Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite August 9
Abụ nke 57
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Ọ bụrụ na aro ndị dị na peeji nke 4 kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala ọgbakọ unu, jiri ha mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 15 na Teta! nke September 8. A pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu ndị ọzọ mee ihe. Kwuo banyere ndokwa maka inye onyinye. Chetara ndị na-ege ntị ka ha jiri broshuọ Na-achọ bịa n’izu na-abịanụ.
15 min: “Ntachi Obi Nwere Ụgwọ Ọrụ.”a Kwuo okwu dị nkenke nke dabeere n’ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke December 15, 2000, peeji nke 22-23, paragraf nke 15-18.
20 min: Iji Traktị Amalite Ọmụmụ Bible. Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, bụ́ nke dabeere n’Ozi Alaeze Anyị nke August 2002, peeji nke 3-4. Mee ka ọ pụta ìhè na anyị dị njikere ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ nke onye ọ bụla anyị na-amụrụ ihe, dị ka e kwuru na paragraf nke 5. Mee otu ma ọ bụ ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi bụ́ ndị ga-adabere n’aro a tụrụ na paragraf nke 8-10. Ọ bụrụ na ụzọ iche ihe n’ihu ọzọ dị irè n’ógbè unu, kwuo banyere ya ma jirizie ya mee ihe ngosi kama iji nke ahụ a tụrụ aro ya. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nweworo n’iji traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? mee ihe.
Abụ nke 74 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 16
Abụ nke 189
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa August.
15 min: Kụnye Eziokwu ahụ n’Ime Ụmụ Gị. Okwu nke dabeere n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, peeji nke 55-59. Tụlee ụzọ anọ ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya, kwuo ụzọ a pụrụ isi tinye ihe e kwuru n’akwụkwọ ahụ n’ọrụ.
20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 2.”b Ọ ga-agụnye ihe ngosi ga-ewe minit ise. Onye nkwusa ajụọ onye okenye otú ọ ga-esi nyere onye ọ na-amụrụ Bible aka inwe ọganihu. Onye okenye ahụ ekwuo na ihe na-akpatakarị nsogbu bụ iji oge dị ukwuu na-akọwa ụmụ obere ihe na ihe ndị na-adịchaghị mkpa, n’oge a na-amụ ihe. N’iji ihe ọmụmụ nke 9 na broshuọ Na-achọ mee ihe, ya egosi onye nkwusa ahụ (1) otú e si elekwasị anya n’isi ihe a na-amụ, (2) otú e si eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha eme ihe n’ụzọ dị irè, na (3) otú e si eme ka ihe ọmụmụ kwekọọ ná mkpa nke onye a na-amụrụ ihe. Ya ekwuo na ọ dị mkpa ime ezi nkwadebe mgbe ọ bụla a chọrọ iduzi ọmụmụ ihe.
Abụ nke 85 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 23
Abụ nke 33
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 1. N’ihe ngosi ahụ, gosi ebe a na-agbara onye nkụzi àmà.
20 min: Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbịaru Jehova Nso. Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Anyị ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso n’ọnwa September. Tụlee ihe e dere maka ndị na-agụ akwụkwọ ahụ bụ́ nke dị na peeji nke 3, ma kọwaa ụfọdụ n’ime ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ. Nke ọ bụla n’ime nkebi anọ ya lekwasịrị anya n’otu n’ime àgwà ndị bụ́ isi nke Jehova. Otu isiakwụkwọ nke na-egosi otú Jizọs si gosipụta àgwà ahụ na otu isiakwụkwọ nke na-atụle otú anyị pụrụ isi gosipụta ya dịkwa na ya. O nwere ihe osise 17 ndị were otu peeji otu peeji bụ́ ndị sitere na Bible. “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche” bụ́ ndị dị na ya, na-enyere anyị aka ịtụgharị uche n’akụkụ ndị ọzọ dị mkpa nke isiokwu nke ọ bụla. Tụleghachi igbe bụ́ “Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Ndị A Tụrụ Aro Ha Maka Bịaruo Jehova Nso,” bụ́ nke dị na peeji nke 2 nke Ozi Alaeze Anyị nke January 2004, meekwa ka onye nkwusa ruru eru jiri otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ahụ mee ihe ngosi.
10 min: Ahụmahụ ndị e nwere n’ókèala unu. Gwa ọgbakọ ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara n’iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị ahụ mee ihe n’ime ọnwa a. Ọ̀ dịwo ọmụmụ Bible a malitere na ya? Ọ bụrụ na ọ dị, kọọ otú o si mee ma ọ bụ mee otu ma ọ bụ ihe ngosi abụọ nke ahụmahụ ndị ahụ.
Abụ nke 124 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 30
Abụ nke 90
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa August.
15 min: Otú E Si Edozi Esemokwu. Okwu nke dabeere n’ihe ọmụma dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 139-145. Nyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ọrụ dịịrị ha n’idozi esemokwu na nghọtahie ha na ndị kwere ekwe ibe ha nwere. Okwu ndị metụtara nkwutọ na wayo bụ ndị o metụtara ga-edozi ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ nke dị na Matiu 18:15-16. Ọ bụ nanị mgbe ha na-edozilighị okwu ahụ ka ndị okenye ga-etinye ọnụ na ya. (Leekwa akwụkwọ Ofufe, peeji nke 147, paragraf nke 9.)
20 min: Ì Ritewo Uru? Mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Tụleghachi aro ndị na-esonụ bụ́ ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị n’ime afọ ije ozi gara aga: Na-edepụta okwu mmeghe gị ná mpempe akwụkwọ. (km-IB 10/03 p. 1) Na-aja ndị mmadụ n’otu n’otu mma, na-akpọ okwu aha mgbe ị na-aja ha mma, ma na-aja mma site n’obi. (km-IB 11/03 p. 1) Na-agba àmà mgbe o yikarịrị ka ndị mmadụ hà ga-anọ n’ụlọ. (km-IB 12/03 p. 1) Na-ewepụta oge a kapịrị ọnụ maka ịgụ Bible, ịkwadebe nzukọ, na ịga ozi ubi. (km-IB 1/04 p. 4) Na-eji broshuọ “Ezi Ala” ahụ eme ihe mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye na ọgụgụ Bible. (km-IB 3/04 p. 2) Setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịgụchapụ Bible. (km-IB 4/04 p. 1) Na-agba àmà n’ógbè azụmahịa. (km-IB 7/04 p. 4) Na-eji traktị amalite ọmụmụ Bible. (km-IB 8/04 p. 2) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ uru ndị ha riteworo n’itinye aro ndị a n’ọrụ.
Abụ nke 145 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 6
Abụ nke 197
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
25 min: “Na-egosipụta Mmụọ Ịsụ Ụzọ.”c Gbaa otu ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ abụọ ajụjụ ọnụ n’ụzọ dị nkenke. Gwa ha ka ha kwuo otú ihe nlereanya nke ndị mụrụ ha, ndị okenye, ma ọ bụ ndị ọzọ si gbaa ha ume ịbanye n’ozi oge nile.
Abụ nke 142 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.