ ndị sitere n’akwụkwọ Reasoning ma ọ bụ n’akwụkwọ ndị ọzọ bụ́ ndị kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala unu mee ihe, gosi (1) otú e si ahọrọ ma na-akọwa okwu ndị bụ́ isi dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gụrụ, (2) otú e si eji ihe ndị gbara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ a gụrụ gburugburu ma ọ bụkwanụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ nke na-ekwu banyere otu ihe ahụ, akwado ihe a na-ekwu, (3) otú e si eji ihe atụ egosi ezi uche dị n’ihe i kwurula, na (4) otú e si eji ajụjụ enyere ndị na-ege ntị aka ịtụgharị uche n’okwu ahụ. Mee ka uru ndị dị n’ịdị na-eso onye a na-ekwusara ozi ọma atụgharị uche pụta ìhè.

15 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ụfọdụ na-ewuli elu ha nwetara n’ịga mgbakọ, n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ma ọ bụ n’ikere òkè n’ọrụ ime mmụọ ndị ọzọ n’ime afọ ije ozi a.

Abụ nke 32 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya